Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ofufe

Ofufe

Naanị ònye ka anyị kwesịrị ife ofufe?

Ọpụ. 34:14; Diut. 5:8-10; Aịza. 42:8

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Mat. 4:8-10​—Setan gwara Jizọs na ya ga-enye ya alaeze niile nke ụwa ma o fee ya ofufe. Jizọs ekweghị eme ihe Setan kwuru, kama o kpebisiri ike ife naanị Jehova

    • Mkpu. 19:9, 10​—Otu mmụọ ozi dị ike ekweghị ka Jọn onyeozi fee ya ofufe

Olee otú Jehova chọrọ ka e si na-efe ya?

Jọn 4:24; Jems 1:26, 27

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Aịza. 1:10-17​—Jehova anaghị anabata ofufe ndị jụrụ irubere ya isi na-efe ya iji mezuo iwu

    • Mat. 15:1-11​—Ihe Jizọs kwuru gosiri na Jehova anaghị anabata ofufe ndị na-efe ya n’elu ọnụ, ndị na-eso ọdịnala ụmụ mmadụ kama iso iwu Chineke

Mgbe ọ bụla o kwere omume, olee ndị anyị na ha kwesịrị ịna-efekọ Jehova?

Hib. 10:24, 25

I nwekwara ike ịgụ Ọma 133:1-3

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ọrụ 2:40-42​—N’oge ndịozi Jizọs, Ndị Kraịst na-ezukọta ka ha kpee ekpere, soro ibe ha nọrịa, ma mụkọọ Okwu Chineke nke e ji ike mmụọ nsọ dee ọnụ

    • 1 Kọr. 14:26-40​—Pọl onyeozi kwuru na e kwesịrị ịhazi ọmụmụ ihe Ndị Kraịst ahazi nakwa na o kwesịrị ịgba ndị bịara ya ume. Ihe a ga-eme ka mmadụ niile nwee ike ịmụta ihe a na-akụzi, ghọtakwa ya

Gịnị ka anyị kwesịrị ime ka anyị jide n’aka na Jehova na-anabata ofufe anyị?

Mat. 7:21-24; 1 Jọn 2:17; 5:3

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Hib. 11:6​—Pọl onyeozi kwuru na anyị kwesịrị inwe okwukwe ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Jehova nabata ofufe anyị

    • Jems 2:14-17, 24-26​—Jems, nwanne Jizọs, kwuru na anyị ga-emerịrị ihe ga-egosi na anyị nwere okwukwe. Okwukwe anyị kwesịrị ime ka anyị na-eme ihe dị mma