Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Obi

Obi

Olee otú anyị si mara na Baịbụl kwuwe banyere “obi” na ọ na-ekwu banyere ihe mmadụ bụ, dị ka, ihe onye ahụ na-eche, ihe ọ chọrọ ime, àgwà ya, nakwa otú obi na-adị ya?

Ọma 49:3; Ilu 16:9; Luk 5:22; Ọrụ 2:26

I nwekwara ike ịgụ Diut. 15:7; Ọma 19:8

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Luk 9:46-48​—Jizọs gbaziri ndịozi ya maka na ọ ma na ihe dị ha n’obi bụ ka ha bụrụ ndị ukwu

Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-echebe obi anyị?

1 Ihe 28:9; Ilu 4:23; Jere. 17:9

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jen. 6:5-7​—Ihe ọjọọ ndị mmadụ nọ na-eche n’obi ha mere ka e nwee tigbuo zọgbuo, bụ́kwanụ ihe mere Chineke ji jiri Iju Mmiri bibie ụwa

    • 1 Eze 11:1-10​—Eze Solomọn echebeghị obi ya. Ọ bụ ya mere o ji lụọ ụmụ nwaanyị ndị mba ọzọ, bụ́ ndị mere ka obi ya gharazie ịdị n’ife Jehova

    • Mak 7:18-23​—Jizọs kwuru na ọ bụ n’obi mmadụ ka echiche ọjọọ niile si apụta nakwa na o nwere ike ime ka anyị mehie Chineke

Olee otú anyị ga-esi echebe obi anyị?

Ọma 19:14; Ilu 3:3-6; Luk 21:34; Fil. 4:8

I nwekwara ike ịgụ Ezra 7:8-10; Ọma 119:11

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Efe. 6:14-18; 1 Tesa. 5:8​—Mgbe Pọl onyeozi na-ekwu banyere ekike agha Ndị Kraịst, o kwuru na ezi omume, okwukwe, na ịhụnanya na-echebe mmadụ otú ahụ ekike agha a na-eke n’obi si echebe obi mmadụ

Olee otú anyị nwere ike isi mata ma obi anyị ò nwere nsogbu?

Ilu 21:2-4; Hib. 3:12

I nwekwara ike ịgụ Ilu 6:12-14

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 2 Ihe 25:1, 2, 17-27​—Eze Amazaya nwere mgbe o mere ihe dị Chineke mma. Mana, o jighị obi ya niile mee ya. Ka oge na-aga, ọ bịara dị mpako ma malite ime ihe na-adịghị Chineke mma, bụ́kwanụ ihe kpataara ya nsogbu

    • Mat. 7:17-20​—Jizọs kwuru na otú ahụ osisi na-adịghị mma si amị mkpụrụ na-adịghị mma ka obi na-adịghị mma si echepụta ihe na-adịghị mma

Gịnị mere anyị ji kwesị ịgba mbọ ka anyị nwee ezigbo obi? Oleekwa otú anyị ga-esi na-eme ya?

Ilu 10:8; 15:28; Luk 6:45

I nwekwara ike ịgụ Ọma 119:97, 104; Rom 12:9-16; 1 Tim. 1:5

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 2 Eze 20:1-6​—Mgbe Eze Hezekaya nọ n’ọnụ ọnwụ, ọ rịọrọ Jehova ka o mee ka ọ gbakee n’ihi otú o si jiri obi ya niile na-efe ya

    • Mat. 21:28-32​—Jizọs ji ihe atụ gosi na ihe e ji amata ihe dị mmadụ n’obi bụ ihe onye ahụ na-eme, ọ bụghị naanị ihe o kwuru na ya ga-eme

Olee ihe ịmara na Jehova ma ihe dị anyị n’obi ji akasi anyị obi?

1 Ihe 28:9; Jere. 17:10

I nwekwara ike ịgụ 1 Sam. 2:3

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 1 Sam. 16:1-13​—A gwara Samuel onye amụma na ihe dị Jehova mkpa abụghị otú mmadụ dị n’elu ahụ́, kama, ọ na-ahụ ihe dị mmadụ n’obi

    • 2 Ihe 6:28-31​—Ekpere Eze Solomọn kpere mgbe a na-enyefe ụlọ nsọ Jehova gosiri na Chineke ma ihe dị n’obi ụmụ mmadụ nke ọma nakwa na ọ na-elekọta ụmụ mmadụ