Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Obi Ịjọ Mmadụ Njọ

Obi Ịjọ Mmadụ Njọ

Obi jọwa anyị njọ maka na ndị ọzọ gharịpụrụ anyị, kpasuo anyị iwe, ma ọ bụkwanụ mee ihe anyị na-atụghị anya ya

Ọma 55:12-14; Luk 22:21, 48

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 1 Sam. 8:1-6​—Mgbe ndị Izrel siri ọnwụ ka Samuel họpụtara ha eze, o wutere ya, meekwa ka obi jọọ ya njọ

    • 1 Sam. 20:30-34​—Mgbe nna Jonatan, bụ́ Eze Sọl, ji iwe baara ya mba, obi jọrọ ya njọ, ya ewerekwa ya na nna ya menyere ya ihere

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

  • Ihe e kwuru na Baịbụl nke na-akasi obi:

    • Ọma 55:12-14, 16-18, 22​—Mgbe Ahitofel, bụ́ enyi Eze Devid, gharịpụrụ ya, ihe kasiri Devid obi bụ na ọ kọọrọ Jehova otú obi dị ya

    • 2 Tim. 4:16-18​—Ndị mmadụ gbahapụrụ Pọl onyeozi mgbe a nọ na-akpagbu ya, ma Jehova na olileanya Jehova mere ka o nwee nyeere ya aka ịdị ike

Obi jọwa anyị njọ maka ihe ndị anyị na-anaghị emetacha ma ọ bụ maka mmehie anyị mere

Job 14:4; Rom 3:23; 5:12

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ọma 51:1-5​—Obi jọrọ Eze Devid ezigbo njọ maka na o mehiere Jehova

    • Rom 7:19-24​—Pọl onyeozi kwuru na ya ahụsiela anya n’ihi ọgụ na-anaghị akwụsị akwụsị ọ nọ na-alụ ka ọ ghara ime ihe ọjọọ ndị na-agụ ya agụụ

  • Amaokwu Baịbụl ndị na-akasi obi:

  • Ihe e kwuru na Baịbụl nke na-akasi obi:

    • 1 Eze 9:2-5​—N’agbanyeghị na Eze Devid mere mmehie ndị jọgburu onwe ha, Jehova weere ya ka onye ji obi ya niile jeere ya ozi

    • 1 Tim. 1:12-16​—N’agbanyeghị na Pọl onyeozi mere mmehie ndị jọrọ ezigbo njọ n’oge gara aga, obi siri ya ike na Chineke ga-emere ya ebere