Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mmegbu

Mmegbu

Olee otú obi nwere ike ịdị anyị ma ndị ọzọ megbuo anyị?

Ọma 69:20; Ilu 18:14; Ekli. 4:1-3; Mal. 2:13-16; Kọl. 3:21

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 2 Sam. 10:1-5​—Mgbe ndị iro Eze Devid menyere ụfọdụ n’ime ndị agha ya ihere, Devid meere ha ihe gosiri na ọ dị obiọma

    • 2 Sam. 13:6-19​—Tema bere nnukwu ákwá, dọwaakwa uwe ya mgbe Amnọn dinara ya n’ike, menye ya ihere, chụpụkwa ya

Olee ihe na-egosi na Jehova ma ihe niile na-eme mgbe a na-emegbu ndị na-efe ya? Gịnịkwa ka ọ ga-eme banyere ya?

Job 34:21, 22; Ọma 37:8, 9; Aịza. 29:15, 19-21; Rom 12:17-21

I nwekwara ike ịgụ Ọma 63:6, 7

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 1 Sam. 25:3, 14-17, 21, 32-38​—Nebal dị aka ike, na-akparịkwa mmadụ. Ọ kparịrị Devid, bụ́ ihe gaara ata isi ndị nọ n’ezinụlọ ya. Jehova mechara taa Nebal ahụhụ, ya anwụọ

    • Jere. 20:1-6, 9, 11-13​—Jeremaya dara mbà mgbe onye nchụàjà aha ya bụ Pash-họ tiri ya ihe, tinye ya n’ọtọsị. Ma, Jehova gbara Jeremaya ume, napụtakwa ya