ỊMALITE MKPARỊTA ỤKA
IHE ỌMỤMỤ NKE 2
Malite Ya Ka Mkparịta Ụka Nkịtị
Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: ‘Okwu e kwuru mgbe kwesịrị ekwesị na-adị ezigbo mma.’—Ilu 15:23.
Ihe Filip Mere
1. Lee VIDIO, ma ọ bụ gị agụọ Ọrụ Ndịozi 8:30, 31. Zazie ajụjụ ndị a:
Gịnị Ka Anyị Na-amụta n’Aka Filip?
2. Ọ bụrụ na anyị amalite ịkpanyere mmadụ ụka kama iziwe ya ozi ọma ozugbo anyị hụrụ ya, o nwere ike ime ka obi ruo ya ala, ya adịkwa njikere ige anyị ntị ma anyị ziwe ya ozi ọma.
Na-eme Ka Filip
3. Na-eleru anya ala. Otú ihu mmadụ dị ma ọ bụ otú o si emegharị ahụ́ nwere ike ime ka ị mata ọtụtụ ihe gbasara ya. Onye ahụ ò yiri onye nwere ike ige gị ntị? I nwere ike ịmalite ịgwa ya gbasara Baịbụl ma ị jụọ ya, sị: “Ị̀ ma na . . . ?” Ọ bụrụ na mmadụ achọghị ikwusara gị okwu, amanyela ya.
4. Na-enwe ndidi. Echela na ị ga-amalite ozugbo kwuwe gbasara Baịbụl. Chere ruo oge dabara adaba ị ga-eji gwawa onye ahụ gbasara Baịbụl. Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịbụ n’oge ọzọ gị na ya ga-ekwurịta ka ị ga-agwa ya gbasara Baịbụl.
5. Dịrị njikere ịgbanwe ihe ị chọrọ ịgwa ya. Mgbe ụfọdụ, onye gị na ya na-akparịta ụka nwere ike ikwuwe ihe ị na-atụghị anya ya. N’ihi ya, dịrị njikere ịgwa ya eziokwu Baịbụl ga-abara ya uru, ọ bụrụgodị na ọ bụghị ihe i bubu n’obi iji ezi ya ozi ọma.