Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nnwere Onwe

Nnwere Onwe

Ma n’eluigwe ma n’ụwa, naanị ònye nweere onwe ya ime ihe ọ bụla ọ chọrọ ime?

Aịza. 40:13, 15; Rom 9:20, 21

I nwekwara ike ịgụ Rom 11:33-36

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Dan. 4:29-35​—Eze Nebukadneza dị ike mechara chọpụta na e nweghị eze dị ike ka Jehova nakwa na e nweghị onye na-agwa ya ihe ọ ga-eme

    • Aịza. 45:6-12​—Jehova kwuru ihe mere na onye o kere eke ekwesịghị ịjụ ya ihe mere o ji mee ihe ọ bụla o mere

N’agbanyeghị na Jehova nweere onwe ya ime ihe ọ bụla ọ chọrọ ime, olee ihe ndị ọ na-anaghị achọ ime?

Gịnị mere na ọ bụghị ihe niile ka anyị nweere onwe anyị ime?

Gịnị mere o ji dị mma ka Ndị Kraịst ghara ime ihe ụfọdụ n’ihi ndị ọzọ?

Olee ihe mere anyị ga-eji kwuo na ndị na-efe Jehova nweere onwe ha?

Olee ihe mere ndị na-efe Chineke ji enwe obi ụtọ?

Ọma 40:8

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jen. 18:3; Hib. 11:8-10​—Ebreham echefughị olileanya Chineke mere ka o nwee. Ọ bụkwa ihe a mere ka ọ nọgide na-efe ya

    • Hib. 11:24-26​—Mosis onye amụma kpebiri ife Jehova. Ihe a mere ka o nwere onwe ya, na-enwe obi ụtọ ma nwee olileanya na ihe ga-aka mma n’ọdịnihu

Gịnị ka Jehova napụtara anyị n’aka ya?

Olee ihe Ndị Kraịst na-ekwesịghị ime n’agbanyeghị na ha nweere onwe ha?

Olee mgbe ịhụnanya nwere ike ime ka Ndị Kraịst ghara ime ihe ha nweere onwe ha ime?

Olee otú ozi anyị si eme ka ndị mmadụ nwere onwe ha?

Olee ụdị nnwere onwe Baịbụl kwuru na a ga-enwe n’ọdịnihu?

Olee otú o si bụrụ na ndị na-eme ihe ọ bụla masịrị ha bụ ndị ohu?

Gịnị na-egosi na mmadụ niile hà otu n’anya Chineke?