Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ỊMALITE MKPARỊTA ỤKA

IHE ỌMỤMỤ NKE 5

Dịrị Akọ

Dịrị Akọ

Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Ka okwu unu na-atọ ụtọ mgbe niile.”​—Kọl. 4:6.

Ihe Pọl Mere

1. Lee VIDIO, ma ọ bụ gị agụọ Ọrụ Ndịozi 17:22, 23. Zazie ajụjụ ndị a:

  1.    Olee otú obi dị Pọl mgbe ọ hụrụ na ndị Atens na-ekpere arụsị?​—I nwere ike ịgụ Ọrụ Ndịozi 17:16.

  2.   Kama ịma ndị Atens ikpe, olee otú Pọl si jiri akọ gbakwasị ụkwụ n’ihe ha kweere zie ha ozi ọma?

Gịnị Ka Anyị Na-amụta n’Aka Pọl?

2. Ndị mmadụ ga-aka ege anyị ntị ma anyị lezie anya họrọ ihe anyị ga-ekwu, otú anyị ga-esi ekwu ya, na mgbe anyị ga-ekwu ya.

Na-eme Ka Pọl

3. Họrọ okwu ga-amasị onye ahụ. Dị ka ihe atụ, ị gwawa onye na-abụghị onye chọọchị okwu, o nwere ike ịdị mkpa ka ị gbanwee otú i si agwa ya gbasara Baịbụl ma ọ bụ Jizọs.

4. Agbazila onye ahụ ngwa ngwa. Hapụ ya ka o kwuo otú ọ dị ya n’obi. O kwuo ihe dị iche n’ihe Baịbụl na-akụzi, arụkwala ya ụka. (Jems 1:19) I gee ya ntị, ị ga-aghọta ihe o kweere na ihe mere o ji kwere ya.​—Ilu 20:5.

5. O kwuo ihe dabara adaba, kweta ihe o kwuru ma jaa ya mma. O nwere ike iji obi ya niile kwere na ihe okpukpe ya na-akụzi bụ eziokwu. Buru ụzọ kwuo banyere ihe gị na ya kweere. Jirizie nwayọọ nyere ya aka ịghọta ihe Baịbụl na-akụzi.