Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mkpagbu

Mkpagbu

Gịnị mere Ndị Kraịst ji kwesị ịna-atụ anya na a ga-akpagbu ha?

Olee ihe mere anyị ga-eji rịọ Jehova ka o nyere anyị aka mgbe a na-akpagbu anyị?

Ọma 55:22; 2 Kọr. 12:9, 10; 2 Tim. 4:16-18; Hib. 13:6

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 1 Eze 19:1-18​—Mgbe a na-akpagbu Ịlaịja onye amụma, ọ gwara Jehova ihe niile dị ya n’obi. Jehova gbara ya ume, kasiekwa ya obi

    • Ọrụ 7:9-15​—Ụmụnne Josef kpagburu ya. Ma, Jehova nọnyeere ya, zọpụta ya, sikwa n’aka ya zọpụta ndị ikwu ya

Olee ụdị mkpagbu ndị nwere ike ịbịara anyị?

E nwere ike ikwutọ anyị ma ọ bụ kparịa anyị

2 Ihe 36:16; Mat. 5:11; Ọrụ 19:9; 1 Pita 4:4

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 2 Eze 18:17-35​—Rabshake, onye na-ekwuchite ọnụ eze Asiria, kparịrị Jehova, kwaakwa ndị Jeruselem emo

    • Luk 22:63-65; 23:35-37​—Ndị na-akpagbu Jizọs kparịrị ya, jirikwa ya mee ihe ọchị ma mgbe ha ji ya eji ma mgbe ọ nọ n’elu osisi ịta ahụhụ

Ndị ikwu anyị nwere ike imegide anyị

E nwere ike ijide anyị, kpụga anyị na nke ndị ọchịchị ka ha gbaa anyị ajụjụ

E nwere ike iti anyị ihe

Ìgwè mmadụ nwere ike ịlụso anyị ọgụ

E nwere ike igbu anyị

Gịnị ka Ndị Kraịst kwesịrị ime ma a kpagbuwe ha?

Mat. 5:44; Ọrụ 16:25; 1 Kọr. 4:12, 13; 1 Pita 2:23

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ọrụ 7:57–8:1​—Mgbe ìgwè mmadụ na-atụ Stivin okwute, ya anọrọ n’ọnụ ọnwụ, ọ rịọrọ Jehova ka ọ gbaghara ndị ahụ na-akpagbu ya. Sọl onye Tasọs sokwa ná ndị ahụ nọ na-akpagbu ya

    • Ọrụ 16:22-34​—N’agbanyeghị na e tiri Pọl onyeozi ihe, kpọchie ya n’ụlọ mkpọrọ, o meere nwoke na-elekọta ụlọ mkpọrọ ahụ ihe ọma. Ihe a o mere meziri ka nwoke ahụ na ndị ezinụlọ ya niile bụrụ Ndị Kraịst

Gịnị mere ụfọdụ Ndị Kraịst n’oge ndịozi Jizọs?

Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele mkpagbu anya?

Olee otú olileanya anyị nwere na ihe ga-aka mma n’ọdịnihu ga-esi mesie anyị obi ike mgbe a na-akpagbu anyị?

Gịnị mere na anyị anaghị eme ihere, tụwa ụjọ ma ọ bụ daa mbà mgbe a na-akpagbu anyị? Gịnịkwa mere na anyị anaghị ekwe akwụsị ife Jehova?

Ọma 56:1-4; Ọrụ 4:18-20; 2 Tim. 1:8, 12

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 2 Ihe 32:1-22​—Mgbe Eze Senakerib kpọ ìgwè ndị agha bịa ịlụso ndị Jeruselem ọgụ, Eze Hezekaya, onye ji obi ya niile efe Chineke, tụkwasịrị Jehova obi ma gbaa ndị obodo ya ume. Jehova gọzikwara ya

    • Hib. 12:1-3​—Ndị na-akpagbu Jizọs chọrọ imenye ya ihere, ma Jizọs ekweghị ka ihere mee ya. O kweghịkwa ka ha mee ka ọ daa mbà

Olee ihe ọma ndị nwere ike ime mgbe a na-akpagbu anyị?

Anyị tachie obi mgbe a na-akpagbu anyị, obi na-adị Jehova ụtọ, a na-etokwa aha ya

1 Pita 2:19, 20; 4:12-16

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Job 1:6-22; 2:1-10​—N’agbanyeghị na Job amaghị na ọ bụ Setan na-akpagbu ya, ọ kwụsiri ike n’ebe Jehova nọ. Ihe a Job mere mere ka e too Jehova ma gosi na Setan bụ onye ụgha

    • Dan. 1:6, 7; 3:8-30​—Hananaya, Mishel, na Azaraya (ya bụ Shedrak, Mishak, na Abednego) na-erubere Chineke isi. Ha dị njikere ịnwụ kama inupụrụ Jehova isi. N’ihi ya, Eze Nebukadneza, onye na-ekpere arụsị, toro Jehova ma kwuo na Jehova bụ Chineke Onye Kacha Elu

Ndị mmadụ nwere ike ịchọ ịmata banyere Jehova n’ihi mkpagbu a na-akpagbu anyị

Luk 21:12, 13; Ọrụ 8:1, 4

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ọrụ 11:19-21​—Mgbe a na-akpagbu Ndị Kraịst, ha gbagara ebe dị iche iche, na-ekwusakwa ozi ọma

    • Fil. 1:12, 13​—Obi dị Pọl onyeozi ụtọ maka na mkpọrọ a tụrụ ya mere ka ọtụtụ ndị nụ ozi ọma

Anyị tachie obi mgbe a na-akpagbu anyị, anyị nwere ike ime ka okwukwe ụmụnna anyị sikwuo ike

Olee ndị aka ha na-adịkarị ná mkpagbu a na-akpagbu Ndị Kraịst?

Jere. 26:11; Mak 3:6; Jọn 11:47, 48, 53; Ọrụ 25:1-3

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ọrụ 19:24-29​—N’Efesọs, ndị na-ere arụsị chere na ozi ọma Ndị Kraịst na-ekwusa ga-akpatara ha njọ ahịa, ọ bụ ya mere ha ji kpagbuwe Ndị Kraịst

    • Gal. 1:13, 14​—Tupu Pọl (ya bụ Sọl) abụrụ Onye Kraịst, o bu okpukpe ndị Juu n’isi nke mere o ji na-akpagbu Ndị Kraịst

Ònye na-akpata mkpagbu a na-akpagbu ndị na-efe Jehova?