Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịgbaghara Mmehie

Ịgbaghara Mmehie

Jehova ọ̀ dị njikere ịgbaghara anyị mmehie?

Ọma 86:5; Dan. 9:9; Maị. 7:18

I nwekwara ike ịgụ 2 Pita 3:9

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ọma 78:40, 41; 106:36-46​—Ọ bụ eziokwu na mmehie ndị Izrel kpasuru Jehova iwe ọtụtụ ugboro, ma ọ gbaghaara ha ugboro ugboro

    • Luk 15:11-32​—Jizọs ji akụkọ ọ kọrọ banyere otú otu nwoke si meere nwa ya biri ndụ ọjọọ ma mechaa chegharịa ebere gosi otú Jehova si agbaghara anyị mmehie

Gịnị ka Jehova mere ka o wee na-agbaghara anyị mmehie?

Jọn 1:29; Efe. 1:7; 1 Jọn 2:1, 2

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Hib. 9:22-28​—Pọl onyeozi kwuru na Jehova nwere ike ịgbaghara mmehie anyị n’ihi àjà Kraịst ji ndụ ya chụọ maka mmehie anyị

    • Mkpu. 7:9, 10, 14, 15​—Jọn onyeozi hụrụ “oké ìgwè mmadụ” n’ọhụụ. Ọ hụrụ na ha na Chineke dị ná mma maka na ha nwere okwukwe n’àjà Kraịst ji ọbara ya chụọ

Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Jehova gbaghara anyị mmehie anyị, gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ndị ọzọ mejọọ anyị?

Mat. 6:14, 15; Mak 11:25; Luk 17:3, 4; Jems 2:13

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Job 42:7-10​—Tupu Jehova emee ka Job gbakee n’ọrịa na-arịa ya ma gọzie ya, ọ gwara ya na ọ ga-ebu ụzọ kpeere ndị enyi ya atọ ahụ nọ na-agwa ya okwu ọjọọ ekpere

    • Mat. 18:21-35​—Jizọs kọrọ akụkọ o ji gosi na ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Jehova gbaghara anyị mmehie anyị, anyị ga-ebu ụzọ gbaghara ndị mejọrọ anyị

Olee ihe anyị ji kwesị ikwupụta mmehie anyị mere ma chegharịa?

Ọrụ 3:19; 26:20; 1 Jọn 1:8-10

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ọma 32:1-5; 51:1, 2, 16, 17​—Mmehie ndị dị oké njọ Eze Devid mere gbawara ya obi, ya ejiri obi ya niile chegharịa

    • Jems 5:14-16​—Jems kwuru na anyị kwesịrị ịgakwuru ndị okenye ma anyị mee mmehie dị oké njọ

Olee ihe ndị anyị kwesịrị ịgbanwe ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Jehova gbaghara anyị mmehie anyị mere?

Ilu 28:13; Aịza. 55:7; Efe. 4:28

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 1 Eze 21:27-29; 2 Ihe 18:18-22, 33, 34; 19:1, 2​—Mgbe Jehova mara Eze Ehab ikpe, o mere ka onye ihe o mere na-ewute. Ma, Jehova agbagharaghị ya, n’ihi na o sighị n’ala ala obi ya chegharịa nke meziri ka e gbuo ya

    • 2 Ihe 33:1-16​—Eze Manase kpara arụ otú na-enweghị atụ. Ma, Jehova gbaghaara ya mgbe o chegharịrị. Manase gosiri na ya agbanweela n’eziokwu mgbe ọ malitere ịgba mbọ ka ndị Juda fesiwe Jehova ike kama ikpere arụsị

Olee otú Jehova si agbaghara ndị mmehie chegharịrịnụ?

Ọma 103:10-14; Aịza. 1:18; 38:17; Jere. 31:34; Maị. 7:19

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 2 Sam. 12:13; 24:1; 1 Eze 9:4, 5​—Devid mere mmehie ndị dị oké njọ. Ma, Jehova gbaghaara ya maka na o chegharịrị. O mechakwara kwuo na Devid ji obi ya niile jeere ya ozi

Olee otú Jizọs si gosi na ya dị njikere ịgbaghara ndị ọzọ otú Jehova na-eme?

Ọma 86:5; Luk 23:33, 34

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Mat. 26:36, 40, 41​—Ụra buuru ndị ha na Jizọs kacha bụrụ enyi n’ime ndị na-eso ụzọ ya mgbe ha kwesịrị iso ya na-ekpe ekpere. Ma, Jizọs ghọtara na ha chọrọ iso ya na-ekpe ekpere, ma ike ọgwụgwụ ekweghị ha

    • Mat. 26:69-75; Luk 24:33, 34; Ọrụ 2:37-41​—Pita gọnahụrụ Jizọs ugboro atọ. Ma, o chegharịrị, Jizọs agbaghara ya. Mgbe Jizọs si n’ọnwụ bilie, ọ gakwuuru Pita ma mechaa nye ya ọrụ pụrụ iche n’ọgbakọ ya

Olee otú anyị si mara na ọ bụghị mmadụ niile ka Jehova na-agbaghara mmehie?

Mat. 12:31; Hib. 10:26, 27; 1 Jọn 5:16, 17

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Mat. 23:29-33​—Jizọs gwara ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii na a ga-ekpe ha ikpe ma tụba ha na Gehena, ya bụ, na ha ga-anwụ ọnwụ ebighị ebi

    • Jọn 17:12; Mak 14:21​—Jizọs kpọrọ Judas Iskarịọt “nwa mbibi” ma kwuo na ọ gaara akara onye a ga-arara ya nye mma ma a sị na a mụghị ya amụ

Olee ihe ga-enyere Ndị Kraịst aka ịna-agbaghara ndị ọzọ?