Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akwụkwọ Ozi Si n’Aka Òtù Na-achị Isi

Akwụkwọ Ozi Si n’Aka Òtù Na-achị Isi

Ezigbo Ụmụnna Anyị:

Otú anyị si hụ Chineke na ndị mmadụ n’anya na-eme ka anyị ‘gaa mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Na-eme ha baptizim.’ (Mat. 28:19, 20; Mak 12:28-31) Ezigbo ịhụnanya na-akpa ike. O nwere ike iru ndị mmadụ n’obi, ya bụ, ndị “na-akpa àgwà otú na-egosi na ha chọrọ inweta ndụ ebighị ebi.”​—Ọrụ 13:48.

N’oge gara aga, mkpa anyị na-abụ iburu ihe anyị ga-agwa mmadụ n’isi nakwa inye ndị mmadụ akwụkwọ. Ugbu a, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ka otú anyị si agwa ndị mmadụ okwu na-akakwu mma. Anyị chọrọ ịna-egosi ndị ọzọ na anyị hụrụ ha n’anya. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịna-eji isiokwu ndị na-amasị ha ezi ha ozi ọma. Ọ pụtara na anyị ga-adị njikere ịgbanwe ihe ụfọdụ, na-echebakwara ihe bụ́ mkpa onye nke ọ bụla na ihe na-amasị ya echiche nke ọma. Olee otú akwụkwọ a ga-esi nyere anyị aka ime ya?

Ihe dị n’akwụkwọ a bụ ihe ọmụmụ iri na abụọ na-akụziri anyị àgwà ndị anyị kwesịrị ịmụta iji na-egosi ndị ọzọ na anyị hụrụ ha n’anya ma na-eme ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ihe ọmụmụ nke ọ bụla na-akọwa otu àgwà Jizọs ma ọ bụ Onye Kraịst n’oge ndịozi kpara n’ozi ọma. Ihe mere e ji wepụta akwụkwọ a abụghị ka anyị buru ihe anyị na ndị mmadụ ga-ekwurịta n’isi, kama ọ bụ ka anyị chọọ ụzọ ndị anyị ga-esi na-egosi ndị ọzọ na anyị hụrụ ha n’anya. N’agbanyeghị na anyị kwesịrị ịna-akpa nke ọ bụla n’ime àgwà ndị ahụ n’ụzọ niile anyị si ekwusa ozi ọma, anyị ga-ahụ otú àgwà ụfọdụ si dị mkpa karịchaa mgbe anyị na-amalite mkparịta ụka, mgbe anyị gara nletaghachi, ma ọ bụ mgbe anyị na-amụrụ mmadụ Baịbụl.

Ka ị na-amụ ihe ọmụmụ nke ọ bụla, chee nke ọma otú i nwere ike isi kpaa àgwà ahụ mgbe ị na-agwa ndị bi n’ebe unu bi okwu. Gbalịsie ike ịhụkwu Jehova na ndị mmadụ n’anya. Ịhụnanya ahụ ga-enyere gị aka ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs karịa otú ọ bụla i nwere ike isi ezi ha ozi ọma.

Obi dị anyị ụtọ na anyị na unu ji otu obi na-arụkọ ọrụ. Ọ bụ nnukwu ihe ọma meere anyị. (Zef. 3:9) Ka Jehova gọzie unu mmaji kwuru mmaji ka unu na-ahụ ndị mmadụ n’anya ma na-eme ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs.

Anyị bụ ụmụnna unu,

Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova