Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ime Mkpebi

Ime Mkpebi

Olee ihe ga-enyere anyị aka ịna-eme mkpebi ndị dị mma?

Olee ihe mere na o kwesịghị ịdị anyị ọkụ ọkụ n’ahụ́ mgbe anyị chọrọ ikpebi ihe dị mkpa?

Mgbe anyị chọrọ ikpebi ihe, gịnị mere na anyị ekwesịghị ime ihe uche anyị na-ezughị okè gwara anyị?

Ilu 28:26; Jere. 17:9

I nwekwara ike ịgụ Ọnụ Ọgụ. 15:39; Ilu 14:12; Ekli. 11:9, 10

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 2 Ihe 35:20-24​—Ezigbo eze bụ́ Josaya lụsoro Fero Niko agha n’agbanyeghị na e ziri ya ozi si n’aka Jehova ka ọ ghara ime otú ahụ

Gịnị mere anyị ji kwesị ibu ụzọ kpee ekpere tupu anyị ekpebie ihe dị mkpa?

Fil. 4:6, 7; Jems 1:5, 6

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Luk 6:12-16​—Tupu Jizọs ahọrọ mmadụ iri na abụọ ka ha bụrụ ndịozi ya, o ji otu abalị zuru ezu kpee ekpere

    • 2 Eze 19:10-20, 35​—Mgbe ndị Asiria bịara ịlụso Eze Hezekaya agha, ọ kpọkuru Jehova n’ekpere, ya anapụta ya

Ònye ga-akacha enyere anyị aka ikpebi ihe dị mma? Oleekwa otú o si enyere anyị aka ime ya?

Ọma 119:105; Ilu 3:5, 6; 2 Tim. 3:16, 17

I nwekwara ike ịgụ Ọma 19:7; Ilu 6:23; Aịza. 51:4

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ọrụ 15:13-18​—Mgbe òtù na-achị isi nọ na Jeruselem chọrọ ime mkpebi dị ezigbo mkpa, ha mere nchọnchọ n’Akwụkwọ Nsọ

Mgbe anyị chọrọ ime mkpebi banyere:

Ihe ọ bụla anyị na-eme

Ọrụ

Gụọ isiokwu bụ́ “Ọrụ

Ihe e ji atụrụ ndụ

Gụọ isiokwu bụ́ “Ntụrụndụ

Alụmdi na nwunye

Gụọ isiokwu bụ́ “Alụmdi na Nwunye

Ịgwọ ọrịa

Lev. 19:26; Diut. 12:16, 23; Luk 5:31; Ọrụ 15:28, 29

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ọrụ 19:18-20​—Ndị Kraịst nọ n’Efesọs mere ihe gosiri na ha ajụla mgbaasị na anwansi

Ihe ndị anyị ga-eme n’ozi Jehova

Ihe anyị ji oge eme

Efe. 5:16; Kọl. 4:5

I nwekwara ike ịgụ Rom 12:11

Olee otú ndị ụkwụ siri ike n’ọgbakọ nwere ike isi nyere anyị aka ime mkpebi ndị dị mma?

Job 12:12; Ilu 11:14; Hib. 5:14

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 1 Eze 1:11-31, 51-53​—Bat-shiba mere ihe Netan onye amụma gwara ya. Ọ bụ ihe a o mere zọrọ ndụ ya na Solomọn nwa ya

Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịhapụ ndị ọzọ ka ha na-ekpebiri anyị ihe anyị ga-eme?

Gịnị mere anyị ji kwesị ikpebisi ike na anyị ga na-erube isi na ndụmọdụ Chineke na-enye anyị ma ghara ileghara ya anya?

Ọma 18:20-25; 141:5; Ilu 8:33

I nwekwara ike ịgụ Luk 7:30

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jen. 19:12-14, 24, 25​—Lọt gwara ụmụ nwoke ndị chọrọ ịlụ ụmụ ya banyere mbibi Chineke ga-ebibi Sọdọm, ma ha egeghị ya ntị

    • 2 Eze 17:5-17​—A dọọrọ ndị Izrel n’agha n’ihi na ha egeghị ntị na ndụmọdụ Jehova nyere ha ugboro ugboro

Olee ihe mere anyị ji kwesị ige akọnuche anyị ntị mgbe anyị na-ekpebi ihe anyị ga-eme?

Gịnị mere o ji dị mma ka anyị chebara ihe mkpebi anyị mere nwere ike ịkpata echiche?

Otú ihe anyị kpebiri ga-esi gbasa ndị ọzọ

Otú ihe anyị kpebiri ga-esi gbasa otú ihe ga-adịrị anyị n’ọdịnihu

Otú ihe anyị kpebiri ga-esi gbasa adịm ná mma anyị na Jehova

Gịnị mere anyị ga-eji jiri isi anyị buru ihe ọ bụla ihe anyị kpebiri kpatara?