Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nọgidesie Ike Dị Ka Ị Na-ahụ Onye Ahụ A Na-apụghị Ịhụ Anya!

Nọgidesie Ike Dị Ka Ị Na-ahụ Onye Ahụ A Na-apụghị Ịhụ Anya!

Nọgidesie Ike Dị Ka Ị Na-ahụ Onye Ahụ A Na-apụghị Ịhụ Anya!

“[Mosis] nọgidesiri ike, dị ka ọ na-ahụ Onye ahụ Nke a na-apụghị ịhụ Ya anya.”—NDỊ HIBRU 11:27.

1. Okwu dị aṅaa dị ịrịba ama ka Jisọs kwuru banyere Chineke n’Ozizi Elu Ugwu ya?

JEHOVA bụ Chineke a na-apụghị ịhụ anya. Mgbe Mosis rịọrọ ka ọ hụ ebube Ya, Jehova zaghachiri, sị: “Ị pụghị ịhụ ihu m anya: n’ihi na mmadụ agaghị ahụ m anya, dịkwa ndụ.” (Ọpụpụ 33:20) Jọn onyeozi dekwara, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla hụworo Chineke mgbe ọ bụla.” (Jọn 1:18) Mgbe Jisọs Kraịst bụ mmadụ n’ụwa, ọbụnadị ya onwe ya apụghị ịhụ Chineke. Otú ọ dị, n’Ozizi Elu Ugwu ya, Jisọs kwuru, sị: “Ngọzi na-adịrị ndị dị ọcha n’obi: n’ihi na ndị ahụ ga-ahụ Chineke.” (Matiu 5:8) Gịnị ka Jisọs bu n’uche?

2. Gịnị mere anyị apụghị iji anya nkịtị anyị hụ Chineke?

2 Akwụkwọ Nsọ na-eme ka a mara Jehova dị ka Mmụọ a na-apụghị ịhụ anya. (Jọn 4:24; Ndị Kọlọsi 1:15; 1 Timoti 1:17) N’ihi ya, Jisọs adịghị ekwu na anyị bụ́ ụmụ mmadụ pụrụ n’ezie iji anya nkịtị anyị hụ Jehova. N’ezie, ndị Kraịst e tere mmanụ ga-ahụ Jehova Chineke n’eluigwe mgbe a kpọlitesịrị ha n’ọnwụ dị ka ndị mmụọ e kere eke. Ma, ụmụ mmadụ bụ́ ndị “dị ọcha n’obi” ma nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa ga-enwekwa ike ‘ịhụ’ Chineke. Olee otú nke a ga-esi kwe omume?

3. Olee otú ụmụ mmadụ pụrụ isi ghọta ụfọdụ n’ime àgwà Chineke?

3 Anyị na-amụta ihe banyere Jehova site n’iji nlezianya na-ekiri ihe ndị o kere. N’ụzọ dị otú a, ike ya pụrụ ịmasị anyị, a pụkwara ịkpali anyị ịnakwere ya dị ka Chineke bụ́ Onye Okike. (Ndị Hibru 11:3; Mkpughe 4:11) Pọl onyeozi dere banyere nke a, sị: “Ihe [Chineke] anya na-ahụghị site n’okike ụwa ka a na-ahụ nke ọma, ebe a na-aghọta ha site n’ihe nile e kere eke, bụ́ ike ebighị ebi Ya na ụdị Chineke Ya.” (Ndị Rom 1:20) Ya mere, okwu Jisọs banyere ịhụ Chineke na-agụnye ikike nke ịghọta ụfọdụ n’ime àgwà Jehova. Ụdị ịhụ ihe ahụ na-adabere n’ezi ihe ọmụma, a na-ejikwa “anya obi” ahụ ya n’ụzọ ime mmụọ. (Ndị Efesọs 1:18) Okwu na omume Jisọs na-ekpughekwa ihe dị ukwuu banyere Chineke. N’ihi ya, Jisọs kwuru, sị: “Onye hụworo m anya ahụwo Nna m anya.” (Jọn 14:9) Jisọs gosipụtara àgwà Jehova n’ụzọ zuru ezu. N’ihi ya, inwe ihe ọmụma banyere ndụ na ozizi Jisọs pụrụ inyere anyị aka ịhụ, ma ọ bụ ịghọta, ụfọdụ n’ime àgwà Chineke.

