Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Nne na Nna

Ndị Nne na Nna

Gịnị mere Jehova ji malite alụmdi na nwunye?

Olee otú ndị nne na nna kwesịrị isi were ụmụ ha?

Ọma 127:3-5; 128:3

Gụọkwa isiokwu bụ́ “Ụmụaka; Ndị Na-eto Eto

Gịnị ka ndị nne na nna kwesịrị imere ụmụ ha?

Diut. 6:6, 7; 11:18, 19; Ilu 22:6; 2 Kọr. 12:14; 1 Tim. 5:8

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 1 Sam. 1:1-4​—Elkena na-akpọ ndị ezinụlọ ya aga ememme a na-eme na Shaịlo. Ọ na-ahụkwa na nwa ya ọ bụla so na-efe Jehova

    • Luk 2:39, 41​—Josef na Meri na-akpọkarị ụmụ ha esi Nazaret aga Jeruselem maka Ememme Ngabiga

Olee uru ịzụ ụmụaka ka ha na-erubere Jehova isi bara?

Ilu 1:8, 9; 22:6

I nwekwara ike ịgụ 2 Tim. 3:14, 15

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 1 Sam. 2:18-21, 26; 3:19​—Nne na nna Samuel kpọgara ya n’ụlọ nsọ ka ọ na-eje ozi ebe ahụ. Ma, ha na-aga eleta ya, na-ewegakwara ya ihe ndị dị ya mkpa. Mgbe o toro, ọ hụrụ Jehova n’anya, jirikwa obi ya niile na-efe ya

    • Luk 2:51, 52​—Jizọs nọ na-erubere nne na nna ya isi n’agbanyeghị na ha ezughị okè

Ebee ka ndị nne na nna ga-esi nweta ihe ga-enyere ha aka ịzụ ụmụ ha?

Diut. 6:4-9; Efe. 6:4; 2 Tim. 3:14-17

I nwekwara ike ịgụ Ọma 127:1; Ilu 16:3

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ikpe 13:2-8​—Mgbe otu mmụọ ozi gwara Manoa na nwunye ya ga-amụ nwa nwoke, ọ jụrụ ya otú ọ ga-esi azụ nwa ahụ a ga-amụ

    • Ọma 78:3-8​—Jehova chọrọ ka ndị nne na nna kụziere ụmụ ha ihe ha mụtara na Baịbụl

Olee ihe nwere ike ime ka mmadụ kpebie na ya agaghị efe Jehova n’agbanyeghị na ndị mụrụ ya na-efe ya?

Ezik. 18:1-13, 20

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jen. 6:1-5; Jud 6​—N’agbanyeghị na ndị mmụọ ozi na Jehova nọ n’eluigwe kemgbe ọtụtụ afọ, ụfọdụ n’ime ha kpebiri inupụrụ Jehova isi

    • 1 Sam. 8:1-3​—N’agbanyeghị na Samuel bụ ezigbo onye amụma ji obi ya niile na-efe Jehova, ụmụ ya nọ na-eme ihe ọjọọ

Olee mgbe ndị nne na nna kwesịrị ịmalite kụziwere ụmụ ha ihe Chineke chọrọ ka ha na-eme?

2 Tim. 3:15

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Diut. 29:10-12, 29; 31:12; Ezra 10:1​—Mgbe ndị Izrel gbakọtara ka ha mụta banyere Jehova, ha kpọtara ụmụ ha ka ha soro mụta banyere Jehova

    • Luk 2:41-52​—Kwa afọ, Josef na Meri na-akpọ ụmụ ha, ma Jizọs, aga Ememme Ngabiga n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem

N’aka onye ka ndị nne na nna kwesịrị isi mụta ichebe ụmụ ha ka ndị ọzọ ghara imerụ ha ahụ́ ma ọ bụ imebi ha?

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ọpụ. 19:4; Diut. 32:11, 12​—Jehova ji onwe ya tụnyere ugo nke na-ebu ụmụ ya na nku ya, na-echebe ha, ma na-elekọta ha

    • Aịza. 49:15​—Jehova kwere nkwa na ọ ga-elekọta ndị na-efe ya ma na-echebe ha karịadị otú nwaanyị na-enye nwa ara na-eme

    • Mat. 2:1-16​—Setan gbara mbọ ka o gbuo Jizọs mgbe ọ bụ nwa ọhụrụ. Otú o si mee ya bụ na o dugara ndị ji kpakpando akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu na nke Eze Herọd. Ma, Jehova gwara Josef ka ọ kpọrọ ndị ezinụlọ ya gawa Ijipt si otú ahụ chebe nwa ya

    • Mat. 23:37​—Jizọs ji otú o si agụsi ya agụụ ike inyere ndị obodo ha aka tụnyere otú nnekwu ọkụkọ si achịkọta ụmụ ya n’okpuru nku ya ma na-echebe ha

Gịnị mere ndị nne na nna ji kwesị ịkụziri ụmụ ha banyere mmekọahụ?

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Lev. 15:2, 3, 16, 18, 19; Diut. 31:10-13​—N’Iwu Mosis, ihe Jehova kwuru gbasara mmekọahụ doro nnọọ anya. Jehova nyekwara iwu ka ụmụaka nọrọ ya mgbe a na-agụpụta ha

    • Ọma 139:13-16​—Ọbụ abụ bụ́ Devid toro Jehova maka otú dị ịtụnanya o si kee ahụ́ mmadụ nakwa otú o si kee anyị ka anyị na-amụ nwa

    • Ilu 2:10-15​—Amamihe si n’aka Jehova ga-echebeli anyị ka ndị na-eme ihe ọjọọ na ndị aghụghọ ghara inweta anyị

Gịnị mere ndị nne na nna ji kwesị ịna-adọ ụmụ ha aka ná ntị otú gosiri na ha hụrụ ha n’anya?

Ilu 13:24; 29:17; Jere. 30:11; Efe. 6:4

I nwekwara ike ịgụ Ọma 25:8; 145:9; Kọl. 3:21

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ọma 32:1-5​—Jehova tara Eze Devid ahụhụ maka mmehie ya, ma obi jụụrụ ya mgbe ọ matara na Jehova na-agbaghara ndị ji obi ha niile chegharịa

    • Jona 4:1-11​—Jona ji iwe gwa Jehova okwu, ọ kwanyeghịkwara ya ùgwù. Ma, Jehova weturu obi kụziere ya na ya na-eme ebere

Gịnị mere anyị ga-eji kwuo na ndị nne na nna ịdọ ụmụ ha aka ná ntị so n’otú ha si egosi na ha hụrụ ha n’anya?