Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ego Gị Ka Ọ̀ Bụ Ndụ Gị?

Ego Gị Ka Ọ̀ Bụ Ndụ Gị?

Ego Gị Ka Ọ̀ Bụ Ndụ Gị?

Ị pụrụ ịnụwo banyere ndị ohi bụ́ ndị tụgidere onye ha jidere égbè n’ihu, ma jiri olu ike na-agwa ya, sị: “Ego gị ma ọ bụ ndụ gị!” Taa, a na-anụ okwu a a ma ama n’ọnọdụ na-ama aka bụ́ nke na-eche anyị nile ihu—karịsịa ndị nọ n’etiti anyị bụ́ ndị bi n’ala ndị bara ọgaranya. Otú ọ dị, n’oge a, ọ bụghị onye ohi na-agwa anyị ya. Kama, ọ bụ otú ọha mmadụ si eji ego na ihe ịga nke ọma n’ụzọ ihe onwunwe akpọrọ oké ihe.

IJI ihe akpọrọ ihe otú ahụ akpalitewo okwu na nchegbu ndị dị nnọọ ọhụrụ. Gịnị ka e kwesịrị imefu iji nweta ego na ihe onwunwe? Ànyị pụrụ inwe afọ ojuju n’ihe onwunwe dị obere karị? Ndị mmadụ hà na-achụ “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie” n’àjà n’ihi ịhụ ihe onwunwe n’anya? Ego ọ̀ bụ ihe e ji enweta ndụ obi ụtọ?

Ọchịchọ Gabigara Ókè Maka Ego

N’ime ọchịchọ na agụụ nile ụmụ mmadụ na-enwe—ndị ziri ezi ma ọ bụ ndị na-ezighị ezi—ịhụ ego n’anya na-afọ nke nta ka ọ nọrọ n’isi. N’adịghị ka ọchịchọ maka mmekọahụ na ihe oriri, ọchịchọ gabigara ókè maka ego pụrụ ịdịgide n’akwụsịghị akwụsị. O yighị ka ịka nká ọ na-akwụsị ya. N’ọtụtụ ọnọdụ, ime agadi pụrụ n’ezie ịmụba mmasị ma ọ bụ nchegbu mmadụ na-enwe banyere ego na ihe ọ pụrụ ịzụta.

O yiri ka anyaukwu ọ na-arịwanye elu. Dike n’otu ihe nkiri a ma ama kwuru, sị: “Anyaukwu na-adị irè. Anyaukwu amaka.” Ọ bụ ezie na ọtụtụ mmadụ na-ezo aka n’afọ ndị 1980 dị ka Ọgbọ Anyaukwu, ihe ndị mere tupu oge ahụ nakwa mgbe ọ gasịrị na-egosi na otú ụmụ mmadụ si emeghachi omume n’ebe ego dị gbanwere n’ụzọ dị nta n’afọ ndị gafeworonụ.

Ihe bụ́ ihe ọhụrụ ma eleghị anya bụ na imerime mmadụ na-ahụ ohere ndị ha ji emeju ozugbo, ọchịchọ ha nke inwetakwu ihe. O yiri ka, n’oge ka ukwuu, ihe ka ọtụtụ ná ndị bi n’ụwa na-etinye ihe ka ukwuu n’ume ọrụ ha n’imepụtakwu nakwa n’ịzụkwu ihe. Ị pụrụ ikweta na inweta ihe onwunwe na imefu ego aghọọla ihe a na-achụsosi ike—na nke a kasị echepụtakarị echepụta—ná ndụ nke oge a.

Ma nke ahụ ọ̀ na-eme ka ndị mmadụ na-enwe obi ụtọ karị? N’ịza ajụjụ ahụ, Eze Solomọn maara ihe ma baa nnọọ ọgaranya dere n’afọ 3,000 gara aga, sị: “Onye na-ahụ ego n’anya, ego agaghị eju ya afọ; ọzọ, onye na-ahụ inwe ihe bara ụba n’anya, ihe omume agaghị eju ya afọ: nke a bụkwa ihe efu.” (Eklisiastis 5:10) Ihe ọmụmụ banyere omume na ọdịdị mmadụ nke oge a na-erukwa nkwubi okwu yiri nke ahụ bụ́ nke na-akpali mmasị.

Ego na Obi Ụtọ

Otu n’ime ihe ndị kasị eju anya a chọpụtara banyere akparamàgwà mmadụ bụ na mkpakọba a na-akpakọba ego na ihe onwunwe na afọ ojuju na obi ụtọ ọ na-eweta adịchaghị aha nhata. Ihe ọtụtụ ndị na-eme nchọpụta ghọtaworo bụ na ozugbo mmadụ bara ọgaranya ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ, obi ụtọ na afọ ojuju ọ na-enwe adịghị adabere n’otú ihe onwunwe ya haruru.

