ỊMALITE MKPARỊTA ỤKA
IHE ỌMỤMỤ NKE 3
Dịrị Obiọma
Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: ‘Ịhụnanya dị obiọma.’—1 Kọr. 13:4.
Ihe Jizọs Mere
1. Lee VIDIO, ma ọ bụ gị agụọ Jọn 9:1-7. Zazie ajụjụ ndị a:
-
Ihe Jizọs bu ụzọ mee ọ̀ bụ ịgwọ onye ìsì ahụ, ka ọ̀ bụ izi ya ozi ọma?—I nwere ike ịgụ Jọn 9:35-38.
Gịnị Ka Anyị Na-amụta n’Aka Jizọs?
2. Mmadụ ga-aka ege anyị ntị ma ọ chọpụta na anyị ji ya kpọrọ ihe.
Na-eme Ka Jizọs
3. Metere onye ahụ ebere. Gbalịa ghọta otú obi dị ya.
-
Jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị nwere ike ịna-echegbu ya? Olee ihe nwere ike inyere ya aka, masịkwa ya?’ Ịjụ onwe gị ajụjụ ndị a ga-enyere gị aka isi n’obi gị mee ihe ga-egosi na i nweere ya obiọma.
-
Gee mmadụ ntị iji gosi na ihe gbasara ya na-emetụ gị n’obi. Ọ gwa gị ihe o chere gbasara otu ihe ma ọ bụ nsogbu o nwere, ahapụla ihe ahụ o kwuru kwuwe ihe ọzọ.
4. Meda obi gwa ya okwu, kwanyekwara ya ùgwù. Ọ bụrụ na ị na-emetere ya ebere, chọọkwa inyere ya aka, ọ ga-esi n’otú i si ekwu okwu chọpụta ya. Kpachara anya n’ihe ị na-ekwu na otú i si ekwu ya. Ekwukwala ihe nwere ike ịkpasu ya iwe.
5. Nyere ya aka. Chọpụta ohere dabara adaba ị ga-eji enyere ya aka. Imere mmadụ ihe ọma nwere ike ime ka anyị na onye ahụ kparịta ụka.