Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịgba Ndị Ọzọ Ume

Ịgba Ndị Ọzọ Ume

Olee ihe mere ndị ohu Chineke ji kwesị ịna-agba ibe ha ume?

Aịza. 35:3, 4; Kọl. 3:16; 1 Tesa. 5:11; Hib. 3:13

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 2 Ihe 32:2-8​—Mgbe ndị iro gara ka ha lụso ndị Juda agha, Eze Hezekaya gbara ndị Juda ume

    • Dan. 10:2, 8-11, 18, 19​—Mgbe Daniel onye amụma merela agadi, ike agwụkwa ya, otu mmụọ ozi gbara ya ume, ya enwetaghachi ume

Gịnị mere Jehova ji chọọ ka ndị okenye na-agba ụmụnna ha ume?

Aịza. 32:1, 2; 1 Pita 5:1-3

I nwekwara ike ịgụ Mat. 11:28-30

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Diut. 3:28; 31:7, 8​—Mosis onye amụma mere ihe Jehova gwara ya. Ọ gbara Joshụa bụ́ onye ga-anọchi ya ume, meekwa ka ọ dị ike

    • Ọrụ 11:22-26; 14:22​—N’oge a na-akpagbu Ndị Kraịst nọ n’Antiọk, Pọl na Banabas gara gbaa ha ume

Olee ihe anyị ji kwesị ịja onye anyị chọrọ ịgba ume mma?

Ilu 31:28, 29; 1 Kọr. 11:2

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ikpe 11:37-40​—N’afọ ọ bụla, ụmụ nwaanyị ndị Izrel na-aga aja nwa Jefta mma n’ihi na o wepụtara onwe ya na-ejere Jehova ozi

    • Mkpu. 2:1-4​—N’agbanyeghị na Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya nọ n’Efesọs ihe ha ga-emezi ná ndụ ha, ọ gwakwara ha ebe ha na-eme nke ọma

Olee otú anyị nwere ike isi na-agba ụmụnna anyị ume?

Ilu 15:23; Efe. 4:29; Fil. 1:13, 14; Kọl. 4:6; 1 Tesa. 5:14

I nwekwara ike ịgụ 2 Kọr. 7:13, 15, 16

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 1 Sam. 23:16-18​—N’agbanyeghị na Jonatan tọrọ Devid enyi ya, ọ chọọrọ ya gaa ka ọ gbaa ya ume n’oge ọ nọ ná nsogbu

    • Jọn 16:33​—Jizọs gbara ndị na-eso ụzọ ya ume mgbe ọ gwara ha na ya emeriela ụwa nakwa na ha ga-emerili ụwa ma ha na-eme ka ya

    • Ọrụ 28:14-16​—Mgbe a kpụ Pọl onyeozi na-aga Rom ka e kpee ya ikpe, obi bịara sie ya ike mgbe ọ hụrụ ụmụnna bịara ịgba ya ume

Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-akwanyere ndị ọzọ ùgwù ma ghara ịna-eme mkpesa?

Fil. 2:14-16; Jud 16-19

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ọnụ Ọgụ. 11:10-15​—Obi adịghị Mosis onye amụma mma maka na ndị Izrel na-eme mkpesa, bụrụkwa ndị nnupụisi

    • Ọnụ Ọgụ. 13:31, 32; 14:2-6​—Akụkọ ọjọọ mmadụ iri n’ime ndị ahụ gara hụ ala nkwa ahụ nọ na-akọ kụdara ndị Izrel ndị ọzọ mmụọ, ha amalitezie inupụrụ Jehova isi

Olee otú e si agba anyị ume ma anyị na ụmụnna anyị nọkọọ?

