Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịchụ Mmadụ n’Ọgbakọ

Ịchụ Mmadụ n’Ọgbakọ

Gịnị mere ndị okenye ọgbakọ ji kwesị ịmụrụ anya ka ha nwee ike ime ka ọgbakọ dịrị ọcha?

Olee otú àgwà ọjọọ otu nwanna na-akpa nwere ike isi kpaa ndị niile nọ n’ọgbakọ aka ọjọọ?

1 Kọr. 5:1, 2, 5, 6

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Josh. 7:1, 4-14, 20-26​—Ndị Izrel niile tara ahụhụ n’ihi mmehie Ekan na ezinụlọ ya mere

    • Jona 1:1-16​—Ọ fọrọ obere ka ndị niile ha na Jona nọ n’ụgbọ mmiri nwụchaa n’ihi na o nupụụrụ Jehova isi

Olee ụdị àgwà onye nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst na-ekwesịghị ịna-akpa?

Gịnị ka e kwesịrị ime Ndị Kraịst mere baptizim ndị na-ekweghị akwụsị ime mmehie dị oké njọ?

1 Kọr. 5:11-13

I nwekwara ike ịgụ 1 Jọn 3:4, 6

Gịnị ka ndị okenye so na kọmitii ikpe kwesịrị ijide n’aka tupu ha ekpebie ikpe?

Olee otú ndị okenye si ekpebi ma mmadụ ò meela mmehie dị oké njọ, nakwa ma à ga-ehiwe kọmitii ga-eleba okwu ya anya?

Olee ihe mere e ji kwesị ịchụpụ ụfọdụ ndị n’ọgbakọ ma ọ bụkwanụ dọọ ha aka ná ntị? Oleekwa uru ọ ga-abara ọgbakọ?

Olee otú Baịbụl kwuru anyị kwesịrị isi na-emeso ndị a chụpụrụ n’ọgbakọ?

Gịnị ka a ga-eme ma onye a chụpụrụ n’ọgbakọ mechaa chegharịa?

2 Kọr. 2:6, 7

Gụọkwa isiokwu bụ́ “Nchegharị

Olee otú anyị niile nwere ike isi nye aka mee ka ọgbakọ na-adị ọcha?

Lev. 5:1; Hib. 12:15, 16

I nwekwara ike ịgụ Diut. 13:6-11

Gịnị mere na Onye Kraịst mere mmehie dị oké njọ ekwesịghị ikpuchi ya ọ bụrụgodị na ọ na-atụ ụjọ na a ga-achụpụ ya n’ọgbakọ?

Gịnị mere na anyị na ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ ekwesịghị ịna-akpachi anya, n’agbanyeghị na a chụpụghị ha n’ọgbakọ?

Ọ bụrụ na nwanna egwuo nwanna ibe ya wayo ma ọ bụ kwutọọ aha ya, gịnị ka onye ahụ e mejọrọ nwere ike ime? Gịnị mere ọ ga-eji mee otú ahụ?

Gịnị mere Ndị Kraịst ụkwụ siri ike n’ọgbakọ ji kwesị ịna-enye ndị na-anaghị akpa àgwà dị mma ndụmọdụ?