Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ezinụlọ

Ezinụlọ

Jehova mere ka e nwee ezinụlọ

Ndị nne na nna

Gụọ isiokwu bụ́ “Ndị Nne na Nna

Ndị nna

Gụọ isiokwu bụ́ “Ndị Nna

Ndị nne

Gụọ isiokwu bụ́ “Ndị Nne

Ndị di, Ndị nwunye

Gụọ isiokwu bụ́ “Alụmdi na Nwunye

Ụmụ ndị nwoke na Ụmụ ndị nwaanyị

Gịnị bụ ọrụ ndị bụ́ ụmụ n’ezinụlọ?

Gịnị mere ndị bụ́ ụmụ ji kwesị ịna-erubere ndị mụrụ ha isi?

Efe. 6:1-3; Kọl. 3:20

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ọma 78:1-8​—Ndị Izrel gwara ụmụ ha ihe ndị nna nna ha mere ka ụmụ ha wee tụkwasị Chineke obi ma ghara inupụrụ ya isi

    • Luk 2:51, 52​—Ọ bụ eziokwu na Jizọs zuru okè, ma ọ nọ na-erubere nne na nna ya isi n’oge ọ na-etolite n’agbanyeghị na ha ezughị okè

Gịnị mere o nwere ike iji siere ndị bụ́ ụmụ ike ịsọpụrụ ndị mụrụ ha?

Olee otú Chineke si ele ụmụ na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi anya?

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Diut. 21:18-21​—Iwu Mosis kwuru ka e gbuo nwa ọ bụla bụ́ onye isi ike nke na-enupụrụ ndị mụrụ ya isi, na-aṅụkwa oké mmanya ma jụ na ya agaghị agbanwe

    • 2 Eze 2:23, 24​—Mgbe ụfọdụ ụmụntakịrị nwoke kwara Ịlaịsha onye amụma emo ma ledaa nnọọ onye ahụ na-anọchite anya Chineke anya, anụ ọhịa bea abụọ pụtara dọrie ọtụtụ n’ime ha

Olee otú ndị nne na nna kwesịrị isi na-ele ịzụ ụmụ ha anya?

Ọma 127:3; 128:3

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Lev. 26:9​—Ndị Izrel na-ele ịmụ ụmụ anya ka ngọzi si n’aka Jehova

    • Job 42:12, 13​—Jehova ji ụmụ iri ọzọ gọzie Job na nwunye ya maka otú na-enweghị atụ Job si merie ọnwụnwa ndị bịaara ya

Olee otú Jehova chọrọ ka ụmụnne si na-emeso ibe ha?

Ọma 34:14; Ilu 15:23; 19:11

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jen. 27:41; 33:1-11​—Mgbe Jekọb kwanyeere Ịsọ nwanne ya ùgwù, gbaakwa ezigbo mbọ ha emee udo, obi jụụrụ Ịsọ, ya amakụọ ya

Gịnị ka ụmụ ndị toro eto kwesịrị ịna-emere nne na nna ha nakwa nne nne ha na nna nna ha?

Ilu 23:22; 1 Tim. 5:4

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ge 11:31, 32​—Mgbe Ebreham si Ọọ na-akwapụ, ọ kpọọrọ nna ya bụ́ Tira. Ọ nọkwa na-elekọta ya ruo mgbe ọ nwụrụ

    • Mat. 15:3-6​—Jizọs ji ihe dị n’Iwu Mosis gosi na ndị bụ́ ụmụ toro eto kwesịrị ịna-egboro ndị nne na nna ha mkpa ha

Ndị ọgọ

Gụọ isiokwu bụ́ “Ndị Ọgọ

Ndị nne nne na ndị nna nna

Gụọ isiokwu bụ́ “Ndị Nne Nne na Ndị Nna Nna