Ilu 27:17; Rom 1:11, 12; Hib. 10:24, 25; 12:12

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 2 Ihe 20:1-19​—Mgbe ọtụtụ ndị agha bịara ịlụso Juda agha, Eze Jehoshafat kpọkọrọ ndị Juda, ha ekpe ekpere

    • Ọrụ 12:1-5, 12-17​—Mgbe e gbuchara Jems onyeozi, a tụọkwa Pita onyeozi mkpọrọ, ndị nọ n’ọgbakọ dị na Jeruselem zukọrọ na-ekpe ekpere

Olee otú inwe nchekwube ga-esi mee ka anyị na-edi nsogbu ọ bụla bịaara anyị?

Ọrụ 5:40, 41; Rom 8:35-39; 1 Kọr. 4:11-13; 2 Kọr. 4:16-18; 1 Pita 1:6, 7

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jen. 39:19-23; 40:1-8​—N’agbanyeghị na e boro Josef ihe ọ na-emeghị, tụọkwa ya mkpọrọ maka ya, ọ nọgidere na-atụkwasị Chineke obi ma na-enyere ndị ọzọ aka

    • 2 Eze 6:15-17​—Ụjọ atụghị Ịlaịsha onye amụma mgbe ìgwè ndị agha bịara ịlụso ya agha. O kpekwara ekpere ka onye na-ejere ya ozi gharakwa ịtụ ụjọ

Baịbụl nwere ike ịgba anyị ume

Olee ihe Jehova mesiri anyị obi ike na ọ ga-emere anyị iji gosi na ọ hụrụ anyị n’anya?

Olee otú ichebara ndidi Jehova na-enwere anyị na ebere ọ na-emere anyị echiche si agba anyị ume?

Gịnị ka Jehova nwere ike imere ndị dara mbà?

Ọma 46:1; Aịza. 12:2; 40:29-31; Fil. 4:13

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 1 Sam. 1:10, 11, 17, 18​—Mgbe obi jọrọ Hana ezigbo njọ, o kpere ekpere. Jehova nụrụ ekpere ahụ ma mee ka obi ruo ya ala

    • 1 Eze 19:1-19​—Mgbe Ịlaịja onye amụma dara mbà, Jehova nyere ya mmiri na nri. O ji nkwa o kwere ya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu gbaa ya ume ma kasie ya obi

Olee otú nkwa dị iche iche Jehova kwere anyị na Baịbụl si eme ka obi sie anyị ike?

2 Ihe 15:7; Ọma 27:13, 14; Hib. 6:17-19; 12:2

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Job 14:1, 2, 7-9, 13-15​—N’oge Job dara mbà, olileanya o nwere na Chineke ga-akpọlite ya n’ọnwụ ma ọ bụrụgodị na ya emechaa nwụọ, kasiri ya obi

    • Dan. 12:13​—Mgbe Daniel onye amụma dị ihe dị ka otu narị (100) afọ, otu mmụọ ozi gbara ya ume mgbe ọ gwara ya ihe a ga-emere ya n’ọdịnihu

Olee otú ịkpọku Jehova n’ekpere na ịtụgharị uche n’ihe anyị ma banyere ya nwere ike isi gbaa anyị ume?

Ọma 18:6; 56:4, 11; Hib. 13:6

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 1 Sam. 30:1-9​—Mgbe Devid nọ ná nsogbu, ọ kpọkuru Jehova n’ekpere ma nwetaghachi ume

    • Luk 22:39-43​—Mgbe ọnwụnwa tara ezigbo akpụ bịaara Jizọs, o kpesiri ekpere ike. Jehova zara ekpere ahụ. Otú o si zaa ya bụ na o zitere otu mmụọ ozi, ya agbaa ya ume

Olee otú akụkọ dị mma si agba anyị ume? Oleekwa ihe ịkọrọ ya ndị ọzọ ji dị mma?

Ilu 15:30; 25:25; Aịza. 52:7

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ọrụ 15:2-4​—Mgbe Pọl onyeozi na Banabas onyeozi na-aga eleta ọgbakọ dị iche iche, ha na-agba ha nnọọ ume

    • 3 Jọn 1-4​—Mgbe Jọn onyeozi merela agadi, ọ nụrụ na ndị o ziri ozi ọma na-eme nke ọma. Ihe a ọ nụrụ gbara ya ume