Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

M̀ Dịla Njikere?

M̀ Dịla Njikere?

M̀ Dịla Njikere Iso Ọgbakọ Na-ekwusa Ozi Ọma?

Ị ga-egosi na ị dịla njikere ịbụ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim ma . . .

  • Ọ bụrụ na ị na-amụchi Baịbụl anya, na-ekpe ekpere mgbe niile, na-agachikwa ọmụmụ ihe anya.

  • Ọ bụrụ na i jighị ihe ndị ị na-amụta egwu egwu, na i kwetara na ha bụ eziokwu nakwa na ọ na-agụ gị agụụ ịgwa ha ndị ọzọ.

  • Ọ bụrụ na ị hụrụ Jehova n’anya, ezigbo ndị enyi gị abụrụkwa ndị hụrụ ya n’anya.

  • Ọ bụrụ na e nweghịzi okpukpe ụgha ma ọ bụ òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ị nọ na ya.

  • Ọ bụrụ na ị na-eme ihe Jehova kwuru, chọọkwa ịbụ Onyeàmà Jehova.

I chee na ị dịla njikere iso ọgbakọ na-ekwusa ozi ọma, onye gị na ya na-amụ ihe ga-ahazi ka gị na ndị okenye kwurịta ihe ị ga-eme ka i ruo eruo.

M̀ Dịla Njikere Ime Baptizim?

Ị ga-egosi na ị dịla njikere ime baptizim ma . . .

  • Ọ bụrụ na ị bụrụla onye nkwusa a na-emebeghị baptizim.

  • Ọ bụrụ na ị gbaa mbọ otú ike gị hà na-agachi ozi ọma anya.

  • Ọ bụrụ na ị na-akwado “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” ma na-erubere ha isi.—Matiu 24:45-47.

  • Ọ bụrụ na i kpeela ekpere nyefee Jehova onwe gị, ị chọkwara ife ya ruo mgbe ebighị ebi.

I chee na ị dịla njikere ime baptizim, onye gị na ya na-amụ ihe ga-ahazi ka gị na ndị okenye kwurịta ihe ị ga-eme ka i ruo eruo.