Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ego

Ego

Gịnị mere ịhụ ego n’anya ji akpata nsogbu?

Gụọ isiokwu bụ́ “Ịhụ Akụnụba n’Anya

Olee otú Baịbụl si gosi na mmadụ ịkpata ego iji lekọta ezinụlọ ya adịghị njọ?

Ekli. 7:12; 10:19; Efe. 4:28; 2 Tesa. 3:10; 1 Tim. 5:8, 18

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jen. 31:38-42​—Iji lekọta ndị ezinụlọ ya, Jekọb ji obi ya niile rụọrọ ọgọ ya nwoke bụ́ Leban ọrụ n’agbanyeghị na ọ ghọrọ ya aghụghọ. Ma, Jehova gọziri Jekọb maka na ọ rụsiri ọrụ ike

    • Luk 19:12, 13, 15-23​—Jizọs mere otu ihe atụ nke gosiri na n’oge ọ nọ n’ụwa, ndị mmadụ na-eji ego azụ ahịa, nwetakwa uru

Gịnị ka Baịbụl kwuru banyere ibinye mmadụ ego na mmadụ ibiri ego?

Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịna-ebiri ego aghara aghara?

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Nehe. 5:2-8​—N’oge Nehemaya bụ gọvanọ, ụfọdụ ndị Izrel nọ na-emesi ndị ha binyere ego ike

    • Mat. 18:23-25​—Jizọs mere otu ihe atụ nke gosiri na ọ bụrụ na onye ji ụgwọ ekweghị akwụ ụgwọ o ji, e nwere ike ịta ya ahụhụ

Gịnị ka anyị kwesịrị ime tupu anyị na onye ọ bụla amalite achụmnta ego, ma onye ahụ ọ̀ bụ nwanna, ma ọ̀ bụ onye ikwu anyị, ma ọ̀ bụkwanụ onye na-abụghị nwanna?

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jen. 23:14-20​—Mgbe Ebreham gara ịzụ ala ebe ọ chọrọ ili Sera, ọ kwụrụ ụgwọ ya n’ihu ndị akaebe, ka onye ọ bụla ghara ịkpata esemokwu n’ọdịnihu

    • Jere. 32:9-12​—Mgbe Jeremaya onye amụma zụrụ ala n’aka nwa nwanne nna ya, o dere ihe ha kwekọrịtara n’akwụkwọ, depụtaghachikwa ya n’akwụkwọ ọzọ, kwụzie ụgwọ ala ahụ n’ihu ndị akaebe

Gịnị mere o ji dị mma ka anyị na-eme ezigbo atụmatụ banyere otú anyị ga-esi na-emefu ego?

Gịnị mere na anyị ekwesịghị ikwe ka okwu ego kpata nsogbu n’ọgbakọ?

1 Kọr. 6:1-8

I nwekwara ike ịgụ Rom 12:18; 2 Tim. 2:24

Olee otú anyị ga-esi jiri ego anyị na-eme ihe ga-eme ka anyị na-enwe ezigbo obi ụtọ?