Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nchegharị

Nchegharị

Gịnị mere mmadụ niile ji kwesị ichegharị ná mmehie ha ma rịọ Jehova Chineke mgbaghara?

Rom 3:23; 5:12; 1 Jọn 1:8

I nwekwara ike ịgụ Ọrụ 26:20

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Luk 18:9-14​—Jizọs mere ihe atụ iji gosi na anyị kwesịrị ikwupụta mmehie anyị ma rịọ Chineke ka o nyere anyị aka

    • Rom 7:15-25​—N’agbanyeghị na Pọl bụ onyeozi nwere ezigbo okwukwe, o wutere ya na ime ihe ọjọọ na-agụ ya agụụ oge ụfọdụ

Gịnị ka Baịbụl kwuru banyere otú obi na-adị Jehova ma ndị na-eme ihe ọjọọ chegharịa?

Ezik. 33:11; Rom 2:4; 2 Pita 3:9

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Luk 15:1-10​—Jizọs mere ihe atụ iji gosi na Jehova na ndị mmụọ ozi na-aṅụrị ọṅụ ma onye mmehie chegharịa

    • Luk 19:1-10​—Mgbe Zakịọs, onye ọnaụtụ nke na-apụnara ndị mmadụ ihe, chegharịrị ma gbanwee, a gbaghaara ya

Olee otú anyị si egosi na anyị echegharịala n’eziokwu?

Olee otú ịmata eziokwu dị na Baịbụl nke ọma si enyere onye ji obi ya niile chegharịa aka?

Rom 12:2; Kọl. 3:9, 10; 2 Tim. 2:25

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ọrụ 17:29-31​—Pọl onyeozi gwara ndị Atens na ọ bụ amaghị ihe mere ndị mmadu ji ekpere arụsị, gbaakwa ha ume ka ha chegharịa

    • 1 Tim. 1:12-15​—Tupu Pọl amara eziokwu gbasara Jizọs Kraịst, o mere ọtụtụ ihe jọgburu onwe ha n’ihi na ọ maghị ihe mgbe ahụ

Olee otú nchegharị dịruru ná mkpa?

Gịnị mere obi ga-eji sie anyị ike na ọ bụrụ na anyị echegharịa, Jehova ga-agbaghara anyị ọ bụrụgodị na anyị mehiere ọtụtụ ugboro?

Olee otú Jehova si emeso ndị kwupụtara mmehie ha ma gbanwee àgwà ha?

Ọma 32:5; Ilu 28:13; 1 Jọn 1:9

Gụọkwa isiokwu bụ́ “Ebere

Olee otú anyị si mara na mmadụ ichegharị abụghị naanị onye ahụ ikwu na ihe o mere wutere ya?

2 Ihe 7:14; Ilu 28:13; Ezik. 18:30, 31; 33:14-16; Mat. 3:8; Ọrụ 3:19; 26:20

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 2 Ihe 33:1-6, 10-16​—N’agbanyeghị na Eze Manase mere ihe ọjọọ ruo ogologo oge, o mere ihe ndị gosiri na o chegharịrị n’eziokwu. O weturu onwe ya ala, na-ekpechi ekpere anya, gbanweekwa àgwà ya

    • Ọma 32:1-6; 51:1-4, 17​—Eze Devid gosiri na o chegharịrị mgbe o mehiere Jehova. Otú o si mee ya bụ na ihe o mere wutere ya nke ukwuu, ya ekwupụta mmehie ya, rịọkwa Jehova mgbaghara

Gịnị mere anyị ga-eji gbaghara ndị mejọrọ anyị ma ha chegharịa?