Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

N’OGE ỌZỌ

IHE ỌMỤMỤ NKE 9

Na-enwe Ọmịiko

Na-enwe Ọmịiko

Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Soronụ ndị na-aṅụrị ọṅụ ṅụrịa ọṅụ; soronụ ndị na-ebe ákwá bee ákwá.”​—Rom 12:15.

Ihe Jizọs Mere

1. Lee VIDIO, ma ọ bụ gị agụọ Mak 6:30-34. Zazie ajụjụ ndị a:

  1.    Olee ihe mere Jizọs na ndịozi ya ji chọọ “ka ha nọrọ naanị ha”?

  2.   Gịnị mere Jizọs ji kụziere ìgwè mmadụ ahụ ihe?

Gịnị Ka Anyị Na-amụta n’Aka Jizọs?

2. Ọ bụrụ na anyị enweere ndị mmadụ ọmịiko, anyị ga-enyere ha aka, ọ bụghị naanị izi ha ozi ọma.

Na-eme Ka Jizọs

3. Na-ege ntị nke ọma. Hapụ mmadụ ka o kwuo ihe dị ya n’obi. Anarakwala ya okwu n’ọnụ. E nwee ihe na-echegbu ya, otú obi dị ya, ma ọ bụ ihe o kwuru gosiri na o kwetaghị ihe i kwuru, elegharala ya anya. Ọ bụrụ na i gee ya ntị nke ọma, ọ na-egosi na ihe ahụ ọ na-eche na-emetụ gị n’obi.

4. Chee gbasara onye ahụ nwere mmasị. N’ihi ihe gị na ya kparịtara, jụọ onwe gị, sị:

  1.    ‘Olee ihe mere o ji kwesị ịnụ nke bụ́ eziokwu?’

  2.   ‘Olee otú ịmụ Baịbụl ga-esi eme ka ndụ ya ka mma ugbu a nakwa n’ọdịnihu?’

5. Gwa ya ihe ndị ga-enyere ya aka. Ozugbo o kwere omume, gosi ya otú ịmụ Baịbụl nwere ike isi mee ka ọ mata azịza ajụjụ ndị o nwere nakwa otú ọ ga-esi abara ya uru.