Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nká; Ndị Agadi

Nká; Ndị Agadi

Gịnị na-eme anyị ma anyị kawa nká?

Ọma 71:9; 90:10

Gụọkwa isiokwu bụ́ “Nkasi Obi​—Ndị ọrịa na nká na-egbochi ime ihe ha chọrọ ime

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ekli. 12:1-8​—Eze Solomọn kwuru ihe ụfọdụ na-eme ma mmadụ kawa nká, dị ka, a hụchaghị ụzọ nke ọma (ya bụ, ‘anya ịgba ụmụ nwaanyị ndị na-elepụ anya na windo ọchịchịrị’) na a nụchaghị ihe nke ọma (ya bụ, ‘olu ụmụ nwaanyị niile na-abụ abụ adapụtaghị ụda’)

Ndị agadi hà nwere ike ịna-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị nsogbu ndị ha na-enwe na ihe ndị ha na-agaghị emelizi maka na ha emeela agadi?

2 Kọr. 4:16-18; Jems 1:2-4

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 1 Sam. 12:2, 23​—Mgbe Samuel onye amụma kara nká, ọ ma na ọ dị ezigbo mkpa ka ọ na-ekpe ekpere maka ndị Jehova

    • 2 Sam. 19:31-39​—Eze Devid kelere Bazilaị merela agadi maka otú o si kwado ya. Bazilaị gosiri na ya ma ebe ike ya ruru mgbe a gwara ya mee ihe ọ ma na ọ gaghị emeli

    • Ọma 71:9, 18​—Mgbe Eze Devid nọ na-atụ ụjọ na ọ gaghịzi abara Jehova uru ma ọ kaa nká, ọ rịọrọ Jehova ka o nye ya ike ọ ga-eji kụziere ọgbọ na-eso ya banyere ya

    • Luk 2:36-38​—A gọziri onye amụma nwaanyị aha ya bụ Anna maka na o ji obi ya niile na-efe Chineke. Nwaanyị a emeela agadi, bụrụkwa nwaanyị di ya nwụrụ

Olee otú Jehova si emesi ndị agadi obi ike na o ji ha kpọrọ ihe?

Ọma 92:12-14; Ilu 16:31; 20:29; Aịza. 46:4; Taị. 2:2-5

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jen. 12:1-4​—Mgbe Ebreham dị afọ iri asaa na ise, Jehova gwara ya ka ọ hapụ obodo ya kwapụ

    • Dan. 10:11, 19; 12:13​—Otu mmụọ ozi gara leta Daniel onye amụma mgbe ọ dị ihe dị ka afọ iri itoolu. Ọ gwara Daniel na Jehova hụrụ ya n’anya nakwa na ọ ga-akwụ ya ụgwọ maka na o ji obi ya na-efe ya

    • Luk 1:5-13​—Jehova gọziri Zekaraya na Elizabet merela agadi, mee ka ha mụta nwa nwoke aha ya bụ Jọn

    • Luk 2:25-35​—Jehova meere Simiọn, nwoke merela agadi, amara kwe ka ọ hụ nwa ọhụrụ ga-emecha bụrụ Mezaya. Simiọn buru amụma banyere nwa ahụ

    • Ọrụ 7:23, 30-36​—Mosis onye amụma dị afọ iri asatọ mgbe Jehova mere ya onye ndú ndị ya bụ́ ndị Izrel

Olee otú e kwesịrị isi na-emeso ụmụnna ndị merela agadi?

Lev. 19:32; 1 Tim. 5:1

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jen. 45:9-11; 47:12​—Josef ziri ozi, a kpọtara ya Jekọb nna ya merela agadi. Josef lekọtakwara ya ruo mgbe ọ nwụrụ

    • Rut 1:14-17; 2:2, 17, 18, 23​—Rut gwara agadi nwaanyị bụ́ Naomi okwu ọma, nyekwara ya aka. O si otú ahụ kwado Naomi

    • Jọn 19:26, 27​—Tupu Jizọs anwụọ n’elu osisi ịta ahụhụ, ọ gwara Jọn onyeozi ka o lekọtara ya mama ya merela agadi

Olee ihe anyị nwere ike ime iji nyere ndị agadi nọ n’ọgbakọ aka?