Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Idozi Esemokwu

Idozi Esemokwu

Mmadụ kpasuo anyị iwe, gịnị mere anyị ga-eji zere iwewe iwe ma ọ bụ imegwara onye ahụ?

Ilu 20:22; 24:29; Rom 12:17, 18; Jems 1:19, 20; 1 Pita 3:8, 9

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 1 Sam. 25:9-13, 23-35​—Mgbe Nebal kparịrị Devid na ndị agha ya ma jụ inye ha ihe ha rịọrọ ya, ezigbo iwe were Devid, ya achọọ igbu Nebal na ụmụ nwoke niile bi n’ụlọ ya. Ma, ezigbo ndụmọdụ Abigel nyere Devid mere ka ikpe ọbara ghara ịma Devid

    • Ilu 24:17-20​—Eze Solomọn si n’ike mmụọ nsọ gwa ndị Chineke na Jehova achọghị ka anyị na-aṅụrị ọṅụ mgbe ndị iro anyị na-ata ahụhụ. Obi sikwara anyị ike na Jehova ga-ekpe ndị ajọ omume ikpe

Ọ bụrụ na Onye Kraịst na ibe ya enwee nghọtahie, ò kwesịrị ịkwụsị ịtụpụrụ ya ọnụ ma ọ bụ buwere ya iwe n’obi?

Lev. 19:17, 18; 1 Kọr. 13:4, 5; Efe. 4:26

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Mat. 5:23, 24​—Jizọs kwuru na anyị kwesịrị ịgba mbọ dozie ihe na-esere anyị na nwanna anyị

Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma mmadụ kpasuo anyị inwe?

Gịnị mere anyị kwesịrị iji gbaghara ndị mejọrọ anyị ma ha chegharịa n’eziokwu, ọ bụrụgodị na ha mejọrọ anyị ọtụtụ ugboro?

Ọ bụrụ na ihe nwanna mere anyị abụghị ihe anyị nwere ike ileghara anya, dị ka ọ bụrụ na o kwutọrọ anyị ma ọ bụ gwuo anyị wayo, ònye kwesịrị ịgwa ya okwu, maka gịnịkwa?

Mat. 18:15

I nwekwara ike ịgụ Jems 5:20

Ọ bụrụ na onye kwutọrọ anyị ma ọ bụ gwuo anyị wayo ekweghị echegharị mgbe anyị gwachara ya okwu, gịnị ka anyị kwesịrị ime?