Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ỊMALITE MKPARỊTA ỤKA

IHE ỌMỤMỤ NKE 4

Dịrị Umeala n’Obi

Dịrị Umeala n’Obi

Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Dịrịnụ umeala n’obi, na-ewerekwanụ na ndị ọzọ ka unu.”​—Fil. 2:3.

Ihe Pọl Mere

1. Lee VIDIO, ma ọ bụ gị agụọ Ọrụ Ndịozi 26:2, 3. Zazie ajụjụ ndị a:

  1.    Olee otú Pọl si gosi na ọ dị umeala n’obi n’otú o si gwa Eze Agrịpa okwu?

  2.   Olee otú Pọl si mee ka Agrịpa chewe gbasara Jehova na Akwụkwọ Nsọ kama ichewe gbasara yanwa?​—I nwere ike ịgụ Ọrụ Ndịozi 26:22.

Gịnị Ka Anyị Na-amụta n’Aka Pọl?

2. Okwu anyị ga-aka amasị ndị mmadụ ma anyị kwuo ya otú gosiri na anyị dị umeala n’obi ma na-akwanyere ha ùgwù.

Na-eme Ka Pọl

3. Kwuo okwu otú ga-egosi na ị na-akwanyere onye ahụ ùgwù. Ekwula okwu otú ga-eme ka o chewe na ị ma ihe niile nakwa na o nweghị ihe yanwa ma.

4. Mee ka o doo onye ahụ anya na ọ bụ na Baịbụl ka eziokwu ị na-akụzi si. Okwu Chineke nwere ike iru ndị mmadụ n’obi. Ọ bụrụ na ihe anyị na-akụzi agbakwasị ụkwụ na Baịbụl, o nwere ike ime ka okwukwe ha sie ike.

5. Dịrị nwayọọ. Esila ọnwụ ka mmadụ kweta ihe ị na-ekwu. Anyị achọghị ka anyị na ndị mmadụ na-arụ ụka. Dịrị nwayọọ iji gosi na ị dị umeala n’obi, marakwa mgbe i kwesịrị ịhapụ onye ahụ. (Ilu 17:14; Taị. 3:2) I wetuo obi kwuo okwu, o nwere ike ime ka onye ahụ gee gị ntị mgbe ọzọ.