Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Iru Uju

Iru Uju

Olee akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl ndị na-egosi na iru uju ma mmadụ nwụọ adịghị njọ?

Olee ihe na-egosi na ịkasi ndị na-eru uju obi na-agụsi Jehova agụụ ike?

Olee otú ịmata ihe na-eme mmadụ ma ọ nwụọ nwere ike isi kasie anyị obi?

Ekli. 9:5, 10; 1 Tesa. 4:13

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Luk 20:37, 38​—Obi siri Jizọs ike na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ nke na o kwuru na ha dị ndụ n’anya Chineke

    • Jọn 11:5, 6, 11-14​—Jizọs ji ọnwụ tụnyere ụra mgbe ezigbo enyi ya bụ́ Lazarọs nwụrụ

    • Hib. 2:14, 15​—Pọl onyeozi kwuru na anyị ekwesịghị ikwe ka egwu ọnwụ were anyị mere ohu

Olee otú aha mmadụ nwere ike isi dị mma n’oge ọnwụ ya karịa n’oge a mụrụ ya?

Olee otú Baịbụl si kọwaa ọnwụ? Oleekwa ihe Chineke ga-eme ya?

Gịnị mere obi ji sie anyị ike na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ?

Aịza. 26:19; Jọn 5:28, 29; Ọrụ 24:15

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Na Baịbụl, a kọrọ akụkọ mmadụ itoolu a kpọlitere n’ọnwụ. Asatọ n’ime ha biri n’ụwa mgbe a kpọlitechara ha. Nke ọ bụla n’ime akụkọ ndị a a kọrọ banyere ndị a kpọlitere n’ọnwụ ga-akasị ndị mmadụ nwụnahụrụ obi ma mee ka ha nwee olileanya na ndị ha nwụrụ anwụ ga-ebilite n’ọnwụ n’ọdịnihu

      • 1 Eze 17:17-24​—Ịlaịja onye amụma kpọlitere nwa nwaanyị isi mkpe onye Zarefat n’ọnwụ. Zarefat a dị na Saịdọn

      • 2 Eze 4:32-37​—Ịlaịsha onye amụma kpọlitere otu nwatakịrị nwoke onye Shunem ma kpọnye ya ndị mụrụ ya

      • 2 Eze 13:20, 21​—Mgbe ozu otu nwoke na-adịbeghị anya ọ nwụrụ metụrụ ọkpụkpụ Ịlaịsha, nwoke ahụ si n’ọnwụ bilie

      • Luk 7:11-15​—N’otu obodo a na-akpọ Nen, Jizọs hụrụ otu nwaanyị isi mkpe na ndị so ya na-aga ili nwa ya nwoke nwụrụ anwụ, ya akpọlite nwa ahụ n’ọnwụ

      • Luk 8:41, 42, 49-56​—Jizọs kpọlitere nwa Jaịrọs n’ọnwụ. Jaịrọs bụ onyeisi oche ụlọ nzukọ

      • Jọn 11:38-44​—Jizọs kpọlitere enyi ya bụ́ Lazarọs n’ọnwụ, ya na ụmụnne ya bụ́ Mata na Meri ebirikwa

      • Ọrụ 9:36-42​—Pita onyeozi kpọlitere Dọkas n’ọnwụ. Nwaanyị a bụ Onye Kraịst e ji obiọma na mmesapụ aka mara

      • Ọrụ 20:7-12​—Pọl onyeozi kpọlitere Yutikọs, bụ́ otu nwa okorobịa nwụrụ mgbe o si na windo dapụ

    • Jehova kpọlitere Jizọs Kraịst ka ọ malite ịdị ndụ ebighị ebi n’eluigwe, bụ́ ihe na-eme ka obi sie anyị ike na Jehova ga-emezu ihe niile o kwere nkwa imere anyị n’ọdịnihu

    • Jizọs bụ onye mbụ a kpọlitere n’ọnwụ ya agaa ka o biri n’eluigwe ruo mgbe ebighị ebi. Ma, ọ gaghị abụ onye ikpeazụ. A ga-akpọlitekwa ndị e tere mmanụ na-eso ụzọ ya, ndị dị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ (144,000), ka ha gaa biri n’eluigwe ruo mgbe ebighị ebi

Olee otú anyị nwere ike isi nyere ndị na-eru uju maka na mmadụ nwụnahụrụ ha aka?