Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Aha E Ji Akwanyere Mmadụ Ùgwù

Aha E Ji Akwanyere Mmadụ Ùgwù

Ndị Kraịst hà kwesịrị ịna-etu ndị ndú okpukpe aha e ji akwanyere ha ùgwù?

Jọn 5:41

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Luk 18:18, 19​—Ọ bụ eziokwu na Jizọs bụ ezigbo onye, ma, o kweghị ka e tuo ya “Ezigbo Onye Ozizi.” O kwuru na ọ bụ naanị Jehova bụ ezigbo onye

Gịnị mere na Ndị Kraịst ekwesịghị ịna-etu ndị ndú okpukpe aha, ndị dị ka, “Nna” ma ọ bụ “Onye Ndú”?

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Mat. 23:9-12​—Jizọs gwara anyị ka anyị ghara itu mmadụ aha ndị dị ka, “Nna” ma ọ bụ “Onye Ndú”

    • 1 Kọr. 4:14-17​—Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị weere Pọl onyeozi ka nna ha, ma, o nweghị ebe anyị gụtara a kpọrọ ya Fada Pọl ma ọ bụ ihe yiri ya

Olee ihe mere o ji dị mma ka Ndị Kraịst na-akpọ ibe ha ụmụnna ma na-emeso ha ka ụmụnne ha?

Mat. 23:8

I nwekwara ike ịgụ Ọrụ 12:17; 18:18; Rom 16:1

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Mat. 12:46-50​—Jizọs kwuru na ya weere ndị na-efe Chineke ka ụmụnne ya

Gịnị mere o ji dị mma ka Ndị Kraịst na-etu ndị ọchịchị, ndị okàikpe, na ndị ọzọ na-arụrụ ndị ọchịchị ọrụ aha e ji akwanyere ha ùgwù?

Rom 13:1, 7; 1 Pita 2:17

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ọrụ 26:1, 2, 25​—Mgbe Pọl onyeozi gwara ndị ọchịchị, dị ka Agrịpa na Festọs, okwu, o turu ha aha e ji akwanyere ha ùgwù