Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Inye Onyinye

Inye Onyinye

Olee ihe na-egosi anyị na o nweghị onye na-enye ndị ọzọ onyinye ka Jehova?

Olee ụdị onyinye na-anaghị amasị Chineke?

Mat. 6:1, 2; 2 Kọr. 9:7; 1 Pita 4:9

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jen. 4:3-7; 1 Jọn 3:11, 12​—Ihe mere Chineke ji jụ àjà Ken chụụrụ ya

    • Ọrụ 5:1-11​—Chineke gburu Ananayas na Safaịra maka na ha ghara ụgha gbasara onyinye ha nyere, ha ebughịkwa ezigbo ihe n’obi nye ya

Olee ụdị onyinye na-atọ Chineke ụtọ?

Mat. 6:3, 4; Rom 12:8; 2 Kọr. 9:7; Hib. 13:16

I nwekwara ike ịgụ Ọrụ 20:35

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Luk 21:1-4​—Jizọs jara otu nwaanyị di ya nwụrụ, onye dakwara ogbenye, mma maka onyinye si ya n’obi o nyere n’agbanyeghị na ego o nyere pere ezigbo mpe

Olee otú Ndị Kraịst oge ochie si hazie ka e si na-enye onyinye n’ọgbakọ?

Ọrụ 11:29, 30; Rom 15:25-27; 1 Kọr. 16:1-3; 2 Kọr. 9:5, 7

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ọrụ 4:34, 35​—Ọgbakọ Ndị Kraịst ji obi ha niile nye onyinye. Ndịozi wekwaara ego e nwetara nye ndị a chọrọ iji ya nyere aka

    • 2 Kọr. 8:1, 4, 6, 14​—Ọgbakọ haziri ka a gbatara ndị ihe na-esiri ike ọsọ enyemaka

Olee ihe dị mkpa Ndị Kraịst kwesịrị ịna-emere ma ndị ezinụlọ ha ma ụmụnna ha?

Gịnị ka Baịbụl kwuru ka anyị na-emere ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha?

Gịnị na-egosi na ihe kacha mma anyị kwesịrị imere ndị mmadụ bụ ime ka ha na Chineke dịrị ná mma?

Mat. 5:3, 6; Jọn 6:26, 27; 1 Kọr. 9:23

I nwekwara ike ịgụ Ilu 2:1-5; 3:13; Ekli. 7:12; Mat. 11:4, 5; 24:14

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Luk 10:39-42​—Jizọs nyeere Mata aka ka ọ ghọta na ihe o kwesịrị ibute ụzọ ná ndụ bụ ihe ga-eme ka ya na Chineke dịrịkwuo ná mma