Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE NDỊ ỌZỌ A KỌWARA​—NKE A

Eziokwu Ndị Na-amasị Anyị Ịkụziri Ndị Ọzọ

Eziokwu Ndị Na-amasị Anyị Ịkụziri Ndị Ọzọ

Jizọs kwuru na ndị nwere ezi obi ga-amata eziokwu ma ha nụ ya. (Jọn 10:4, 27) N’ihi ya, anyị gwawa ndị mmadụ okwu, anyị kwesịrị ịkụziri ha eziokwu Baịbụl ndị dị mfe. Ị chọọ ịkụziri mmadụ otu eziokwu, i nwere ike ịjụ ya, sị: “Ị̀ ma na . . . ?” ma ọ bụ “Ị̀ nụtụla na . . . ?” Jirizie amaokwu Baịbụl dabara adaba kọwaara ya eziokwu ahụ. Naanị ịkụziri mmadụ otu ihe dị mfe dị na Baịbụl nwere ike ịkụnye eziokwu n’obi ya. Chineke nwekwara ike ime ka o too.​—1 Kọr. 3:6, 7.

 ỌDỊNIHU

  1. 1. Ihe ndị na-eme n’ụwa taa nakwa otú ndị mmadụ si akpa àgwà na-egosi na ihe ga-agbanwe n’oge na-adịghị anya.​—Mat. 24:3, 7, 8; Luk 21:10, 11; 2 Tim. 3:1-5.

  2. 2. O nweghị ihe ga-eme ka e bibie ụwa a.​—Ọma 104:5; Ekli. 1:4.

  3. 3. A gaghịzi na-emetọ ikuku na mmiri. Ụwa ga-abụzi paradaịs.​—Aịza. 35:1, 2; Mkpu. 11:18.

  4. 4. E nweghịzi onye ga-arịa ọrịa.​—Aịza. 33:24; 35:5, 6.

  5. 5. Ị ga-adịli ndụ ebighị ebi n’ụwa.​—Ọma 37:29; Mat. 5:5.

 EZINỤLỌ

  1. 6. Nwoke kwesịrị ‘ịhụ nwunye ya n’anya otú ọ hụrụ onwe ya.’​—Efe. 5:33; Kọl. 3:19.

  2. 7. Nwaanyị kwesịrị ịna-akwanyere di ya ezigbo ùgwù.​—Efe. 5:33; Kọl. 3:18.

  3. 8. Di na nwunye ekwesịghị ịna-agba n’èzí.​—Mal. 2:16; Mat. 19:4-6, 9; Hib. 13:4.

  4. 9. Ihe ga-agaziri ụmụaka na-asọpụrụ nne na nna ha ma na-erubere ha isi.​—Ilu 1:8, 9; Efe. 6:1-3.

NASA, ESA and the Hubble Heritage Team (STScI/AURA)-ESA/Hubble Collaboration. Licensed under CC BY 4.0. Source.

 CHINEKE

  1. 10.  Chineke nwere aha.​—Ọma 83:18; Jere. 10:10.

  2. 11.  Chineke si na Baịbụl na-agwa anyị okwu.​—2 Tim. 3:16, 17; 2 Pita 1:20, 21.

  3. 12.  Chineke anaghị emegbu mmadụ. Ọ naghị akpa ókè.​—Diut. 10:17; Ọrụ 10:34, 35.

  4. 13.  Chineke chọrọ inyere anyị aka.​—Ọma 46:1; 145:18, 19.

 EKPERE

  1. 14.  Chineke chọrọ ka anyị na-ekpe ekpere, na-akọrọ ya mkpa anyị.​—Ọma 62:8; 65:2; 1 Pita 5:7.

  2. 15.  Baịbụl na-akụziri anyị otú e si ekpe ekpere.​—Mat. 6:7-13; Luk 11:1-4.

  3. 16.  Anyị kwesịrị ịna-ekpe ekpere mgbe niile.​—Mat. 7:7, 8; 1 Tesa. 5:17.

 JIZỌS

  1. 17.  Jizọs bụ Onye Ozizi Ukwu, onye ndụmọdụ ya na-aba uru mgbe niile.​—Mat. 6:14, 15, 34; 7:12.

  2. 18.  Jizọs buru amụma na ihe ndị na-eme taa ga-eme.​—Mat. 24:3, 7, 8, 14; Luk 21:10, 11.

  3. 19.  Jizọs bụ Ọkpara Chineke.​—Mat. 16:16; Jọn 3:16; 1 Jọn 4:15.

  4. 20.  Jizọs abụghị Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile.​—Jọn 14:28; 1 Kọr. 11:3.

Based on NASA/Visible Earth imagery

 ALAEZE CHINEKE

  1. 21.  Alaeze Chineke bụ ọchịchị dị n’eluigwe.​—Dan. 2:44; 7:13, 14; Mat. 6:9, 10; Mkpu. 11:15.

  2. 22.  Alaeze Chineke ga-anọchi ọchịchị ụmụ mmadụ.​—Ọma 2:7-9; Dan. 2:44.

  3. 23.  Ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-eme ka nsogbu ụmụ mmadụ kwụsị.​—Ọma 37:10, 11; 46:9; Aịza. 65:21-23.

 ỊTA AHỤHỤ

  1. 24.  Ọ bụghị Chineke na-akpata ahụhụ anyị na-ata.​—Diut. 32:4; Jems 1:13.

  2. 25.  Ọ bụ Setan na-achị ụwa a.​—Luk 4:5, 6; 1 Jọn 5:19.

  3. 26.  Ahụhụ ị na-ata na-emetụ Chineke n’obi.​—Ọma 34:17-19; Aịza. 41:10, 13.

  4. 27.  Chineke ga-eme ka ahụhụ kwụsị n’oge na-adịghị anya.​—Aịza. 65:17; Mkpu. 21:3, 4.

 ỌNWỤ

  1. 28.  Ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla; ha anaghịkwanụ ata ahụhụ.​—Ekli. 9:5; Jọn 11:11-14.

  2. 29.  Ndị nwụrụ anwụ enweghị ike inyere anyị aka ma ọ bụ merụọ anyị ahụ́.​—Ọma 146:4; Ekli. 9:6, 10.

  3. 30.  A ga-akpọlite ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ.​—Job 14:13-15; Jọn 5:28, 29; Ọrụ 24:15.

  4. 31.  “Ọnwụ agaghịzi adị.”​—Mkpu. 21:3, 4; Aịza. 25:8.

 OKPUKPE

  1. 32.  Ọ bụghị okpukpe niile na-amasị Chineke.​—Jere. 7:11; Mat. 7:13, 14, 21-23.

  2. 33.  Chineke kpọrọ ime ihu abụọ asị.​—Aịza. 29:13; Maị. 3:11; Mak 7:6-8.

  3. 34.  E ji ezigbo ịhụnanya amata ezigbo okpukpe.​—Maị. 4:3; Jọn 13:34, 35.