Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịdị Umeala n’Obi

Ịdị Umeala n’Obi

Olee otú Jehova si ele ma ndị dị umeala n’obi ma ndị dị mpako anya?

Ọma 138:6; Ilu 15:25; 16:18, 19; 22:4; 1 Pita 5:5

I nwekwara ike ịgụ Ilu 29:23; Aịza. 2:11, 12

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 2 Ihe 26:3-5, 16-21​—Eze Ọzaya bịara dị mpako. O mebiri Iwu Chineke ma wee ezigbo iwe mgbe a gwara ya na ihe o mere adịghị mma. Ihe a mere ka Chineke mee ka ọ rịawa ekpenta

    • Luk 18:9-14​—Jizọs ji otu ihe atụ o mere gosi otú Jehova si ele ekpere ndị dị mpako na ekpere ndị dị umeala n’obi anya

Gịnị ka Jehova na-eme ma onye mmehie wetuo onwe ya ala, jiri obi ya niile chegharịa?

2 Ihe 7:13, 14; Ọma 51:2-4, 17

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 2 Ihe 12:5-7​—Eze Rehoboam na ndị isi Juda wedara onwe ha ala, chegharịa ma nabata ihe Jehova gwara ha, bụ́ ihe mere ka Jehova ghara ibibi ha

    • 2 Ihe 32:24-26​—Ezigbo eze bụ́ Hezekaya bịara dị mpako, ma Jehova gbaghaara ya mgbe o wedara onwe ya ala

Olee otú ịdị umeala n’obi ga-esi mee ka anyị na ndị ọzọ dịkwuo ná mma?

Efe. 4:1, 2; Fil. 2:3; Kọl. 3:12, 13

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jen. 33:3, 4​—Ịsọ buuru Jekọb nwanne ya iwe n’obi. Ma, otú Jekọb si weda onwe ya ala kelee ya mgbe ọ hụrụ ya mere ka ha dịghachi ná mma

    • Ikpe 8:1-3​—Onyeikpe aha ya bụ Gidiọn gwara ndị Ifrem na ha ka ya. Ihe a o kwuru mere ka obi jụrụ ha, ha agharakwa ịlụso ya agha

Olee otú Jizọs Kraịst si kụzie na ịdị umeala n’obi bara uru?

Mat. 18:1-5; 23:11, 12; Mak 10:41-45

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Aịza. 53:7; Fil. 2:7, 8​—Ihe ndị amụma kwuru mezuru mgbe Jizọs wedara onwe ya ala ma kwere ịbịa jee ozi n’ụwa, taa ahụhụ ma nwụọ ọnwụ ihere

    • Luk 14:7-11​—Jizọs ji otú ndị mmadụ si na-ahọrọ ebe kacha mma ha ga-anọ n’ebe a kpọrọ ha oriri gosi na ịdị umeala n’obi bara ezigbote uru

    • Jọn 13:3-17​—Jizọs wedara onwe ya ala ma saa ndịozi ya ụkwụ, bụ́ ọrụ onye na-ejere mmadụ ozi na-arụ, si otú ahụ kụziere ha ka ha na-adị umeala n’obi

Olee otú ile ma onwe anyị ma ndị ọzọ anya otú Jehova si ele anyị anya ga-esi nyere anyị aka ịdị umeala n’obi?

Olee ihe mere mmadụ ime ka ọ̀ dị umeala n’obi mgbe ọ na-adịghị ji bụrụ ihe na-abaghị uru?