Iji Ihe Ime Mmụọ Akpọrọ Ihe Dị Oké Mkpa

4. Olee otú ọtụtụ ndị taa si egosipụta na ha adịghị eji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe?

4 Taa, okwukwe na ezi ọnọdụ ime mmụọ dị ụkọ n’ezie. “Ọ bụghị mmadụ nile nwere okwukwe,” ka Pọl kwuru. (2 Ndị Tesalọnaịka 3:2) Ọtụtụ mmadụ na-emikpu onwe ha kpam kpam ná nchụso nke aka ha, ha enweghịkwa okwukwe n’ebe Chineke nọ. Omume mmehie ha na ojiji ha na-adịghị eji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe na-egbochi ha iji anya nke nghọta ha ahụ ya, n’ihi na Jọn onyeozi dere, sị: “Onye na-eme ihe ọjọọ ahụghị Chineke mgbe ọ bụla.” (3 Jọn 11) Ebe ọ bụ na ndị dị otú ahụ adịghị eji anya nkịtị ahụ Chineke, ha na-eme omume dị ka a ga-asị na ọ dịghị ahụ ihe ha na-eme. (Ezikiel 9:9) Ha na-eleda ihe ime mmụọ anya, n’ihi ya, ha apụghị inweta “ihe ọmụma Chineke.” (Ilu 2:5) Ya mere, n’ụzọ dabara adaba, Pọl dere, sị: “Mmadụ nke mkpụrụ obi onwe ya na-achị adịghị anata ihe nke Mmụọ nke Chineke: n’ihi na ha bụ ihe nzuzu n’anya ya; ọ pụghịkwa ịmara ha, n’ihi na e weere Mmụọ Nsọ sikwupụta ha.”—1 Ndị Kọrint 2:14.

5. Eziokwu dị aṅaa ka ndị na-atụkwasị uche n’ihe ime mmụọ maara nke ọma?

5 Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị na-atụkwasị uche n’ihe ime mmụọ, anyị ga-amara mgbe nile na ọ bụ ezie na Jehova abụghị Chineke na-ahụchata emezighị emezi, ọ na-ama mgbe anyị ji echiche na ọchịchọ ọjọọ na-eme ihe. N’ezie, “n’ihu anya Jehova ka ụzọ nile nke mmadụ dị, okporo ụzọ ya nile ka Ọ na-eme ka ha dị larịị.” (Ilu 5:21) Ọ bụrụ na anyị adaba ná mmehie, a na-akwali anyị ichegharị ma rịọ Jehova mgbaghara n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya, anyị achọghịkwa ịkpasu ya iwe.—Abụ Ọma 78:41; 130:3.

Gịnị Na-eme Ka Anyị Na-eguzosi Ike?

6. Gịnị ka iguzosi ike pụtara?

6 Ọ bụ ezie na anyị adịghị ahụ Jehova anya, ka anyị na-echeta mgbe nile na ọ na-ahụ anyị. Ịmara na ọ dị adị na ikwenyesi ike na ọ nọ nso n’ebe ndị nile na-akpọku ya nọ ga-enye aka ime ka anyị na-eguzosi ike—na-akwụrụ chịm ma na-anọgidesi ike n’ikwesị ntụkwasị obi anyị nye ya. (Abụ Ọma 145:18) Anyị pụrụ ịdị ka Mosis, bụ́ onye Pọl dere banyere ya, sị: “Okwukwe ka o ji hapụ Ijipt, n’ihi na ọ tụghị egwu ọnụma nke eze ahụ: n’ihi na ọ nọgidesiri ike, dị ka ọ na-ahụ Onye ahụ Nke a na-apụghị ịhụ Ya anya.”—Ndị Hibru 11:27.

