Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndụmọdụ

Ndụmọdụ

Ịnabata ndụmọdụ

Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-anabata ndụmọdụ si na Baịbụl?

Gịnị mere mmadụ ịnabata ndụmọdụ ji dị mma karịa onye ahụ igosiwe na ihe o mere adịghị njọ?

Ilu 12:15; 29:1

I nwekwara ike ịgụ Ilu 1:23-31; 15:31

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 1 Sam. 15:3, 9-23​—Mgbe Samuel onye amụma gwara Sọl na ihe o mere adịghị mma, Sọl kwuziri ihe gosiri na o chere na ihe o mere dị mma, o kweghịkwa anabata ndụmọdụ ahụ. Ọ bụ ihe a mere Jehova ji jụ ya

    • 2 Ihe 25:14-16, 27​—Mgbe onye amụma Jehova gwara Eze Amazaya ka ọ kwụsị ihe na-adịghị mma ọ na-eme, ọ jụrụ ịnabata ndụmọdụ ahụ. Ọ bụ ya mere Jehova ji jụ ya ma ghara ichebe ya

Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-anabata ndụmọdụ si n’aka ndị na-eduzi ọgbakọ?

1 Tesa. 5:12; 1 Tim. 5:17; Hib. 13:7, 17

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 3 Jọn 9, 10​—Mgbe Jọn onyeozi merela agadi, ọ katọrọ otú Dayotrefis si eleda ndị na-eduzi ọgbakọ anya

Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-ege ndị merela agadi ntị?

Lev. 19:32; Ilu 16:31

I nwekwara ike ịgụ Job 12:12; 32:7; Taị. 2:3-5

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 1 Sam. 23:16-18​—Devid nabatara ndụmọdụ Jonatan, bụ́ onye ji ihe dị ka iri afọ atọ tọọ ya, nyere ya. Ihe a mere ka Devid nwee obi ike

    • 1 Eze 12:1-17​—Eze Rehoboam anabataghị ezigbo ndụmọdụ ndị okenye nyere ya. Kama, o gere ntị na ndụmọdụ na-enweghị isi ụmụ okorobịa nyere ya, bụ́kwanụ ihe kpataara ya nsogbu

Gịnị na-egosi na ụmụ nwaanyị ndị ji ofufe Jehova kpọrọ ihe na ụmụnna ndị na-emebeghị agadi nwere ike inye anyị ndụmọdụ ga-abara anyị uru?

Job 32:6, 9, 10; Ilu 31:1, 10, 26; Ekli. 4:13

I nwekwara ike ịgụ Ọma 119:100

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 1 Sam. 25:14-35​—Abigel nyere Eze Devid ndụmọdụ nke mere ka ọ ghara igbu ndị aka ha dị ọcha. Ihe a mekwara ka ikpe ọbara ghara ịma ya

    • 2 Sam. 20:15-22​—Ndụmọdụ otu nwaanyị ma ihe bi n’Ebel nyere mere ka a ghara igbuchapụ ndị obodo ahụ

    • 2 Eze 5:1-14​—Aro otu nwatakịrị nwaanyị tụụrụ otu dike mere ka dike ahụ mara ihe ọ ga-eme ka a gwọọ ya ekpenta na-arịa ya

Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịna-anabata ndụmọdụ ndị na-anaghị efe Jehova ma ọ bụkwanụ ndụmọdụ ndị na-ejighị Okwu ya kpọrọ ihe?

Ọma 1:1; Ilu 4:14

I nwekwara ike ịgụ Luk 6:39

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 1 Ihe 10:13, 14​—Eze Sọl gara jụọ onye na-agba afa ase kama ịjụ Jehova. Ọ nwụkwara n’ihi na o nupụụrụ Jehova isi

    • 2 Ihe 22:2-5, 9​—Eze Ehazaya nwụrụ n’ihi na ọ nọ na-ege ntị na ndụmọdụ ndị ọjọọ na-enye ya

    • Job 21:7, 14-16​—Job jụrụ iche echiche otú ndị na-anaghị efe Jehova si eche

Inye ndụmọdụ

Gịnị mere o ji dị mma ka i gee ntị, ghọta ihe niile merenụ, nụkwa uche ndị niile ihe ahụ gbasara, tupu gị enye ndụmọdụ?

Ilu 18:13, 17

I nwekwara ike ịgụ Ilu 25:8

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 1 Sam. 1:9-16​—Nnukwu onye nchụàjà aha ya bụ Ịlaị chere na mmanya na-egbu Hana, ya ejiri iwe nye ya ndụmọdụ n’ebughị ụzọ chọpụta ihe merenụ

    • Mat. 16:21-23​—Mgbe Pita onyeozi baara Jizọs mba, ọ maghị na ọ nọ na-agwa Jizọs ka o mee ihe Setan chọrọ kama ime uche Jehova

Gịnị mere anyị ji kwesị ịrịọ Jehova ka o duzie anyị tupu anyị enye mmadụ ndụmọdụ?

