Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mmehie

Mmehie

Gịnị bụ mmehie, gịnịkwa mere o ji akpa anyị niile aka?

Olee otú Baịbụl si mee ka obi sie anyị ike na anyị ga-emerili agụụ ime ihe ọjọọ na-agụ anyị?

Rom 6:12-14

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 2 Sam. 11:2-5, 14, 15, 26, 27; 12:1-13 ​—Eze Devid mere mmehie ndị dị oké njọ. A tara ya ezigbo ahụhụ maka ya. O mekwara ihe gosiri na o chegharịala

    • Rom 7:15-24​—Pọl onyeozi nwere okwukwe, jirikwa obi ya niile na-efe Chineke. Ma, o kwuru na ọ gbasiri mbọ ike ka o merie ihe ọjọọ na-abata ya n’obi

Gịnị mere ọtụtụ ndị ji eme mmehie?

Gịnị mere mmadụ ịkpachara anya na-eme ihe ọ ma na ọ dịghị mma ji jọgbuo onwe ya?

Olee ihe Setan nwere ike iji nwaa ndị ohu Chineke?

Ilu 1:10, 11, 15; Mat. 5:28; Jems 1:14, 15

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jen. 3:1-6​—Setan ji agwọ mee ka Iv chọwa ihe ga-abara naanị onwe ya uru ma dị anyaukwu. Ihe a mekwara ka ọ gharazie ịtụkwasị Jehova obi

    • Ilu 7:6-10, 21-23​—Eze Solomọn kọọrọ anyị otú otu nwa okorobịa na-enweghị uche si kwe ka otu nwaanyị na-akwa iko rata ya

Gịnị ka anyị ga-eme ka Setan ghara ịnwata anyị?

Efe. 4:27; 6:10-18; Jems 4:7, 8

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ilu 5:1-14​—Eze Solomọn si n’ike mmụọ nsọ gwa anyị okwu otú nna si agwa nwa ya. Ọ gwara anyị ihe mere anyị kwesịrị iji gbaara ịkwa iko ọsọ nakwa otú anyị ga-esi gbaara ya ọsọ

    • Mat. 4:1-11​—Jizọs kwuru ihe dị n’Okwu Chineke mgbe Setan na-anwa ya, si otú ahụ gosi anyị otú kacha mma isi merie ọnwụnwa Setan

Olee ụfọdụ mmehie ndị dị oké njọ Ndị Kraịst kwesịrị izere?

Gụọ isiokwu bụ́ “Omume Ndị Na-adịghị Mma

Ikwupụta mmehie

Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịna-ekpuchi mmehie anyị?

Ònye ka anyị ga-ekwupụtara mmehie anyị?

Olee onye na-arịọ Jehova arịrịọ maka anyị, si otú ahụ “na-enyere anyị aka”?

Mmadụ ò nwere ike isi n’ihe ndị ọ na-eme gosi na ya echegharịala?

Ọrụ 26:20; Jems 4:8-10

Gụọkwa isiokwu bụ́ “Nchegharị

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ọpụ. 22:1-12​—Iwu Mosis kwuru na onye ohi ga-akwụ onye o zuru ohi ụgwọ ihe ya o zuuru

    • Luk 19:8, 9​—Zakịọs bụ́ onyeisi ndị ọnaụtụ kwụsịrị ihe ọjọọ ndị ọ na-eme, kwụghachikwa ndị mmadụ ihe ndị ọ pụnaara ha. O si otú a gosi na ya echegharịala

Gịnị mere obi kwesịrị iji sie anyị ike na Jehova ga-agbaghara anyị?

Gụọ isiokwu bụ́ “Ịgbaghara Mmehie

Ole ndị ka Jehova gwara ka ha na-enyere ndị mere mmehie dị oké njọ aka ma na-echebe ọgbakọ?

Jems 5:14, 15

I nwekwara ike ịgụ Ọrụ 20:28; Gal. 6:1

Olee otú mmehie dị oké njọ mmadụ mere nwere ike isi gbasa ndị ezinụlọ ha ma ọ bụ ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ?

Hib. 12:15, 16

I nwekwara ike ịgụ Diut. 29:18

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Josh. 7:1-13, 20-26​—Ihe ọjọọ Ekan mere nakwa mbọ ọ gbara ikpuchi ya kpataara ndị Izrel niile nnukwu nsogbu

    • Jona 1:1-16​—Ndị niile ha na Jona nọ n’ụgbọ mmiri gaara anwụ maka na ọ chọghị ime ihe Jehova gwara ya mee

    • 1 Kọr. 5:1-7​—Pọl onyeozi kwuru na mmehie jọgburu onwe ya onye nọ n’ọgbakọ dị na Kọrịnt mere kpataara ọgbakọ ahụ nsogbu

Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịhapụ ịga ka ndị okenye nyere anyị aka maka na anyị na-atụ ụjọ na ha ga-adọ anyị aka ná ntị?

Gịnị mere obi kwesịrị iji sie anyị ike na Chineke agbagharala anyị mmehie anyị mere n’oge gara aga kama obi ịnọ na-ajọ anyị njọ maka ya?

Gụọ isiokwu bụ́ “Ịgbaghara Mmehie

Anyị mata na mmadụ mere mmehie dị oké njọ, gịnị mere anyị kwesịrị iji gbaa mbọ hụ na onye ahụ gara gwa ndị okenye gbasara ya?

Lev. 5:1

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Diut. 13:6-9; 21:18-20​—Iwu Mosis kwuru na mmadụ kwesịrị ịgwa ndị okenye Izrel mmehie dị oké njọ onye ọzọ mere ọ bụrụgodị na onye ahụ bụ onye ezinụlọ ya ma ọ bụ onye ọzọ ya na ya dị ná mma