7, 8. N’ihi gịnị ka Mosis ji nwee obi ike n’ihu Fero?

7 N’ịrụ ọrụ Chineke nyere ya bụ́ iduru ụmụ Israel pụọ n’agbụ ndị Ijipt, Mosis pụtara mgbe mgbe n’ihu Fero dị aka ike n’obí eze nke ndị ndú okpukpe na ndị ọchịagha jupụtara. O yiri ka arụsị dị iche iche hà jupụtara n’ahụ ájá nke obí ahụ. Ma, ọ bụ ezie na a pụghị ịhụ Jehova anya, ọ bụ onye dị adị n’ezie nye Mosis, n’adịghị ka arụsị nile ahụ na-anọchite anya chi dị iche iche na-adịghị ndụ nke Ijipt. Ka a sịkwa ihe mere na Mosis atụghị Fero egwu!

8 Gịnị nyere Mosis obi ike ịpụta n’ihu Fero ugboro ugboro? Akwụkwọ Nsọ na-agwa anyị na “nwoke ahụ, bụ́ Mosis, dị umeala n’obi nke ukwuu, karịa mmadụ nile ndị nọ n’elu ala.” (Ọnụ Ọgụgụ 12:3) N’ụzọ doro anya, ojiji Mosis ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe n’ụzọ siri ike na nkwenye siri ike o nwere na Chineke nọnyeere ya nyere ya ikike dị mkpa iji nọchite anya “Onye ahụ Nke a na-apụghị ịhụ Ya anya,” n’ihu eze Ijipt dị obi ọjọọ. Olee ụfọdụ ụzọ ndị ‘na-ahụ’ Chineke a na-apụghị ịhụ anya si egosipụta okwukwe ha n’ebe ọ nọ taa?

9. Olee otu ụzọ anyị pụrụ isi nọgidesie ike?

9 Otu ụzọ isi gosipụta okwukwe ma nọgidesie ike dị ka a ga-asị na anyị na-ahụ Onye ahụ a na-apụghị ịhụ anya bụ site n’iji obi ike na-eme nkwusa n’agbanyeghị mkpagbu. Jisọs dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị, sị: “Mmadụ nile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m.” (Luk 21:17) Ọ gwakwara ha, sị: “Ohu adịghị aka onye nwe ya ukwuu. Ọ bụrụ na ha sogburu m, ha ga-esogbukwa unu.” (Jọn 15:20) N’ikwekọ n’okwu Jisọs, n’oge na-adịghị anya mgbe ọ nwụsịrị, ụmụazụ ya nwetara mkpagbu n’ụdị nke iyi egwu, njide, na ịkụ ihe. (Ọrụ 4:1-3, 18-21; 5:17, 18, 40) Ọ bụ ezie na e nwere mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ, ndị ozi Jisọs na ndị ọzọ na-eso ụzọ ya nọgidere jiri anyaike na-ekwusa ozi ọma ahụ.—Ọrụ 4:29-31.

10. Olee otú obi ike anyị nwere ná nlekọta dị nchebe nke Jehova si enyere anyị aka n’ozi?

10 Dị ka Mosis, ụmụazụ Jisọs n’oge gboo atụghị ndị iro ha dị ọtụtụ a na-ahụ anya egwu. Ndị na-eso ụzọ Jisọs nwere okwukwe n’ebe Chineke nọ, n’ihi ya kwa, ha tachiri obi ná mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ ha nwetara. Ee, ha nọgidesiri ike dị ka ha na-ahụ Onye ahụ a na-apụghị ịhụ anya. Taa, ịmara mgbe nile banyere nlekọta dị nchebe Jehova na-enye na-eme ka anyị na-enwe anyaike, na-eme ka anyị na-enwe obi ike ma ghara ịtụ egwu n’ọrụ nkwusa Alaeze anyị na-arụ. Okwu Chineke na-asị na “egwu mmadụ na-eweta ọnyà: ma onye na-atụkwasị Jehova obi, a ga-eme ka ọ nọọ n’elu.” (Ilu 29:25) N’ihi ya, anyị adịghị ala azụ n’ihi egwu nke ịbụ ndị a ga-akpagbu; ozi anyị adịghịkwa eme anyị ihere. Okwukwe anyị na-akwali anyị iji obi ike agbara ndị agbata obi anyị, ndị ọrụ ibe anyị, ụmụ akwụkwọ ibe anyị, na ndị ọzọ àmà.—Ndị Rom 1:14-16.

