Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Alụghị Di ma Ọ Bụ Nwunye

Alụghị Di ma Ọ Bụ Nwunye

Gịnị mere a ga-eji kwuo na alụghị di ma o bụ nwunye bụ onyinye?

Gịnị mere na ọ dịghị mma inyewe Onye Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye nsogbu ka ọ lụọ?

1 Kọr. 7:28, 32-35; 1 Tesa. 4:11

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Rom 14:10-12​—Pọl onyeozi kwuru ihe mere na anyị ekwesịghị ikpe nwanna anyị ikpe

    • 1 Kọr. 9:3-5​—Pọl onyeozi nweere onwe ya ịlụ nwaanyị. Ma n’ihi na ọ lụghị nwaanyị, o nwere ohere jekwuoro Jehova ozi

Ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye hà kwesịrị iche na ha agaghị enweli obi ụtọ ma ọ bụrụ na ha alụghị?

1 Kọr. 7:8

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ikpe 11:30-40​—Ada Jefta alụghị di, ndụ ya nwekwara isi maka na o ji ya jee ozi n’ụlọikwuu

    • Ọrụ 20:35​—Jizọs Kraịst alụghị nwaanyị, ma ihe o kwuru gosiri na obi dị ya ụtọ maka ihe o meere ndị ozọ

    • 1 Tesa. 1:2-9; 2:12​—Pọl onyeozi alụghị nwaanyị. O kwuru otú ozi o jere si mee ya obi ụtọ n’ihi na o nyeere ndị mmadụ aka ka ha mata Jehova

Gịnị mere ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ji kwesị ịna-akpa àgwà ọma otú ndị ọzọ na-efe Jehova na-akpa?

1 Kọr. 6:18; Gal. 5:19-21; Efe. 5:3, 4

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ilu 7:7-23​—Eze Solomọn kwuru nsogbu otu nwa okorobịa banyere na ya mgbe o kwere ka nwaanyị akwụna rafuo ya

    • Abụ Solo. 4:12; 8:8-10​—E toro nwa agbọghọ Shulem maka na o kweghị emebi iwu Jehova gbasara alụmdi na nwunye

Olee mgbe ọ ga-adị mma ka onye na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye chewe echiche ịlụ?

1 Kọr. 7:9, 36

I nwekwara ike ịgụ 1 Tesa. 4:4, 5