Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ỊMALITE MKPARỊTA ỤKA

IHE ỌMỤMỤ NKE 6

Na-akata Obi

Na-akata Obi

Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Chineke nyeere anyị aka, anyị akata obi zie unu ozi ọma.”​—1 Tesa. 2:2.

Ihe Jizọs Mere

1. Lee VIDIO, ma ọ bụ gị agụọ Luk 19:1-7. Zazie ajụjụ ndị a:

  1.    Gịnị nwere ike ime ka ụfọdụ ndị na-agbara Zakịọs ọsọ?

  2.   Gịnị mere Jizọs ji zie ya ozi ọma n’agbanyeghị ya?

Gịnị Ka Anyị Na-amụta n’Aka Jizọs?

2. Anyị kwesịrị ịkata obi ka anyị nwee ike izi onye ọ bụla anyị hụrụ ozi ọma.

Na-eme Ka Jizọs

3. Tụkwasị Jehova obi. Mmụọ nsọ Chineke mere ka Jizọs nwee ike izi ozi ọma. O nwekwara ike inyere gịnwa aka. (Mat. 10:19, 20; Luk 4:18) E nwee ndị ụjọ na-atụ gị ịgwa okwu, rịọ Jehova ka o mee ka ị kata obi zie ha ozi ọma.​—Ọrụ 4:29.

4. Ekpebila na ndị mmadụ agaghị ege ntị. O nwere ike imewe anyị obi abụọ ịga zie ụfọdụ ndị ozi ọma n’ihi otú ha dị, ma hà bụ ogbenye ma hà bụ ọgaranya, ụdị ndụ ha na-ebi, ma ọ bụ okpukpe ha. Ma, cheta na:

  1.    Jehova na Jizọs na-ama ihe dị mmadụ n’obi; anyịnwa anaghị ama.

  2.   E nweghị onye Jehova na-agaghị emeliri ebere.

5. Na-akata obi ma na-akwanyere ndị mmadụ ùgwù, na-akpacharakwa anya. (Mat. 10:16) Gị na mmadụ arụla ụka. Jiri nwayọọ kwụsị mkparịta ụka ma ọ bụrụ na onye ị na-agwa okwu achọghị ige gị ntị ma ọ bụkwanụ ma i chee na ihe nwere ike ime gị n’ebe ahụ.​—Ilu 17:14.