Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Nlekọta

Ndị Nlekọta

Gịnị na gịnị ga-egosi na Ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta ruru eru?

Olee ihe ndị ọzọ Ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta kwesịrị ịna-eme ka ndị ọzọ nwee ike na-eṅomi ha?

Gịnị na gịnị ga-egosi na ndị ohu na-eje ozi ruru eru?

Gịnị mere anyị ga-eji kwuo na e ji ike mmụọ nsọ ahọpụta ndị na-elekọta ọgbakọ?

Ọrụ 20:28

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ọrụ 13:2-5; 14:23​—Pọl na Banabas bụ́ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị họpụtara ndị okenye n’ọgbakọ dị iche iche. Ndị nlekọta sekit na-emekwa otú ahụ taa. Ha na-ekpe ekpere, jirikwa ihe Baịbụl kwuru họpụta ndị okenye ọgbakọ

    • Taị. 1:1, 5​—Taịtọs gara n’ọgbakọ dị iche iche, na-ahọpụta ndị okenye

Ònye nwe ọgbakọ Ndị Kraịst? Oleekwa ihe e ji zụta ya?

Gịnị mere Baịbụl ji kwuo na ndị okenye na-ejere ndị ọzọ ozi?

Gịnị mere ndị okenye ji kwesị ịdị umeala n’obi?

Fil. 1:1; 2:5-8; 1 Tesa. 2:6-8; 1 Pita 5:1-3, 5, 6

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ọrụ 20:17, 31-38​—Pọl onyeozi chetaara ndị okenye nọ n’Efesọs ihe o meere ha, ha gosikwara na obi dị ha ụtọ maka otú o si hụ ha n’anya

Olee otú Onye Kraịst bụ́ onye nlekọta si ele ihe “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” kwuru anya?

Olee otú kacha mma ndị okenye ga-esi na-akụziri ndị ọzọ ihe?

1 Tim. 4:12; 1 Pita 5:2, 3

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Nehe. 5:14-16​—Gọvanọ Nehemaya na-akwanyere Jehova ezigbo ùgwù. Ọ bụ ya mere na o rigbughị ndị Chineke ọ na-elekọta, ọ naraghịdị ha ihe ruuru ya

    • Jọn 13:12-15​—Jizọs si n’otú o si akpa àgwà kụziere ndị na-eso ụzọ ya ịdị umeala n’obi

Olee otú okenye ọgbakọ ga-esi gosi ndị nọ n’ọgbakọ n’otu n’otu na ọ hụrụ ha n’anya?

Olee otú ndị okenye si enyere ndị mere mmehie dị oké njọ aka?

Olee ihe bụ́ ọrụ ndị okenye ma ha kụziwe ihe?

Gịnị mere ndị okenye ga-eji na-agba mbọ iji hụ na e debere ọgbakọ Jehova ọcha?

Olee ndị ndị okenye na-agbasi mbọ ike ịkụziri ihe?

2 Tim. 2:1, 2

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Mat. 10:5-20​—Jizọs kụziiri ndịozi ya iri na abụọ ihe tupu o zipụ ha ikwusa ozi ọma

    • Luk 10:1-11​—Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya iri asaa ihe ha ga-eme tupu o zipụ ha ikwusa ozi ọma

Gịnị ga-enyere ndị okenye aka ịna-arụ ọrụ niile e nyere ha?

1 Pita 5:1, 7

I nwekwara ike ịgụ Ilu 3:5, 6

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 1 Eze 3:9-12​—Eze Solomọn rịọrọ Jehova ka o nye ya amamihe ọ ga-eji chịa ndị na-efe ya

    • 2 Ihe 19:4-7​—Eze Jehoshafat họpụtara ndị ikpe na Juda, ma gwa ha na Jehova ga-anọnyere ha ka ha na-arụ ọrụ dị mkpa e nyere ha

Olee otú ndị nọ n’ọgbakọ kwesịrị isi na-emeso ndị na-elekọta ha?

1 Tesa. 5:12, 13; 1 Tim. 5:17; Hib. 13:7, 17

I nwekwara ike ịgụ Efe. 4:8, 11, 12

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ọrụ 20:37​—Ndị okenye nọ n’Efesọs egbughị oge ime ka Pọl onyeozi mata na ha hụrụ ya n’anya

    • Ọrụ 28:14-16​—Mgbe Pọl onyeozi na-aga Rom, ụmụnna ndị nọ na Rom gara ije ihe dị ka kilomita iri isii na ise ka ha zute Pọl n’Ahịa Apịọs. Ha gbakwara ya ezigbo ume