Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ebe Ị Pụrụ Ịchọta Udo nke Obi?

Olee Ebe Ị Pụrụ Ịchọta Udo nke Obi?

Olee Ebe Ị Pụrụ Ịchọta Udo nke Obi?

E nwere nnukwu ọdịiche dị n’etiti oge anyị na nke Thoreau, bụ́ onye a kpọtụrụ aha n’isiokwu bu ụzọ. Otu ọdịiche pụtara ìhè bụ na ndụmọdụ ndị a na-enye taa banyere otú a pụrụ isi nwee udo nke obi karịrị akarị. Ndị ọkà mmụta n’akparamàgwà na ndị na-ede akwụkwọ enyemaka onwe onye—ọbụna ndị na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ—na-enye echiche nke ha. Ndụmọdụ ha pụrụ inyetụ aka ruo nwa oge; ma iji nweta ihe ngwọta ndị na-adịte aka, a chọrọ ihe sakwuru mbara. Nke ahụ bụ ihe ndị ahụ a kpọtụrụ aha n’isiokwu bu ụzọ chọpụtara.

A ZỤLITERE Antônio, Marcos, Gerson, Vania, na Marcelo n’ebe dịgasị iche, ha nwekwara nsogbu dịgasị iche. Ma ọ dịkarịa ala, ọ dị ihe atọ metụtachara ha. Nke mbụ, ọ dị mgbe ha bụ “ndị na-enweghị olileanya, ndị na-amaghịkwa Chineke n’ụwa.” (Ndị Efesọs 2:12) Nke abụọ, udo nke obi gụsiri ha agụụ ike. Nke atọ kwa, mgbe ha kwetasịrị iso Ndịàmà Jehova mụọ Bible ha nile chọtara udo nke obi ahụ ha na-achọ. Ka ha na-enwe ọganihu, ha bịara ghọta na Chineke nwere mmasị n’ebe ha nọ. N’ezie, dị ka Pọl gwara ndị Atens nke oge ya, Chineke “[anọghị] n’ebe dị anya n’ahụ onye ọ bụla n’ime anyị.” (Ọrụ 17:27) Iji ezi obi kwenyesie ike na nke a bụ isi ihe na-eduga n’inweta udo nke obi.

N’ihi Gịnị Ka E Ji Nwee Nnọọ Udo Dị Nta?

Bible na-ekwu ihe abụọ bụ́ isi kpatara enweghị udo n’ụwa—ma ọ bụ udo nke obi ma ọ bụ udo n’etiti ụmụ mmadụ. A kọwara nke mbụ na Jeremaịa 10:23: “Ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.” Mmadụ enweghị ma amamihe ma ikike nke ilepụ anya n’ihu iji chịa onwe ya n’enwetaghị enyemaka, enyemaka nke nanị ya bara uru n’ezie na-esitekwa n’aka Chineke. Mmadụ ndị na-adịghị achọ nduzi Chineke agaghị enweta udo na-adịgide adịgide ma ọlị. A na-ahụ ihe nke abụọ mere e ji ghara inwe udo n’okwu Jọn onyeozi: “Ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Ọ bụrụ na e nweghị nduzi Chineke, ọrụ nile nke onye ahụ a na-adịghị ahụ anya ma bụrụ onye dị nnọọ adị n’ezie—dịkwa nnọọ ike—“ajọ onye ahụ” bụ́ Setan, ga na-eme mgbe nile ka mgbalị ndị ụmụ mmadụ na-eme iji nweta udo na-akụ afọ n’ala.

N’ihi ihe abụọ a—bụ́ na ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ adịghị achọ nduzi Chineke nakwa ike Setan na-akpa n’ụwa—agbụrụ mmadụ n’ozuzu ya nọ n’ọnọdụ dị njọ. Pọl onyeozi kọwara ya nke ọma, sị: “Ihe e kere eke nile na-asụkọ udè, ime na-emekọkwa ha, ruo ugbu a.” (Ndị Rom 8:22) Ònye pụrụ ịgbagha nkọwa ahụ? Ná mba ndị bara ọgaranya nakwa ná mba ndị dara ogbenye, nsogbu ezinụlọ, mpụ, ikpe na-ezighị ezi, ndịrịta iche n’àgwà, ọnọdụ akụ̀ na ụba a na-ejighị n’aka, ịkpọasị ebo na nke agbụrụ, mmegbu, ọrịa, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ, na-anapụ ụmụ mmadụ udo nke obi.