Ọma 32:8; 73:23, 24; Ilu 3:5, 6

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ọpụ. 3:13-18​—Mosis onye amụma rịọrọ Jehova ka o mee ka ya mata otú kacha mma ọ ga-esi zaa ụmụ Izrel ajụjụ ndị ha ga-ajụ ya

    • 1 Eze 3:5-12​—Mgbe Eze Solomọn malitere ịchị, ọ rịọrọ Jehova ka o nye ya amamihe kama iji amamihe nke ya na-achị. Ihe a ọ rịọrọ Jehova mere ka ọ gọzie ya

Gịnị mere anyị ji kwesị ijide n’aka na ndụmọdụ ọ bụla anyị na-enye mmadụ si n’Okwu Chineke?

Ọma 119:24, 105; Ilu 19:21; 2 Tim. 3:16, 17

I nwekwara ike ịgụ Diut. 17:18-20

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Mat. 4:1-11​—Mgbe Setan nọ na-anwa Jizọs ọnwụnwa, Jizọs agwaghị ya ihe yanwa bụ́ Jizọs chere, kama, ọ gwara ya ihe dị n’Okwu Chineke

    • Jọn 12:49, 50​—Jizọs kwuru na ihe niile ya na-akụziri ndị mmadụ bụ ihe Nna ya kụziiri ya. Anyịnwa kwesịkwara ịna-eme ka Jizọs

Gịnị mere anyị ji kwesị imeda obi mgbe anyị na-enye mmadụ ndụmọdụ ma jaa onye ahụ mma n’ebe ọ na-eme nke ọma?

Gal. 6:1; Kọl. 3:12

I nwekwara ike ịgụ Aịza. 9:6; 42:1-3; Mat. 11:28, 29

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 2 Ihe 19:2, 3​—Jehova dunyere onye amụma, ya agwa Eze Jehoshafat na ihe o mere adịghị mma. O jikwa ohere ahụ jaa ya mma maka ihe ndị dị mma o mere

    • Mkpu. 2:1-4, 8, 9, 12-14, 18-20​—Jizọs bu ụzọ jaa ọtụtụ ọgbakọ mma tupu ya enye ha ndụmọdụ

Ọ bụrụ na nwanna agwa anyị na e nwere nwanna mejọrọ ya, dị ka na o gwuru ya wayo ma ọ bụ kwutọọ ya, gịnị mere o ji dị mma ka anyị gwa ya ka ọ gakwuru nwanna ahụ ka ha abụọ kwuo banyere ihe ahụ na-ewe ya iwe?

Mat. 18:15-17; Luk 17:3

I nwekwara ike ịgụ Lev. 19:17

Olee otú anyị nwere ike isi nyere nwanna kwuru na e mejọrọ ya aka ka o meere onye ahụ mejọrọ ya ebere, nweere ya ndidi ma gbaghara ya?

Mat. 18:21, 22; Mak 11:25; Luk 6:36; Efe. 4:32; Kọl. 3:13

I nwekwara ike ịgụ Mat. 6:14; 1 Kọr. 6:1-8; 1 Pita 3:8, 9

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Mat. 18:23-35​—Jizọs mere ihe atụ magburu onwe ya iji gosi ihe mere anyị ji kwesị ịna-agbaghara ndị mejọrọ anyị

Gịnị mere ọnụ ji kwesị ịka anyị mgbe anyị na-adụ mmadụ ọdụ ka o mee ihe dị mma?

Ọma 141:5; Ilu 17:10; 2 Kọr. 7:8-11

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 1 Sam. 15:23-29​—Samuel onye amụma nyere Eze Sọl ndụmọdụ n’atụghị ya ụjọ

    • 1 Eze 22:19-28​—N’agbanyeghị ihe e tiri Mịkaya onye amụma nakwa ụlọ mkpọrọ a tụbara ya, ọ gbanweghị ihe o kwuru ga-eme Eze Ehab n’ọgbọ agha

Olee otú anyị nwere ike isi dụọ mmadụ ọdụ otú ga-eme ka ọ ghara ịda mbà n’ofufe Jehova?

Hib. 12:11-13

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Luk 22:31-34​—Obi siri Jizọs ike na Pita onyeozi ga-emecha ghọta onwe ya, meekwa ka okwukwe ndị ọzọ sie ike n’agbanyeghị na o nwere ihe ndị o mejọrọ

    • Faị. 21​—Pọl onyeozi nwere obi ike na Faịlimọn ga-eme ihe ọ dụrụ ya n’ọdụ nke dabara n’uche Chineke

Olee otú anyị nwere ike isi jiri obiọma dụọ ndị na-echegbu onwe ha ma ọ bụkwanụ ndị dara mbà ọdụ?

Olee otú anyị nwere ike isi gosi onye mere mmehie na mkpa anyị bụ ka anyị nyere ya aka ka ya na Chineke dịghachi ná mma?

Olee otú anyị nwere ike isi kwanyere ndị anyị na-enye ndụmọdụ ùgwù n’agbanyeghị afọ ole ha dị ma ọ bụkwanụ ma hà bụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị?

Ọ bụrụ na mmadụ ajụ ndụmọdụ e si n’Akwụkwọ Nsọ nye ya ugboro ugboro, gịnị mere ndị okenye ji kwesị ịgbadosi ụkwụ ike n’ala dụọ ya ọdụ?