Onye ahụ A Na-apụghị Ịhụ Anya Na-eduzi Ndị Ya

11. Dị ka Pita na Jud si kwuo, olee otú ụfọdụ ndị so ọgbakọ ndị Kraịst na-akpakọrịta si gosipụta na ha ejighị ihe ime mmụọ kpọrọ ihe?

11 Okwukwe na-enyere anyị aka ịhụ Jehova dị ka onye na-eduzi nzukọ elu ala ya. N’ụzọ dị otú a, anyị na-ezere inwe àgwà nke ịkatọ ndị nwere ibu ọrụ n’ọgbakọ. Ma Pita onyeozi ma onye otu nne ji ya na Jisọs bụ́ Jud dọrọ aka ná ntị banyere ndị na-ejitụghị ihe ime mmụọ kpọrọ ihe nke na ha na-ekwulu ndị na-edu ndú n’etiti ndị Kraịst. (2 Pita 2:9-12; Jud 8) Ndị dị otú ahụ bụ́ ndị na-ahụchata emezighị emezi, hà gaara ekwuwo okwu n’ụzọ dị otú ahụ n’ihu Jehova ma ọ bụrụ na ha na-ahụ ya anya n’ụzọ nkịtị? Ọ dịghị ma ọlị! Ma n’ihi na a pụghị ịhụ Chineke anya, ndị ikom ahụ na-agbaso anụ ahụ atụleghị na ha ga-aza ajụjụ n’ihu ya.

12. Àgwà dị aṅaa ka anyị kwesịrị igosipụta n’ebe ndị na-edu ndú n’ọgbakọ nọ?

12 N’eziokwu, ọ bụ ụmụ mmadụ na-ezughị okè mejupụtara ọgbakọ ndị Kraịst. Ndị na-eje ozi dị ka ndị okenye na-emehie ihe bụ́ nke pụrụ imetụta anyị mgbe ụfọdụ. Otú o sina dị, Jehova na-eji ndị ikom dị otú ahụ eme ihe dị ka ndị ọzụzụ atụrụ nke ìgwè atụrụ ya. (1 Pita 5:1, 2) Ndị ikom na ndị inyom na-atụkwasị uche n’ihe ime mmụọ na-aghọta na nke a bụ otu ụzọ Jehova si eduzi ndị ya. N’ihi ya, dị ka ndị Kraịst, anyị na-ezere mmụọ nkatọ na nke mkpesa ma na-egosi nkwanye ùgwù maka ndokwa ọchịchị Chineke. Site n’irubere ndị na-edu ndú n’etiti anyị isi, anyị na-egosi na anyị na-ahụ Onye ahụ a na-apụghị ịhụ anya.—Ndị Hibru 13:17.

Ịhụ Chineke Dị Ka Onye Nkụzi Ukwu Anyị

13, 14. Gịnị ka ịhụ Jehova dị ka Onye Nkụzi Ukwu pụtara nye gị?

13 E nwere akụkụ ọzọ chọrọ nghọta ime mmụọ. Aịsaịa buru amụma, sị: “Anya gị abụọ ga na-ahụ [Onye Nkụzi Ukwu, NW] gị.” (Aịsaịa 30:20) Ọ chọrọ okwukwe iji ghọta na ọ bụ Jehova na-ezi anyị ihe site ná nzukọ elu ala ya. (Matiu 24:45-47) Ịhụ Chineke dị ka Onye Nkụzi Ukwu anyị pụtara ihe karịrị ịnọgide na-enwe usoro ọmụmụ Bible dị mma na ịgachi nzukọ ndị Kraịst anya. Ọ pụtara iji ihe Chineke na-enye n’ụzọ ime mmụọ na-eme ihe n’ụzọ zuru ezu. Dị ka ihe atụ, ọ dị anyị mkpa ịṅabiga ntị ókè ná nduzi Jehova na-enye site n’aka Jisọs ka anyị wee ghara ịkpafu n’ụzọ ime mmụọ.—Ndị Hibru 2:1.

