Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ekpere

Ekpere

Olee otú anyị si mara na Jehova na-anụ ekpere anyị, na-azakwa ha?

Ọma 65:2; 145:18; 1 Jọn 5:14

I nwekwara ike ịgụ Ọma 66:19; Ọrụ 10:31; Hib. 5:7

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 1 Eze 18:36-38​—Jehova egbughị oge za ekpere Ịlaịja kpere n’Ugwu Kamel mgbe ya na ndị amụma Bel chọrọ ịmata chi nke bụ́ ezi Chineke

    • Mat. 7:7-11​—Jizọs gbara anyị ume ka anyị na-ekpechi ekpere anya, meekwa ka obi sie anyị ike na Jehova, Nna anyị hụrụ anyị n’anya, ga-aza anyị

Naanị ònye ka Ndị Kraịst kwesịrị ịna-ekpegara ekpere?

N’aha ònye ka anyị na-ekpe ekpere?

Olee ndị Jehova na-anụ ekpere ha?

Olee ndị Jehova na-anaghị anụ ekpere ha?

Ilu 15:29; 28:9; Aịza. 1:15; Maị. 3:4; Jems 4:3; 1 Pita 3:7

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Josh. 24:9, 10​—Jehova ekweghị ege Belam ntị maka na ihe ọ na-arịọ adabaghị n’uche Chineke

    • Aịza. 1:15-17​—Jehova jụrụ ige ntị n’ekpere ndị ohu ya n’ihi na ha na-eme ihu abụọ, ikpe ọbara makwara ha

Gịnị ka anyị na-ekwukarị ná ngwụcha ekpere anyị, maka gịnị?

Baịbụl ò kwuru na e nwere otu ụzọ anyị ga na-anọ ma anyị kpewe ekpere?

Gịnị na gịnị ka ndị na-efe Jehova nwere ike ikpe n’ekpere ma ha zukọta ife ya?

Ọrụ 4:23, 24; 12:5

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 1 Ihe 29:10-19​—Eze Devid nọ n’ihu ndị Izrel kpee ekpere mgbe ha nyechara onyinye a ga-eji rụọ ụlọ nsọ

    • Ọrụ 1:12-14​—Ndịozi Jizọs, ụmụnne Jizọs, Meri nne Jizọs, na ụfọdụ ụmụ nwaanyị ndị na-efe Chineke nọ n’ọnụ ụlọ dị n’elu na Jeruselem na-ekpe ekpere

Gịnị mere na onye na-ekpe ekpere ekwesịghị ibuliwe onwe ya elu ma ọ bụ chọwa ime ka a hụchata ya?

Ọ̀ dị mma ikpe ekpere tupu anyị eriwe nri?

Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-ekpegara nna anyị nke eluigwe ekpere?

Rom 12:12; Efe. 6:18; 1 Tesa. 5:17; 1 Pita 4:7

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Dan. 6:6-10​—Daniel onye amụma nọgidere na-ekpe ekpere n’ebe ndị mmadụ ga-ahụ ya n’agbanyeghị na e nwere ike igbu ya

    • Luk 18:1-8​—Jizọs mere ihe atụ banyere otu ọkàikpe nke kwetara imere otu nwaanyị ihe ọ rịọrọ ya n’ihi na nwaanyị ahụ nọgidere na-arịọ ya arịrịọ. Jizọs ji ihe atụ a gosi na nna anyị Jehova ga-aza ekpere anyị ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-arịọ ya ka o nyere anyị aka

Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke nụ ekpere anyị na-ekpe ka ọ gbaghara anyị mmehie?

2 Ihe 7:13, 14

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 2 Eze 22:11-13, 18-20​—Jehova meere Eze Josaya ebere maka na o wedara onwe ya ala, chọọkwa ime ihe dị Jehova mma

    • 2 Ihe 33:10-13​—Eze Manase wedara onwe ya ala ma rịọ Jehova mgbaghara. Jehova gbaghaara ya, ya abụrụkwa eze ọzọ

Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Jehova gbaghara anyị, gịnị ka anyị kwesịrị ime?

Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-agwa Chineke n’ekpere na anyị chọrọ ka uche ya mee?

Gịnị mere na ekpere anyị kwesịrị igosi na anyị nwere okwukwe ná Nna anyị nke eluigwe?

Gịnị na gịnị ka anyị nwere ike ikpe n’ekpere?

Ka e doo aha Chineke nsọ

Ka Alaeze Chineke bịa chịwa ụwa

Ka uche Jehova mee

Anyị nwere ike ịrịọ Jehova ka o nye anyị ihe ndị na-akpa anyị

Mgbaghara maka mmehie anyị

Anyị nwere ike rịọ Jehova ka o nyere anyị aka ka anyị ghara ime ihe ọjọọ

Anyị nwere ike ikpe ekpere kelee Chineke

Anyị nwere ike ịrịọ Chineke ka anyị mata uche ya, na-aghọta ihe, marakwa ihe

Ilu 2:3-6; Fil. 1:9; Jems 1:5

I nwekwara ike ịgụ Ọma 119:34

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 1 Eze 3:11, 12​—Obi dị Jehova ụtọ maka ihe Eze Solomọn rịọrọ ya, Jehova nyekwara ya ezigbo amamihe

Anyị nwere ike ịrịọ Chineke ka o nye anyị mmụọ nsọ

Anyị nwere ike ikpe ekpere maka ụmụnna anyị, ma ndị nke a na-akpagbu

Anyị nwere ike ikpe ekpere too Chineke

Ọma 86:12; Aịza. 25:1; Dan. 2:23

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Luk 10:21​—Jizọs nọ n’ihu ndị mmadụ too Nna ya maka na o mere ka ndị dị umeala n’obi ka ụmụaka mata eziokwu

    • Mkpu. 4:9-11​—Ndị mmụọ ozi na-asọpụrụ Jehova ma na-enye ya otuto kwesịịrị ya

Anyị nwere ike ịrịọ Jehova ka o mee ka ndị ọchịchị ghara igbochi anyị ịna-efe ya na ịna-ekwusa ozi ọma

Mat. 5:44; 1 Tim. 2:1, 2

I nwekwara ike ịgụ Jere. 29:7

Ọ̀ dị mma ikpe ekpere n’oge anyị na-eme baptizim?

Ọ̀ dị mma ikpe ekpere maka ndị na-anaghị eme nke ọma n’ọgbakọ?

Gịnị mere na ụmụ nwoke anaghị ekpuchi isi ha ma ha kpewe ekpere? Gịnị mekwaranụ ụmụ nwaanyị ji ekpuchi isi ha mgbe ụfọdụ ma ha kpewe ekpere?

Gịnị dị Chineke mkpa n’ekpere anyị karịa otú ogologo ya hà ma ọ bụ otú o si emetụ n’ahụ́?

Ákwá 3:41; Mat. 6:7

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 1 Eze 18:25-29, 36-39​—Mgbe Ịlaịja na ndị amụma Bel chọrọ ịmata chi nke bụ́ ezi Chineke, ndị amụma Bel kpegaara chi ha ekpere ọtụtụ awa, ma ọ zaghị ha

    • Ọrụ 19:32-41​—Ndị na-ekpere arụsị n’Efesọs nọ na-akpọku chi nwaanyị bụ́ Atemis ruo awa abụọ. Ma, naanị ihe mechara mee bụ na onyeisi obodo bịara gwa ha ka ha kwụsị ime mkpọtụ