Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọrụ

Ọrụ

Gịnị jikọrọ ọrụ na obi ụtọ?

Olee uru ọ bara ịmụta ezigbo aka ọrụ?

Ilu 22:29

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 1 Sam. 16:16-23​—Ihe e ji mara Devid mgbe ọ na-eto eto bụ ịkpọ ụbọ akwara. Ụbọ a ọ na-akpọ baara eze Izrel uru maka na o mere ka obi jụrụ ya mgbe obi na-ezughị ya ike

    • 2 Ihe 2:13, 14​—Haịram-ebaị bụ omenkà aka siri ike. N’ihi ya, Eze Solomọn kpọrọ ya ka ọ rụọrọ ya ọrụ mgbe a na-arụ ụlọ nsọ

Gịnị mere ndị ohu Jehova ji agba mbọ ịna-arụsi ọrụ ike?

Efe. 4:28; Kọl. 3:23

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jen. 24:10-21​—Ribeka na-arụsi ọrụ ike, na-enyekwara mmadụ aka. Ọ bụ ya mere o ji meere ohu Ebreham ihe ọ rịọrọ ya, meedị karịa

    • Fil. 2:19-23​—Pọl nyere nwa okorobịa bụ́ Timoti ọrụ dị ezigbo mkpa maka na Timoti dị umeala n’obi, dịkwa njikere ịrụsi ọrụ ike

Gịnị mere na ndị na-efe Chineke anaghị adị umengwụ?

Ilu 13:4; 18:9; 21:25, 26; Ekli. 10:18

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ilu 6:6-11​—Eze Solomọn ji ndanda kụzie gbasara ịrụsi ọrụ ike na izere umengwụ

Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-arụsi ọrụ ike iji na-egbo mkpa anyị?

Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-agbasi mbọ ike ịna-egboro ndị ezinụlọ anyị mkpa ha?

1 Tim. 5:8

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Rut 1:16, 17; 2:2, 3, 6, 7, 17, 18​—Rut bụ́ nwaanyị di ya nwụrụ rụsiri ọrụ ike iji lekọta nne di ya bụ́ Neomi

    • Mat. 15:4-9​—Jizọs katọrọ ndị ji maka na ha na-ejere Chineke ozi jụ ịna-elekọta nne na nna ha

Gịnị mere Ndị Kraịst ji kwesị iji ihe ha na-arụta na-enyere ndị ọzọ aka?

Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ego anyị na-arụta n’ọrụ anyị anya?

Olee otú anyị si mara na Jehova chọrọ ka anyị na-arụ ọrụ anyị nke ọma ma na-egbo mkpa anyị?

Mat. 6:25, 30-32; Luk 11:2, 3; 2 Kọr. 9:10

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jen. 31:3-13​—Leban mesiri Jekọb, bụ́ ọgọ ya nwoke nakwa onye na-arụrụ ya ọrụ, ike. Ma, Jehova hụrụ na Jekọb na-arụsi ọrụ ike wee gọzie ya

    • Jen. 39:1-6, 20-23​—Jehova gọziri ọrụ Josef na-arụ, ma mgbe ọ na-agba ohu n’ụlọ Pọtịfa ma mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ

Gịnị mere na ọrụ anyị ji akpa afọ anyị ekwesịghị ịdị anyị mkpa karịa ofufe Chineke?

Ọma 39:5-7; Mat. 6:33; Jọn 6:27

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Luk 12:15-21​—Jizọs mere ihe atụ iji gosi na ndị na-eche na ịrụ ọrụ iji kpata ego dị mkpa karịa ịbịaru Chineke nso bụ ndị nzuzu

    • 1 Tim. 6:17-19​—Pọl onyeozi gwara ụmụnna ndị bara ọgaranya ka ha ghara ileda ndị ọzọ anya, gbaakwa ha ume ka ha “na-arụ ọtụtụ ọrụ ọma”

Olee ihe ndị Baịbụl kwuru ndị ga-enyere anyị aka ikpebi ụdị ọrụ anyị kwesịrị ịrụ?

Ịrụrụ Jehova ọrụ

Olee ọrụ kacha mkpa Ndị Kraịst kwesịrị ịna-arụ?

Gịnị mere ime ike anyị niile n’ozi Jehova ji anụ anyị ọkụ n’obi?

Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịna-eji ihe ndị ọzọ na-eme n’ozi Jehova atụnyere ihe anyị na-eme n’ozi ya?

Gal. 6:3-5

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Mat. 25:14, 15​—Ihe atụ Jizọs mere na-egosi na ọ naghị atụ anya na ndị niile na-eso ụzọ ya ga na-eme otu ihe n’ozi ya

    • Luk 21:2-4​—Jizọs kwuru ihe gosiri na o ji obere onyinye nwaanyị di ya nwụrụ, onye dakwara ogbenye, nyere kpọrọ nnukwu ihe

Olee ebe anyị si enweta ike anyị ji arụ ọrụ e nyere anyị n’ozi Jehova?

2 Kọr. 4:7; Efe. 3:20, 21; Fil. 4:13

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 2 Tim. 4:17​—Pọl onyeozi kwuru na Chineke nyere ya ike ime ihe mgbe ọ na-adịghị ike

Gịnị mere anyị ji enwe obi ụtọ ma anyị na-agbasi mbọ ike n’ozi Jehova?