Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Irube Isi

Irube Isi

Olee otú irube isi dịruru mkpa?

Ọpụ. 19:5; Diut. 10:12, 13; Ekli. 12:13; Jems 1:22

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 1 Sam. 15:17-23​—Samuel onye amụma baara Eze Sọl ezigbo mba maka na o nupụụrụ Jehova isi, gwakwa ya na irube isi bara ezigbo uru

    • Hib. 5:7-10​—N’agbanyeghị na Jizọs bụ Ọkpara Chineke zuru okè, mgbe ọ nọ n’ụwa, o si n’ahụhụ ndị mmadụ tara ya mụta irubere Nna ya isi

Gịnị ka Onye Kraịst kwesịrị ime ma ndị ọchịchị gwa ya ka o nupụrụ Chineke isi?

Ọrụ 5:29

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Dan. 3:13-18​—Ndị Hibru atọ jụrụ ịkpọrọ ihe Eze Nebukadneza kpụrụ isiala n’agbanyeghị na a gaara egbu ha

    • Mat. 22:15-22​—Jizọs kwuru na ndị na-eso ụzọ ya na-erubere ndị ọchịchi isi, ma ha agaghị erubere ha isi ma ha chọọ ka ha nupụrụ Jehova Chineke isi

    • Ọrụ 4:18-31​—Ndị na-eso ụzọ Jizọs katara obi na-ekwusasi ozi ọma ike n’agbanyeghị na ndị ọchịchị nyere ha iwu ka ha kwụsị ikwusa ya

Gịnị ka anyị ga-emerịrị iji na-erubere Jehova isi?

Diut. 6:1-5; Ọma 112:1; 1 Jọn 5:2, 3

I nwekwara ike ịgụ Ọma 119:11, 112; Rom 6:17

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ezra 7:7-10​—Onye nchụàjà aha ya bụ Ezra ji obi ya niile na-efe Jehova. Ọ kwadebere obi ya ka o nwee ike ime ihe Iwu Chineke kwuru ma kụziere ya ndị ọzọ

    • Jọn 14:31​—Jizọs kwuru ihe mere o ji eme ihe niile Nna ya nyere ya iwu ka o mee

Gịnị mere anyị ga-eji na-erubere Jehova na Jizọs isi?

Olee otú isi anyị na-erubere Chineke si egosi na anyị nwere okwukwe?

Rom 1:5; 10:16, 17; Jems 2:20-23

I nwekwara ike ịgụ Diut. 9:23

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jen. 6:9-22; Hib. 11:7​—Noa gosiri na o nwere okwukwe ma rụọ ụgbọ Jehova sịrị ya rụọ. “O mere nnọọ otú ahụ”

    • Hib. 11:8, 9, 17​—Mgbe Jehova gwara Ebreham ka o si na Ọọ kwapụ nakwa ka o jiri nwa ya nwoke chụọ àjà, Ebreham rubeere ya isi, si otú ahụ gosi na o nwere okwukwe

Olee otú Jehova si agọzi ndị na-erubere ya isi?

Jere. 7:23; Mat. 7:21; 1 Jọn 3:22

Gịnị ga-eme anyị ma anyị nupụ isi?

Rom 5:19; 2 Tesa. 1:8, 9

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jen. 2:16, 17; 3:17-19​—Mgbe Adam na Iv nupụụrụ Jehova Chineke isi, e si na paradaịs chụpụ ha, ha ezughịzi okè, ha agaghịkwa enweta ndụ ebighị ebi

    • Diut. 18:18, 19; Ọrụ 3:12, 18, 22, 23​—Jehova kwuru na a ga-enwe onye amụma ga-aka Mosis nakwa na a ga-ata onye ọ bụla ga-enupụrụ onye amụma ahụ isi ahụhụ

    • Jud 6, 7​—Ndị Sọdọm na Gọmọra na ndị mmụọ ozi ndị nupụụrụ Jehova isi kpasuru Jehova iwe

Gịnị mere anyị ga-eji na-erubere Jizọs Kraịst isi?

Jen. 49:10; Mat. 28:18

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

Gịnị mere Ndị Kraịst ji erubere ndị okenye ọgbakọ isi?

Gịnị mere nwanna nwaanyị ga-eji na-erubere di ya isi?

Gịnị mere ụmụaka ga-eji na-erubere nne na nna ha isi?

Ilu 23:22; Efe. 6:1; Kọl. 3:20

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jen. 37:3, 4, 8, 11-13, 18​—Mgbe Josef bụ nwa okorobịa, o rubeere nna ya isi ma gawa ịhụ ụmụnne ya n’agbanyeghị na ha kpọrọ ya asị

    • Luk 2:51​—Jizọs na-erubere Josef na Meri bụ́ nne na nna ya isi n’agbanyeghị na o zuru okè ma hanwa ezughị okè

Gịnị mere anyị ga-eji na-erubere onye anyị na-arụrụ ọrụ isi ọ bụrụgodị na e nweghị onye na-ahụ anyị?

Gịnị mere Ndị Kraịst ji erubere ndị ọchịchị isi?