Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ỊMALITE MKPARỊTA ỤKA

IHE ỌMỤMỤ NKE 1

Kwuo Ihe Ga-amasị Ndị Ọzọ

Kwuo Ihe Ga-amasị Ndị Ọzọ

Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: ‘Ịhụnanya anaghị achọ ihe ga-abara naanị ya uru.’​—1 Kọr. 13:4, 5.

Ihe Jizọs Mere

1. Lee VIDIO, ma ọ bụ gị agụọ Jọn 4:6-9. Zazie ajụjụ ndị a:

  1.    Gịnị ka Jizọs chọpụtara gbasara nwaanyị ahụ tupu ya akpanyewara ya ụka?

  2.   Jizọs sịrị ya: “Nye m mmiri ka m ṅụọ.” Gịnị mere otú ahụ o si malite ji bụrụ otú dị mma isi malite mkparịta ụka?

Gịnị Ka Anyị Na-amụta n’Aka Jizọs?

2. Anyị na mmadụ nwere ike ịkparịta ụka nke ọma ma ọ bụrụ na anyị ejiri isiokwu masịrị ya malite.

Na-eme Ka Jizọs

3. Na-agbanwe otú i si ezi ozi ọma. Asịla na ị ga-ejirịrị isiokwu kwadebere malite ịgwa mmadụ okwu. Jiri ihe ndị mmadụ na-eche banyere ya taa malite mkparịta ụka. Jụọ onwe gị, sị:

  1.    ‘Gịnị bụ okwu a kpụ n’ọnụ taa?’

  2.   ‘Gịnị ka ndị agbata obi m, ndị ọrụ ibe m, ma ọ bụ ụmụ klas m na-ekwu gbasara ya?’

4. Na-eleru anya. Jụọ onwe gị, sị:

  1.   a. ‘Gịnị ka onye ahụ na-eme n’oge m hụrụ ya? Gịnị ka o nwere ike ịna-eche gbasara ya?’

  2.  b. ‘Gịnị ka uwe o yi, otú ọ dị n’anya, ma ọ bụ otú ụlọ ya dị na-egosi m gbasara ihe o kweere ma ọ bụ omenala ya?’

  3.  ch. ‘Oge a ọ̀ bụ oge dị mma ịgwa onye ahụ okwu?’

5. Gee ntị.

  1.    Ekwula ọtụtụ okwu.

  2.   Gbaa onye ahụ ume ka o kwuo obi ya. Mgbe ọ bụla ọ dabara adaba, jụọ ya ajụjụ.