Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ebere

Ebere

Olee àgwà ndị ọzọ ha na ebere na-agakọ?

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ọma 51:1, 2​—Mgbe Eze Devid rịọrọ Jehova ka o meere ya ebere, ihe ọ na-arịọ ya bụ ka ọ gbaghara ya ma sachapụ mmehie ya

    • Luk 10:29-37​—Jizọs kọrọ otu akụkọ iji kụziere anyị otú anyị ga-esi na-eme ebere. Ọ kọrọ banyere onye Sameria nke meere otu onye Juu ihe ọma

Gịnị mere e ji kwesị imere mmadụ niile ebere?

Olee otú anyị si mara na Jehova na-eme ebere?

Ọpụ. 34:6; Nehe. 9:17; Ọma 103:8; 2 Kọr. 1:3

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Job 42:1, 2, 6-10; Jems 5:11​—Jehova meere Job ebere ma kụziere ya ka ọ na-emere ndị ọzọ ebere

    • Luk 15:11-32​—Jizọs mere ihe atụ otú otu nna si meso nwa ya nupụrụ isi. O ji ya gosi otú Jehova si emere anyị ebere

Gịnị mere Jehova ji emere anyị ebere?

Rom 5:8; 1 Jọn 4:9, 10

I nwekwara ike ịgụ Taị. 3:4, 5

Olee otú àjà Kraịst chụrụ si eme ka a gbaghara anyị mmehie?

Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-arịọ Chineke ka o meere anyị ebere? Gịnịkwa mere na anyị ekwesịghị iji onyinye a egwu egwu?

Luk 11:2-4; Hib. 4:16

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ọma 51:1-4​—Mmehie Eze Devid mere wutere ya nke ukwuu, ya ewetuo onwe ya ala rịọ Jehova ka o meere ya ebere

    • Luk 18:9-14​—Jizọs mere ihe atụ iji nyere anyị aka ịghọta na Jehova na-emere ndị mere mmehie ebere ma ha wetuo onwe ha ala, kwetakwa na ha mejọrọ

Gịnị mere na ndị medịrị mmehie dị oké njọ nwere ike ịtụ anya na a ga-emere ha ebere?

Diut. 4:29-31; Aịza. 55:7

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 2 Ihe 33:9-13, 15​—Manase bụ ajọ eze, ma o mechara chegharịa, rịọ Chineke ka o meere ya ebere. O mechara bụrụ eze ọzọ, ihe ndị o mekwara gosiri na o chegharịrị n’eziokwu

    • Jona 3:4-10​—E ji tigbuo zọgbuo na igbu ndị mmadụ mara ndị Ninive. Ma ha mechara chegharịa, Chineke emeekwara ha ebere

Gịnị mere anyị ji kwesị ikwupụtara Jehova mmehie anyị ma gbanwee ka o wee meere anyị ebere?

Na Jehova meere anyị ebere apụtaghị na anyị agaghị ata ahụhụ mmehie anyị mere kpatara

Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-emere ndị ọzọ ebere?

Ọ bụrụ na anyị anaghị emere ndị ọzọ ebere, gịnị nwere ike ime adịm ná mma anyị na Jehova?

Mat. 9:13; 23:23; Jems 2:13

I nwekwara ike ịgụ Ilu 21:13

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Mat. 18:23-35​—Jizọs mere ihe atụ nke gosiri na ọ bụrụ na anyị ajụ imere ndị ọzọ ebere, Jehova agaghị emere anyị ebere

    • Luk 10:29-37​—Jizọs mere ihe atụ nke gosiri na obi anaghị adị ya na Jehova ụtọ ma mmadụ ghara imere ndị ọzọ ebere. Kama, obi na-adị ha ụtọ ma anyị na-eme ka onye Sameria ahụ meteere onye Juu ebere

Olee otú Jehova si emeso ndị na-eme ebere?