Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Amamihe

Amamihe

Gịnị ka mmadụ kwesịrị ime ma ọ chọọ inweta ezigbo amamihe?

Olee ebe anyị ga-esi nweta ezigbo amamihe?

Ànyị kwesịrị ịrịọ Chineke n’ekpere maka amamihe?

Kọl. 1:9; Jems 1:5

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 2 Ihe 1:8-12​—Mgbe Eze Solomọn malitere ịchị, ọ rịọrọ Chineke ka o nye ya amamihe ọ ga-eji chịa nke ọma, Jehova nyekwara ya amamihe

    • Ilu 2:1-5​—E ji amamihe na nghọta tụnyere akụ̀ ndị zoro ezo anyị kwesịrị ịna-achọsi ike. Jehova na-agọzikwa mbọ anyị na-agba ịchọta ha

Olee otú Jehova si enye anyị amamihe?

Aịza. 11:2; 1 Kọr. 1:24, 30; 2:13; Efe. 1:17; Kọl. 2:2, 3

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ilu 8:1-3, 22-31​—A kọwara amamihe ka à ga-si na ọ bụ mmadụ. Ihe ndị a kọwara gbasara ya ka e ji mara Jizọs, bụ́ onye Jehova kere tupu o kee ihe ndị ọzọ niile

    • Mat. 13:51-54​—Ọtụtụ ndị na-ege Jizọs ntị aghọtaghị otú onye ha ma kemgbe ọ bụ nwata ga-esi mara ihe otú ahụ

Olee otú anyị si egosi na anyị nwere amamihe si n’aka Chineke?

Olee otú amamihe si enyere anyị aka ma na-echebe anyị?

Olee uru amamihe si n’aka Chineke bara?

Ilu 3:13, 14; 8:11

I nwekwara ike ịgụ Job 28:18

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Job 28:12, 15-19​—N’agbanyeghị na Job nọ na-ata nnukwu ahụhụ, o kwuru ihe gosiri na o ji amamihe si n’aka Chineke kpọrọ ihe

    • Ọma 19:7-9​—Eze Devid kwuru na iwu Jehova na ihe Jehova na-echetara anyị nwedịrị ike ime ka onye na-amaghị ihe mara ihe

Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịna-ege amamihe ụwa, bụ́ nke si n’aka ndị na-eleghara Chineke anya?