Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ikwusa Ozi Ọma

Ikwusa Ozi Ọma

Gịnị mere ezigbo Ndị Kraịst niile ji agwa ndị ọzọ ihe ha kweere?

Olee otú ikwusa ozi ọma dịruru Jizọs mkpa?

Luk 8:1; Jọn 18:37

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Luk 4:42-44​—Jizọs kwuru na e zitere ya n’ụwa ka o kwusaa ozi ọma

    • Jọn 4:31-34​—Jizọs kwuru na ọrụ ikwusa ozi ọma dị ya ka nri

Ọ̀ bụ naanị ụmụ nwoke ndị na-eduzi ọgbakọ kwesịrị ịna-ekwusa ozi ọma?

Ọma 68:11; 148:12, 13; Ọrụ 2:17, 18

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 2 Eze 5:1-4, 13, 14, 17​—Otu nwatakịrị nwaanyị bụ́ onye Izrel gwara nwunye Neeman gbasara onye amụma Jehova bụ́ Ịlaịsha

    • Mat. 21:15, 16​—Mgbe ụmụntakịrị ndị nwoke nọ na-eto Jizọs n’ụlọ nsọ, ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ were iwe. Ma, Jizọs baara ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ ahụ mba

Olee otú Ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta si akụziri ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ otú e si ezi ozi ọma?

Olee otú Jehova na Jizọs si enyere anyị aka n’ọrụ ikwusa ozi ọma?

2 Kọr. 4:7; Fil. 4:13; 2 Tim. 4:17

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ọrụ 16:12, 22-24; 1 Tesa. 2:1, 2​—N’agbanyeghị na e mesiri Pọl na ndị ya na ha so na-ekwusa ozi ọma ike, Chineke nyeere ha aka ha ejiri obi ike na-ekwusa ozi ọma

    • 2 Kọr. 12:7-9​—N’agbanyeghị na Pọl onyeozi nwere nsogbu dị ka ‘ogwu na-adụ ya n’ahụ́,’ nke nwere ike ịbụ ọrịa ọ na-arịa, ọ kwụsịghị ikwusa ozi ọma n’ihi na Jehova nọ na-enye ya ike

Ònye ma ọ bụ gịnị na-eme ka Onye Kraịst ruo eruo ikwusa ozi ọma?

1 Kọr. 1:26-28; 2 Kọr. 3:5; 4:13

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jọn 7:15​—O juru ndị mmadụ anya otú Jizọs si mara ihe nke ukwuu n’agbanyeghị na ọ gaghị ụlọ akwụkwọ ndị Rabaị

    • Ọrụ 4:13​—E weere ndịozi Jizọs ka ndị nkịtị na-agụghị akwụkwọ. Ma, ha ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma n’atụghị egwu

Olee otú anyị si mara na Jehova chọrọ ka anyị kụziere ndị ọzọ otú ha ga-esi na-ekwusa ozi ọma ma na-akụzi ihe?

Mak 1:17; Luk 8:1; Efe. 4:11, 12

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Aịza. 50:4, 5​—Tupu Mezaya abịa n’ụwa, Jehova Chineke kụziiri ya ihe

    • Mat. 10:5-7​—Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o nwere ndidi ma kụziere ndị na-eso ụzọ ya otú ha ga-esi na-ekwusa ozi ọma

Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ọrụ ikwusa ozi ọma anya?

Olee otú obi na-adị anyị ma anyị na-ekwusa ozi ọma?

Gịnị na gịnị ka anyị na-ezi ndị mmadụ n’ozi ọma?

Gịnị mere Ndị Kraịst ji agba ozizi ụgha n’anwụ?

2 Kọr. 10:4, 5

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Mak 12:18-27​—Jizọs kọwaara ndị Sadusii ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ iji gosi na ha ekwesịghị ikwu na mbilite n’ọnwụ adịghị

    • Ọrụ 17:16, 17, 29, 30​—Pọl onyeozi kụziiri ndị Atens ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ iji gosi na ikpere arụsị adịghị mma

Olee otú anyị si ekwusa ozi ọma?

Gịnị mere anyị ji ekwusa ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị?

Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-enwe ndidi ma ghara ịda mbà mgbe anyị na-ezi ozi ọma?

Olee uru ozi ọma anyị na-ekwusa na-abara ndị nụrụ ya?

Gịnị mere na Onye Kraịst kwesịrị ịdị njikere ikwusa ozi ọma oge ọ bụla?

1 Kọr. 9:23; 1 Tim. 2:4; 1 Pita 3:15

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jọn 4:6, 7, 13, 14​—N’agbanyeghị na ike gwụrụ Jizọs, o ziri nwaanyị Sameria bịara isere mmiri ozi ọma

    • Fil. 1:12-14​—Mgbe Pọl onyeozi nọ n’ụlọ mkpọrọ, o jidị ohere ọ bụla o nwere kwusaa ozi ọma, gbaakwa ndị ọzọ ume

Ànyị kwesịrị ịtụ anya na onye ọ bụla ga-ege anyị ntị?

Jọn 10:25, 26; 15:18-20; Ọrụ 28:23-28

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jere. 7:23-26​—Jehova si n’ọnụ Jeremaya kwuo otú ndị ya si jụ ịge ndị amụma ya ntị ugboro ugboro

    • Mat. 13:10-16​—Jizọs kwuru na ọtụtụ ndị agaghị anabata ozi ọma anyị na-ezi ha otú ahụ ọtụtụ ndị na-anabataghị ozi ọma Aịzaya ziri ha

Gịnị mere na ọ naghị eju anyị anya na ọtụtụ ndị anaghị enwe efe ige ozi ọma?

Olee otú anyị si mara na ụfọdụ ga-ege ntị ma nabata ozi ọma ná mbido ma e mechaa ha akwụsị ịnabata ya?

Olee ihe ndị ga-enyere anyị aka ka ọ ghara iju anyị anya ma ụfọdụ megidewe anyị maka na anyị na-ekwusa ozi ọma?

Gịnị ka anyị na-eme ma ndị mmadụ chọọ ịkwụsị anyị izi ozi ọma?

Gịnị mere obi ga-eji sie anyị ike na ụfọdụ ga-anabata ozi ọma?

Olee ihe Chineke chọrọ n’aka ndị na-ekwusa ozi ọma?

Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-ekwusara mmadụ niile ozi ọma n’agbanyeghị okpukpe ha na-ekpe, agbụrụ ha si ma ọ bụ obodo ha si?

È nwere ụbọchị a na-ekwesịghị izi ozi ọma, dị ka n’ụbọchị izu ike?

Olee ihe atụ gosiri na anyị kwesịrị ịna-ezi mmadụ niile ozi ọma, ọ bụrụgodị na ha nwere Baịbụl ma nwee okpukpe ha na-ekpe?