N’ihi ya, ịchụso ihe onwunwe na ego n’ụzọ a na-achịkwaghị achịkwa na-eme ka ọtụtụ mmadụ na-eche, sị, ‘O yiri ka anyị na-anụ ụtọ nke ọ bụla n’ime ihe ọhụrụ ndị anyị na-azụ; ma, gịnị mere na, e mee elu mee ala, ihe ọhụrụ ndị a adịghị enyekwu anyị afọ ojuju ọ bụla?’

N’akwụkwọ ya bụ́ Happy People, onye edemede bụ́ Jonathan Freedman na-ekwu, sị: “Ozugbo ị kpatatụwara ego na-ezuru gị, ego ole i nwere adịchaghị ihe ọ bụ ma a bịa n’iweta obi ụtọ. A bịa n’etiti ndị hụrụ nke ha riri, njikọ dị n’etiti ego a na-akpata na obi ụtọ dị nnọọ nta.” Ọtụtụ ndị abịawo ghọta na ihe dị mkpa n’ezie maka obi ụtọ nke ndị mmadụ n’otu n’otu bụ ha inwe ihe onwunwe ime mmụọ, nchụso ndị nwere nzube ná ndụ, na omume ọma. Ihe ndị ọzọ dị mkpa bụ mmekọrịta nke mmadụ na ibe ya na nnwere onwe pụọ n’ihe iseokwu ma ọ bụ ihe mgbochi ndị pụrụ ime ka anyị ghara ịnụ ụtọ ihe anyị nwere.

Ọtụtụ ndị na-ahụ na isi ihe na-akpata ihe ka ọtụtụ ná nsogbu ọha ndị a na-enwe n’oge a bụ ịchọ iji ọganihu ihe onwunwe na-edozi ihe ndị bụ́ n’ezie nsogbu nke uche. Ụfọdụ ndị na-akọwa mmekọrịta mmadụ na ibe ya na-ekwu banyere ọnọdụ zuru ebe nile nke enweghị nchekwube na afọ ojuju. Ha na-ekwukwa banyere ọchịchọ na-arịwanye elu nke ndị nọ n’ógbè ndị bara ọgaranya nwere ịgakwuru ndị ọkà n’ịgwọ ọrịa ma ọ bụ ịchọ nzube nke ndụ na udo nke uche site n’aka ndị ndú ime mmụọ, òtù nzuzo, na ìgwè ndị na-azọrọ na ha na-agwọ ọrịa. Nke a na-agba akaebe banyere ọdịda ihe onwunwe dara n’ime ka ndụ nwekwuo ezi nzube.

Ike na Enweghị Ike nke Ego

N’ezie, ego nwere ike. Ọ pụrụ ịzụta ebe obibi ndị mara mma, uwe ndị mara mma, na arịa ndị na-egbuke egbuke. O nwekwara ike ịzụta ùgwù, nkwenye, ma ọ bụ ịja mma efu, ọbụna na-eme ka e nwee ndị enyi ole na ole na-adịru nwa oge, ndị dịkwa njikere imere mmadụ ihe ọma. Ma, ọ bụ ebe ahụ ka ike ego gwụrụ. Ego agaghị azụtali ihe ndị kasị dị anyị mkpa—ịhụnanya nke otu ezi enyi bụ́ mmadụ, udo nke uche, obere ahụ iru ala mgbe ọnwụ na-eche anyị ihu. Nyekwa ndị ji mmekọrịta ha na Onye Okike kpọrọ ihe, ego agaghị azụtali nnwapụta Chineke.

Eze Solomọn, bụ́ onye nwere ezi ihe nile ego pụrụ ịzụta n’oge ya, ghọtara na ịtụkwasị obi n’ihe onwunwe adịghị eduga n’inweta obi ụtọ na-adịgide adịgide. (Eklisiastis 5:12-15) Ndakpọ nke ụlọ akụ̀ ma ọ bụ ịrị elu nke ọnụ ahịa pụrụ ime ka ego fuo. Oké ifufe pụrụ ibibi ụlọ na ihe onwunwe. Ụkpụrụ inshọransị, ọ bụ ezie na ọ na-akwụtụ ụgwọ mfu ihe onwunwe, adịghị akwụ nke mmetụta uche. Ihe ndị nọchiri anya ego pụrụ ịghọ ihe na-abaghịzi uru na mberede n’ihi ndakpọ akụ̀ na ụba. Ọbụna ọrụ a na-akwụ ezigbo ego na ya pụrụ ịbịa taa laa echi.

Oleezi otú anyị pụrụ isi debe ego n’ọnọdụ ya? Òkè dị aṅaa ka ego ma ọ bụ ihe onwunwe kwesịrị ikere ná ndụ anyị? Biko nyochakwuo okwu a iji hụ otú ị pụrụ isi nweta ihe dị oké ọnụ ahịa n’ezie—“ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.”

[Foto ndị dị na peeji nke 4]

Ihe onwunwe adịghị eweta obi ụtọ na-adịgide adịgide