Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IME KA HA BỤRỤ NDỊ NA-ESO ỤZỌ JIZỌS

IHE ỌMỤMỤ NKE 10

Kpebisie Ike Inyere Ha Aka

Kpebisie Ike Inyere Ha Aka

Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Anyị kpebisiri ike na ihe anyị ga-eme abụghị naanị izi unu ozi ọma Chineke, kama na anyị ga-enye unu onwe anyị maka na anyị hụrụ unu n’anya.”​—1 Tesa. 2:8.

Ihe Jizọs Mere

1. Lee VIDIO, ma ọ bụ gị agụọ Jọn 3:1, 2. Zazie ajụjụ ndị a:

  1.    Olee ihe i chere mere Nikọdimọs ji bịakwute Jizọs n’abalị?​—I nwere ike ịgụ Jọn 12:42, 43.

  2.   Olee otú ozi ọma ahụ Jizọs ziri Nikọdimọs n’abalị si gosi na o kpebisiri ike ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya?

Gịnị Ka Anyị Na-amụta n’Aka Jizọs?

2. Otú anyị si egosi na anyị hụrụ ndị mmadụ n’anya bụ ikpebisi ike inyere ha aka ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs.

Na-eme Ka Jizọs

3. Na-amụrụ mmadụ ihe n’oge dị ya mma nakwa n’ebe masịrị ya. E nwere ike inwe otu ụbọchị ga-akara ya mma n’izu ma ọ bụ oge ga-akara ya mma n’ụbọchị. Ahụ́ ọ̀ ga-aka eru ya ala ịmụ ihe n’ebe ọ na-arụ ọrụ, n’ụlọ ya, ma ọ bụ n’ebe ọhaneze na-anọ? O kwe omume, gbanwee ihe ụfọdụ ka i nwee ike ịmụrụ ya ihe n’oge kaara ya mma nakwa n’ebe masịrị ya.

4. Na-amụchiri ya ihe anya. Ọ bụrụ na ị gaghị anọ ya, akagbula ọmụmụ ihe unu. Kama, lee ma:

  1.   a. Ị̀ ga-enwe ike ịmụrụ ya ihe n’oge ọzọ n’izu ahụ?

  2.  b. Ị̀ ga-esili n’ekwentị ma ọ bụ n’Ịntanet mụọrọ ya ihe?

  3.  ch. Ị̀ ga-agwali onye nkwusa ọzọ ka ọ mụọrọ ya ihe?

5. Rịọ Jehova ka o mee ka ị na-ele ịmụrụ onye ahụ ihe anya otú kwesịrị ekwesị. Rịọ Jehova ka o nyere gị aka ka ike onye ahụ ghara ịgwụ gị, ọ bụrụgodị na ọ naghị amụchi ihe anya ma ọ bụ na ọ na-egbu oge ime ihe ndị ọ na-amụta na Baịbụl. (Fil. 2:13) O nwere ike ịbụ na onye ahụ ị na-amụrụ ihe nwere ọtụtụ àgwà ndị magburu onwe ha. Rịọ Jehova ka o mee ka i lekwasị anya n’àgwà ndị ahụ.