Ebe A Ga-achọta Udo nke Obi

Mgbe Antônio, Marcos, Gerson, Vania, na Marcelo mụrụ Okwu Chineke, bụ́ Bible, ha mụtara ihe ndị gbanwere ndụ ha. Otu n’ime ihe ndị ha mụtara bụ na ọnọdụ ụwa a ga-agbanwe otu ụbọchị. Nke a abụghị nnọọ olileanya na-edoghị anya na ihe nile ga-emesị dị mma. Ọ bụ ezi obi ike nke gbanyesiri mkpọrọgwụ ike na Chineke nwere ihe o zubere imere ihe a kpọrọ mmadụ nakwa na ọbụna ugbu a, anyị pụrụ irite uru site ná nzube ahụ ma ọ bụrụ na anyị emee uche ya. Ha tinyere ihe ha mụtara site na Bible n’ọrụ ná ndụ ha, ihe kakwaara ha mma. Ha chọtara obi ụtọ na udo dị ukwuu karịa ka ha cheburu na ọ ga-ekwe mee.

Antônio adịghịzi ekere òkè ná mkpesa na esemokwu ndị ọrụ. Ọ maara na mgbanwe ndị e nwetara n’ụzọ dị otú ahụ bụ nanị ndị a kpaara ókè na ndị na-adịru nwa mgbe. Onye a bụbu onye ndú ndị ọrụ amụtawo banyere Alaeze Chineke. Ọ bụ Alaeze nke ọtụtụ nde mmadụ na-ekpe ekpere maka ya mgbe ha na-ekpeghachi Ekpere Onyenwe Anyị (ma ọ bụ, Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe) ma na-agwa Chineke, sị: “Ka alaeze gị bịa.” (Matiu 6:10a) Antônio mụtara na Alaeze Chineke bụ ezigbo ọchịchị eluigwe nke ga-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ ezi udo.

Marcos mụtara itinye ndụmọdụ amamihe nke Bible na-enye banyere alụmdi na nwunye, n’ọrụ. N’ihi ya, onye a bụbu onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị na nwunye ya ejiriwo obi ụtọ dịghachi n’otu ugbu a. Ya onwe ya kwa na-atụ anya oge, nke ga-abịa n’isi nso, mgbe Alaeze Chineke ga-eji usoro ụwa ka mma dochie usoro ụwa a dị anyaukwu, nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị jupụtara na ya. O nwere nghọta ka nnọọ mie emi banyere ahịrịokwu ahụ dị n’Ekpere Onyenwe Anyị nke na-asị: “Ka e mee uche gị n’ụwa dị ka e si eme ya n’eluigwe.” (Matiu 6:10b, NIV) Mgbe e mere uche Chineke n’ụwa, ụmụ mmadụ ga-adị ụdị ndụ ha na-adịtụbeghị mbụ.

Gịnị banyere Gerson? Ọ bụghịzi onye na-akpagharị akpagharị na onye ohi. Ndụ nke onye a bụbu nwata na-eto n’okporo ámá nweziri nzube n’ihi na ọ na-eji ume ya eme ihe n’inyere ndị ọzọ aka inweta udo nke obi. Dị ka ahụmahụ ndị a na-egosi, ịmụ Bible na itinye ihe ndị ọ na-ekwu n’ọrụ pụrụ nnọọ ịgbanwe ndụ mmadụ ịka mma.

Udo nke Obi n’Ụwa nke Nọ ná Nsogbu

Onye bụ́ isi n’akụkọ ihe mere eme n’imezu uche Chineke bụ Jisọs Kraịst, mgbe ndị mmadụ sokwa Ndịàmà Jehova na-amụ Bible, ha na-amụta ihe dị ukwuu banyere ya. N’abalị a mụrụ ya, ndị mmụọ ozi bụrụ abụ otuto nye Chineke, sị: “Otuto dịrị Chineke n’ebe kachasị ihe nile elu, udo dịkwa n’elu ụwa n’etiti mmadụ ndị ihe ha dị Ya ezi mma.” (Luk 2:14) Mgbe Jisọs tolitere, nchegbu ya bụ ime ka ndụ ndị mmadụ ka mma. Ọ ghọtara mmetụta ha ma gosipụta ọmịiko pụrụ iche n’ebe ndị na-ahụju anya na ndị ọrịa nọ. N’ụzọ kwekọkwara n’okwu ndị mmụọ ozi ahụ, o wetatụụrụ ndị dị umeala n’obi udo nke obi. Ná ngwụsị nke ozi ya, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Udo ka M hapụụrụ unu; udo nke m ka M na-enye unu: ọ bụghị dị ka ụwa na-enye ka Mụ onwe m na-enye unu. Ka obi unu ghara ịlọ mmiri, ka ọ gharakwa ịtụ ụjọ.”—Jọn 14:27.

