Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịhụ Akụnụba n’Anya

Ịhụ Akụnụba n’Anya

Baịbụl ò kwuru na ọ dị njọ mmadụ inwe ego ma ọ bụ akụnụba?

Ekli. 7:12

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 1 Eze 3:11-14​—Jehova gọziri Eze Solomọn ma nye ya ọtụtụ akụnụba n’ihi na ọ dị umeala n’obi

    • Job 1:1-3, 8-10​—Job bara ezigbo ọgaranya, ma ihe kacha ya mkpa bụ adịm ná mma ya na Jehova

Gịnị mere na ịkpakọba ego na akụnụba anaghị eme ka mmadụ na-enwe ezigbo obi ụtọ?

Olee oge akụnụba na-anaghị abara anyị uru?

Olee nsogbu kachanụ akụnụba na ego nwere ike ịkpata?

Olee otú akụnụba nwere ike isi ghọgbuo mmadụ?

Ilu 11:4, 18, 28; 18:11; Mat. 13:22

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ọrụ 8:18-24​—Saịmọn dị iberiibe, o chere na ọ ga-eji ego zụta ọkwá n’ọgbakọ

Gịnị nwere ike ifunahụ anyị ma anyị hụ ego n’anya?

Mat. 6:19-21; Luk 17:31, 32

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Mak 10:17-23​—Otú nwa okorobịa nke bara ọgaranya ekweghị eso Jizọs maka na ọ hụrụ ego ya na akụnụba ya n’anya nke ukwuu

    • 1 Tim. 6:17-19​—Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst bara ọgaranya ka ha ghara ịdị mpako maka na ọ ga-eme ka ha na Chineke ghara ịdị ná mma

Olee otú ịhụ akụnụba n’anya nwere ike isi mee ka okwukwe mmadụ jụọ oyi ma mee ka onye ahụ na Chineke gharazie ịdị ná mma?

Diut. 8:10-14; Ilu 28:20; 1 Jọn 2:15-17

I nwekwara ike ịgụ Ọma 52:6, 7; Emọs 3:12, 15; 6:4-8

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Job 31:24, 25, 28​—Job ghọtara na o kwesịghị ịtụkwasị akụnụba obi n’ihi na ọ ga-apụta na ọ naghị atụkwasị Chineke obi

    • Luk 12:15-21​—Mgbe Jizọs dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị banyere ịhụ akụnụba n’anya, o kwuru banyere otu nwoke nke na-abụghị ọgaranya n’anya Chineke

Olee otú ihe ndị anyị nwere ga-esi na-eju anyị afọ?

Olee ụdị akụnụba nke kacha mkpa? Maka gịnị?

Ilu 3:11, 13-18; 10:22; Mat. 6:19-21

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Hag. 1:3-11​—Jehova si n’ọnụ Hagaị onye amụma gwa ndị ya na ọ gaghị agọzi ha maka na ha nọ na-agbasi mbọ ike na-arụ ụlọ nke ha, na-emekwa ka obi ruo ha ala ma ha anaghị akwado ofufe Jehova

    • Mkpu. 3:14-19​—Jizọs baara ọgbakọ dị na Leodisia ezigbo mba maka na akụnụba dị ha mkpa karịa ijere Chineke ozi

Gịnị mere obi ga-eji sie anyị ike na Jehova ga-enye anyị ihe ndị dị anyị mkpa?