Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịtachi Obi

Ịtachi Obi

Ndị ohu Jehova hà kwesịrị ịna-atachi obi?

Olee otú anyị si mara na ụfọdụ ndị agaghị enwe mmasị n’ozi ọma anyị ma ọ bụkwanụ na ha ga-akpagbu anyị maka ozi ọma anyị na-ezi?

Mat. 10:22; Jọn 15:18, 19; 2 Kọr. 6:4, 5

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 2 Pita 2:5; Jen. 7:23; Mat. 24:37-39​—N’agbanyeghị na Noa “nọ na-ekwusa ihe bụ́ ezi omume,” ndị mmadụ egeghị ya ntị. Ọ bụ naanị ya na ezinụlọ ya ka Iju Mmiri na-egbughị

    • 2 Tim. 3:10-14​—Pọl onyeozi gwara Timoti na ya diri ahụhụ na ihe mgbu dị iche iche, gbaakwa ya ume ka o mee ka ya

Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-atụ anya na ndị ezinụlọ anyị nwere ike ịkpagbu anyị?

Mat. 10:22, 36-38; Luk 21:16-19

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jen. 4:3-11; 1 Jọn 3:11, 12​—Ken bụ onye ọjọọ. Ọ bụ ya mere o ji gbuo Ebel nwanne ya, bụ́ onye ezi omume

    • Jen. 37:5-8, 18-28​—Otu n’ime ihe mere ụmụnne Josef ji tụba ya n’olulu ma mechaa ree ya ka ọ bụrụ ohu bụ maka na ọ gwara ha na Jehova mere ka ọ rọọ nrọ pụrụ iche

Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịtụ egwu ọnwụ mgbe a na-akpagbu anyị?

Mat. 10:28; 2 Tim. 4:6, 7

I nwekwara ike ịgụ Mkpu. 2:10

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Dan. 3:1-6, 13-18​—Shedrak, Mishak, na Abednego jụwapụrụ isi na ha agaghị efe arụsị n’agbanyeghị na eze kwuru na ya ga-egbu ha ma ọ bụrụ na ha efeghị arụsị ya

    • Ọrụ 5:27-29, 33, 40-42​—Ndịozi Jizọs akwụsịghị ịna-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị na a gwara ha na a ga-egbu ha ma ọ bụrụ na ha akwụsịghị

Gịnị ga-enyere anyị aka ịnọgide na-erubere Jehova isi ọ bụrụgodị na a dọrọ anyị aka ná ntị?

Ilu 3:11, 12; Hib. 12:5-7

Gịnị mere o nwere ike iji siere anyị ike ịnọgide na-efe Jehova ma ndị ọzọ kwụsị ife ya?

Jere. 1:16-19; Hab. 1:2-4

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ọma 73:2-24​—Mgbe otu ọbụ abụ hụrụ otú ihe si na-agaziri ndị ajọ omume, ya echewe na ife Jehova abaghị uru

    • Jọn 6:60-62, 66-68​—N’agbanyeghị na ọtụtụ n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs kwụsịrị iso ya, Pita onyeozi ji okwukwe nọgide na-eso ụzọ ya

Gịnị ga-enyere anyị aka ịna-atachi obi?

Ịnọ Jehova nso

Ịmụ Okwu Chineke na ịtụgharị uche na ya

Isi n’ala ala obi anyị na-akpọku Jehova n’ekpere mgbe niile

Rom 12:12; Kọl. 4:2; 1 Pita 4:7

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Dan. 6:4-11​—Daniel onye amụma akwụsịghị ịna-ekpe ekpere mgbe niile n’agbanyeghị nkata a kpara igbu ya maka ekpere ọ na-ekpe

    • Mat. 26:36-46; Hib. 5:7​—N’abalị bọtara ụbọchị e gburu Jizọs, o kpere ekpere n’esepụghị aka ma gwa ndị ọzọ ka ha na-ekpekwa ekpere mgbe niile

Ịgachi ọmụmụ ihe anya ma soro ụmụnna anyị na-efe Jehova

Uche anyị ịdị n’ihe dị iche iche Jehova kwere nkwa na ọ ga-emere anyị n’ọdịnihu

Ịhụkwu Jehova, ụmụnna anyị, na ezi omume n’anya

Ime ka okwukwe anyị sikwuo ike

Ile ịta ahụhụ anya otú kwesịrị ekwesị

Olee uru anyị ga-erite ma anyị nọgide na-atachi obi?

Ọ na-eme ka a sọpụrụ Jehova Chineke

Ilu 27:11; Jọn 15:7, 8; 1 Pita 1:6, 7

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Job 1:6-12; 2:3-5​—Setan kwuru na ihe mere Job ji efe Jehova bụ maka na Jehova gọziri Job. Naanị ihe ga-egosi na ihe Setan kwuru abụghị eziokwu bụ ma Job tachie obi n’ọnwụnwa bịaara ya

    • Rom 5:19; 1 Pita 1:20, 21​—Jizọs rubeere Chineke isi ruo mgbe ọ nwụrụ. O nupụrụghị Jehova isi otú Adam nupụrụ. Jizọs si otú a gosi na onye zuru okè nwere ike irubere Chineke isi n’agbanyeghị ọnwụnwa na-enweghị atụ

Anyị na-agba ndị ọzọ ume ka ha na-atachi obi

Ịtachi obi na-enye aka eme ka ozi anyị na-aga nke ọma

Obi ga-adị Jehova mma. Ọ ga-agọzikwa anyị