Ọrụ Jisọs rụrụ karịrị nke onye na-akwalite ọdịmma ndị mmadụ. O ji onwe ya tụnyere onye ọzụzụ atụrụ, o jikwa ụmụazụ ya dị obi umeala tụnyere atụrụ mgbe o kwuru, sị: “Mụ onwe m bịara ka ha wee nwee ndụ, ka ha nwebigakwa ya ókè. Mụ onwe m bụ onye ọzụzụ atụrụ ọma: onye ọzụzụ atụrụ ọma na-atọgbọ ndụ ya n’ihi atụrụ ya.” (Jọn 10:10, 11) Ee, n’ụzọ dị iche n’ebe ọtụtụ ndị ndú nke oge a nọ bụ́ ndị ihe mbụ ha na-eche bụ banyere onwe ha, Jisọs tọgbọrọ ndụ ya maka atụrụ ya.

Olee otú anyị pụrụ isi rite uru site n’ihe Jisọs mere? Ọtụtụ ndị maara okwu ndị a nke ọma, bụ́: “Chineke hụrụ ụwa n’anya otú a, na O nyere ọbụna Ọkpara Ọ mụrụ nanị Ya, ka onye ọ bụla nke kwere na Ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Inwe okwukwe n’ebe Jisọs nọ chọrọ, nke mbụ, inweta ihe ọmụma banyere ya na Nna ya, bụ́ Jehova. Ihe ọmụma banyere Chineke na Jisọs Kraịst pụrụ iduga anyị n’iso Jehova Chineke na-enwe mmekọrịta chiri anya bụ́ nke ga-enyere anyị aka inwe udo nke obi.

Jisọs kwuru, sị: “Atụrụ nke m na-anụ olu m, Mụ onwe m makwaara ha, ha na-esokwa m: Mụ onwe m na-enyekwa ha ndụ ebighị ebi; ha agaghị alakwa n’iyi ma ọlị ruo mgbe ebighị ebi, ọ dịghịkwa onye ọ bụla ga-anapụ ha n’aka m.” (Jọn 10:27, 28) Lee okwu ịhụnanya na-agba ume nke a bụ! N’ezie, Jisọs kwuru ha ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga, ma ha nwere nnọọ mmetụta dị ukwuu ugbu a dị ka ha nwere n’oge ahụ. Echefula ma ọlị na Jisọs Kraịst ka dị ndụ ma na-arụ ọrụ, na-achị ugbu a dị ka Eze e mere ka ọ nọkwasị n’ocheeze nke Alaeze eluigwe Chineke. Dị nnọọ ka ọ dị mgbe ọ nọ n’elu ala ọtụtụ afọ ndị ahụ gara aga, ọ ka na-echebara ndị nwere obi umeala bụ́ ndị ọ na-agụsi agụụ ike inwe udo nke obi, echiche. Ọzọkwa, ọ ka bụ Onye Ọzụzụ Atụrụ nke atụrụ ya. Ọ bụrụ na anyị esoo ya, ọ ga-enyere anyị aka inwe udo nke obi, bụ́ nke na-agụnye iji obi ike na-atụ anya ịhụ udo zuru ezu n’ọdịnihu—nke ga-apụta na ime ihe ike, agha, na mpụ agaghịzi adị.

Ezi abamuru na-abịa site n’ịmara nakwa n’ikwere na Jehova ga-enyere anyị aka site n’aka Jisọs. Ì chetara Vania, bụ́ onye a hapụụrụ ibu ọrụ ndị dị arọ mgbe ọ ka bụ nwa agbọghọ, bụ́kwa onye chere na Chineke echezọwo ya? Ugbu a Vania maara na Chineke agbahapụbeghị ya. Ọ na-ekwu, sị: “Amụtara m na Chineke bụ onye dị adị n’ezie nke nwere àgwà ndị na-adọrọ adọrọ. Ịhụnanya ya kwaliri ya izite Ọkpara ya n’ụwa iji nye anyị ndụ. Ọ dị nnọọ mkpa ịmara nke a.”

