Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ndị Bịara Mgbakọ Kwesịrị Ịma

Ihe Ndị Bịara Mgbakọ Kwesịrị Ịma

BAPTIZIM Ndị a ga-eme baptizim kwesịrị ịnọrọ ọdụ n’ebe e debeere ha oche tupu a malite ikwu okwu baptizim n’ụtụtụ Satọdee. Ha ga-anọ ọdụ n’oche ndị dị n’ihu ihu n’ụlọ mgbakọ, n’ebe chere ikpo okwu ihu. Onye ọ bụla n’ime ha kwesịrị iweta ákwà ọ ga-eji ehicha ahụ́ na uwe kwesịrị ekwesị ọ ga-eyi mgbe a ga-eme ya baptizim.

EBE A NA-ANARA ỌGWỤ Biko, buru n’uche na ebe a bụ naanị maka ndị e kwesịrị ilebara anya ngwa ngwa.

EBE A NA-EDEBE IHE FURU EFU Ọ bụrụ na ị hụ ihe ọ bụla furu efu, wega ya na Ngalaba A Na-edebe Ihe Furu Efu. Ọ bụrụ na o nwere ihe ọ bụla funahụrụ gị, gaa ná ngalaba a ka ị mara ma ọ̀ dị ebe ahụ. Ị hụ nwatakịrị furu efu, biko, kpọga ya ná ngalaba a. Ma, iji hụ na o nweghị onye obi ga-ekoro n’elu maka na nwatakịrị efuola, biko, lekọta ụmụ gị, hụkwa na gị na ha nọ.

INWETA OCHE Biko, na-echebara ndị ọzọ echiche. Cheta na ọ bụ naanị ndị ezinụlọ gị, ndị gị na ha ji otu ụgbọala bịa, ndị gị na ha bi, ma ọ bụkwanụ ndị ị na-amụrụ Baịbụl ka i nwere ike inwetara oche. Biko, edosala ihe n’elu oche ma ọ bụrụ na e nweghị onye ị na-enwetara oche ahụ.

MMADỤ IWEPỤTA ONWE YA Ọ bụrụ na ị chọrọ iso arụ ọrụ ndị a na-arụ ná mgbakọ a, biko, gaa na Ngalaba Na-ahụ Maka Ndị Wepụtara Onwe Ha Ịrụ Ọrụ ná Mgbakọ ka a gwa gị ebe ị ga-enye aka.

NDỊ ATENDANTỊ Ọrụ ndị atendantị bụ inyere gị aka. Biko, na-erubere ha isi ma ha gwa gị ebe ị ga-adọwa ụgbọala, ebe ị ga-esi banye n’ala mgbakọ, ebe ị ga-esi pụọ, ebe ị ga-anọ ọdụ, na ihe ndị ọzọ.

ONYINYE E mefuru nnukwu ego iji hụ na e nwere ígwè okwu, tiivi, ihe ndị e ji ese vidio, oche ga-ezu ndị bịara mgbakọ, nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ ga-eme ka mgbakọ a tọọ anyị ụtọ ma mee ka anyị nwee ike ịbịarukwu Jehova nso. Ọ bụrụ na i nye onyinye si gị n’obi, a ga-eji ya kwụọ ụgwọ ihe ndị e mefuru, jirikwa ya kwado ọrụ anyị na-arụ n’ụwa niile. E dowere igbe onyinye n’ebe niile n’ala mgbakọ a ka i nwee ike itinye onyinye gị na nke ọ bụla dị gị nso. Ma, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe gị omume, biko gaa n’Ịntanet ma si na donate.pr418.com nye onyinye gị. Obi dị anyị ezigbo ụtọ maka ihe ọ bụla i nyere. Òtù Na-achị Isi na-ekelekwa gị maka otú i si jiri onyinye gị na-akwado ihe ndị gbasara Alaeze Chineke.

Ọ bụ Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova haziri ya

© 2024 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania