Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Okwu Mmeghe

Okwu Mmeghe

Amaokwu Baịbụl Ndị Na-enyere Anyị Aka Ife Jehova ga-eme ka ọ dịrị gị mfe ịchọta amaokwu Baịbụl na akụkọ ndị ga-enyere gị aka mgbe i nwere nsogbu. Ọ ga-enyekwara gị aka ịchọta amaokwu Baịbụl ndị ị ga-eji gbaa ndị ọzọ ume ma nyere ha aka ime mkpebi ndị ga-eme ka e too Jehova. Ọ bụrụ na ị chọta isiokwu ị na-achọ, ị ga-ahụ ajụjụ ụfọdụ nakwa ihe Baịbụl kwuru banyere ya ga-enyere gị aka. (Gụọ igbe bụ́ “ Otú A Ga-esi Na-achọta Ihe n’Akwụkwọ A.”) Ị ga-ahụzi ọtụtụ amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka, duzie gị ma kasie gị obi. Ị ga-ahụkwa ihe ndị ọzọ bara uru ị ga-eji nyere ndị ọzọ aka ma gbaa ha ume.

Ị gaa n’isiokwu nke ọ bụla, ọ bụghị amaokwu Baịbụl niile kwuru banyere ya ka ị ga-ahụ. Ma, ọ ga-enyere gị aka ịchọta amaokwu ndị ga-akacha abara gị uru tupu gị emee nchọnchọ chọta amaokwu ndị ọzọ. (Ilu 2:1-6) Ị chọọ imekwu nchọnchọ, amaokwu ndị dị n’etiti peeji na Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nakwa ihe ndị a kọwara banyere amaokwu ụfọdụ ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Bekee nke e ji amụ ihe nwere ike inyere gị aka. Akwụkwọ Ndịàmà Jehova Ji Eme Nchọnchọ nwekwara ike inyere gị aka ma ị chọọ ịmatakwu ihe amaokwu ọ bụla dị na Baịbụl na-ekwu. I mewe nchọnchọ, gụọ ihe ndị e bipụtara ọhụrụ n’akwụkwọ anyị ka ị mara otú kacha ọhụrụ anyị si ghọta eziokwu dị na Baịbụl.

Ekpere anyị bụ ka akwụkwọ a bụ́ Amaokwu Baịbụl Ndị Na-enyere Anyị Aka Ife Jehova nyere gị aka ịmata otú Akwụkwọ Nsọ ga-esi mee ka ị mara ihe ma na-aghọta ihe. Ka ị na-amụ akwụkwọ a, obi ga-abịa sikwuo gị ike na “okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike.”​—Hib. 4:12.