Marcelo na-agba akaebe na mmekọrịta ya na Chineke bụ nke ezigbo ya. Onye a na-agabu nnọkọ oriri na-ekwu, sị: “Mgbe mgbe, ndị na-eto eto adịghị ama ihe ha ga-eme, ha na-emesịkwa merụọ onwe ha ahụ. Ụfọdụ na-etinye aka n’ịṅụ ọgwụ ọjọọ, dị ka m mere. Enwere m olileanya na a ga-agọzikwu ọtụtụ ndị, dị ka a gọziri m, site na ha ịmụta eziokwu banyere Chineke na Ọkpara ya.”

Site n’iji nlezianya mụọ Bible, Vania na Marcelo zụlitere okwukwe siri ike n’ebe Chineke nọ, nweekwa obi ike ná njikere ọ dị inyere ha aka ịchịkwa nsogbu ha. Ọ bụrụ na anyị emee ihe ha mere—mụọ Bible ma mee ihe ọ na-ekwu—anyị ga-achọta udo nke obi ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu, dị nnọọ ka ha chọtara. Mgbe ahụ, agbamume Pọl onyeozi nyere ga-adaba nnọọ adaba n’ọnọdụ anyị: “Unu echegbula onwe unu n’ihe ọ bụla; kama n’ihe nile ọ bụla site n’ekpere na arịrịọ, ya na ekele, meenụ ka Chineke mara ihe nile unu na-arịọ. Udo nke Chineke, nke kachasị uche nile, ga-echekwa obi unu na echiche uche unu nche n’ime Kraịst Jisọs.”—Ndị Filipaị 4:6, 7.

Ịchọta Ezi Udo Taa

Jisọs Kraịst na-eduzi ndị eziokwu na-agụ agụụ n’ụzọ nke na-eduga ná ndụ ebighị ebi na paradaịs elu ala. Ka ọ na-eduga ha n’ofufe dị ọcha nke Chineke, ha na-enwe udo yiri nke ahụ a kọwara n’ime Bible: “Ndị m ga-anọkwa n’ụlọ obibi udo, na n’ebe obibi dị iche iche kwesịrị ntụkwasị obi, na n’ebe izu ike dị iche iche dị jụụ.” (Aịsaịa 32:18) Nke ahụ bụkwa nanị obere ihe atụ nke udo ha ga-enwe n’ọdịnihu. Anyị na-agụ, sị: “Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ. Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:11, 29.

Ya mere, ànyị pụrụ inwe udo nke obi taa? Ee. Ọzọkwa, anyị pụrụ ijide n’aka na n’oge na-adịghị anya n’ọdịnihu, Chineke ga-eji udo gọzie ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi dị ka ọ na-adịtụbeghị mbụ. Gịnịzi ma ị rịọ ya n’ekpere ka o nye gị udo ya? Ọ bụrụ na i nwere nsogbu ndị na-anapụ gị udo, kpee ekpere n’ụzọ ahụ Eze Devid si kpee, sị: “Ahụhụ nile nke obi m sara mbara: mee ka m si ná mkpa m nile pụta. Hụ mweda n’ala na ọnọdụ ọjọọ m; bupụkwa mmehie m nile.” (Abụ Ọma 25:17, 18) Jide n’aka na Chineke na-ege ntị n’ekpere ndị dị otú ahụ. Ọ na-esetịpụ aka ma nye ndị nile ji obi eziokwu achọ udo, udo. A na-emesi anyị obi ike n’ụzọ ịhụnanya, sị: “Jehova dị nso ndị nile na-akpọku Ya, bụ́ ndị nile na-akpọku Ya n’eziokwu. Ihe dị ndị na-atụ egwu Ya ụtọ ka Ọ ga-eme; ọ bụkwa ntiku ha ka Ọ ga-anụ, wee zọpụta ha.”—Abụ Ọma 145:18, 19.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]

Mmadụ enweghị ma amamihe ma ikike nke ilepụ anya n’ihu iji chịa onwe ya n’enwetaghị enyemaka, enyemaka nke nanị ya bara uru n’ezie na-esitekwa n’aka Chineke

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]

Ihe ọmụma banyere Chineke na Jisọs Kraịst pụrụ iduga anyị n’iso Jehova Chineke na-enwe mmekọrịta chiri anya bụ́ nke ga-enyere anyị aka inwe udo nke obi

[Foto dị na peeji nke 7]

Ịgbaso ndụmọdụ Bible na-atụnye ụtụ n’inwe ndụ ezinụlọ nke udo