Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya


Ịmụ Baịbụl otú ga-akacha baara gị uru

Ịmụ Baịbụl otú ga-akacha baara gị uru

Gwa mmadụ ka gị na ya mụwa ya: Gwa onye nyere gị akwụkwọ a ka gị na ya mụwa ya, ma ọ bụkwanụ gị ejiri adres Ịntanet anyị bụ́ jw.org gwa anyị na ị chọrọ ka gị na mmadụ mụwa akwụkwọ a.

NKEBI NKE MBỤ

Gụọ paragraf nke ọ bụla na ajụjụ dị n’elu ya (A) nakwa amaokwu Baịbụl niile (B) mere ka ihe a na-ekwu doo anya. Burukwa n’obi na e nwere amaokwu Baịbụl ndị e dere “gụọ.”

NKEBI NKE ABỤỌ

Ihe mbụ e kwuru (CH) n’ebe a kpọrọ Mụtakwuo Ihe na-agwa anyị ihe ndị anyị ga-amụta. Isiokwu nta ndị dị na ya (D) kwuru isi ihe ndị a na-ekwu. Gụọ amaokwu Baịbụl niile, zaa ajụjụ niile, leekwa vidio niile (E).

Leruo foto niile anya, chebakwara okwu ndị e ji kọwaa ha echiche (F), cheekwa gbasara ihe i nwere ike ịgwa mmadụ ma o kwuo ihe dị n’ebe a kpọrọ Ụfọdụ Na-asị (G).

NKEBI NKE ATỌ

Ọ bụ Nchịkọta na Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ (GB) ka e ji pịachie isiokwu nke ọ bụla. Unu mụchaa isiokwu nke ọ bụla, dee ụbọchị unu mụchara ya. N’ebe a kpọrọ Ihe ị ga-agba mbọ mee, (GH) e dere ihe ị ga-eme ga-enyekwuru gị aka. N’ebe a kpọrọ Ihe Ị Ga-elebakwu Anya, (GW) ị ga-ahụ ihe ndị ọzọ i nwere ike ịgụ ma ọ bụ lee.

Otú ị ga-esi achọta amaokwu Baịbụl

Otú ị ga-esi ama ebe ị ga-asapeta na Baịbụl bụ na ị ga-ahụ akwụkwọ Baịbụl (A), isi ya (B), na amaokwu ya (CH). Dị ka ihe atụ, ị hụ Jọn 17:3, ọ pụtara akwụkwọ Jọn, isi 17, amaokwu 3.