14 Mgbe ụfọdụ ọ na-ewe mgbalị pụrụ iche iji rite uru zuru ezu site ná nri ime mmụọ. Dị ka ihe atụ, anyị pụrụ inwe àgwà nke iji ọkụ ọkụ na-agụ ihe ndekọ Bible ụfọdụ na-esiri anyị ike ịghọta. Mgbe anyị na-agụ magazin Ụlọ Nche na Teta!, ikekwe anyị na-amafe ọbụna isiokwu ụfọdụ n’ihi na ihe a na-ekwu na ya amasịchaghị anyị. Ma ọ bụ anyị pụrụ ikwe ka uche anyị na-awagharị awagharị mgbe anyị nọ ná nzukọ ndị Kraịst. Otú ọ dị, anyị pụrụ ịnọgide na-ege ntị ma ọ bụrụ na anyị ejiri nlezianya na-atụgharị uche n’isi ihe ndị a na-atụle. Ekele miri emi anyị na-enwe maka ntụziaka ime mmụọ anyị na-enweta na-egosi na anyị nakweere Jehova dị ka Onye Nkụzi Ukwu anyị.

Anyị Aghaghị Ịza Ajụjụ

15. Olee otú ụfọdụ ndị siworo mee omume ka a ga-asị na Jehova apụghị ịhụ ha?

15 Karịsịa, ebe ọ bụ na ajọ omume jupụtara ebe nile na “mgbe ọgwụgwụ” a, ọ dị oké mkpa inwe okwukwe n’ebe Onye ahụ a na-apụghị ịhụ anya nọ. (Daniel 12:4) Emeghị ihe n’eziokwu na mmekọahụ rụrụ arụ jupụtara ebe nile. N’ezie, ọ bụ ihe amamihe dị na ya icheta na Jehova na-ahụ ihe anyị na-eme ọbụna mgbe ụmụ mmadụ na-enweghị ike ịhụ anyị. Ụfọdụ echezọọla eziokwu a. Mgbe ndị ọzọ na-adịghị ahụ ha, ha pụrụ itinye aka n’omume Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị eguzogidebeghị ọnwụnwa nke ikiri ihe ntụrụndụ ndị na-emerụ ahụ na ihe na-akpali agụụ mmekọahụ n’Internet, televishọn, nakwa n’ụdị ndị ọzọ nke nkà na ụzụ nke oge a. Ebe ọ bụ na a pụrụ ime ihe ndị dị otú ahụ na nzuzo, ụfọdụ emewo omume ka a ga-asị na Jehova apụghị ịhụ omume ha.

16. Gịnị kwesịrị inyere anyị aka irube isi n’ụkpụrụ ndị dị elu nke Jehova?

16 Ọ dị mma iburu n’uche okwu Pọl onyeozi, bụ́: “Onye ọ bụla n’etiti anyị ga-aza ajụjụ banyere onwe ya nye Chineke.” (Ndị Rom 14:12) Ọ dị anyị mkpa ịmara na oge ọ bụla anyị mere mmehie, anyị na-emehie megide Jehova. Ịmara nke a kwesịrị inyere anyị aka ime ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ ya ndị dị elu na izere omume na-adịghị ọcha. Bible na-echetara anyị, sị: “Ọ dịghịkwa ihe e kere eke nke na-apụtaghị ìhè n’ihu Ya: kama ihe nile gba ọtọ bụrụkwa ihe e megheworo n’anya Ya, bụ́ Onye anyị ga-akọrọ akụkọ banyere omume anyị.” (Ndị Hibru 4:13) N’eziokwu, anyị aghaghị ịza ajụjụ n’ihu Chineke, ma n’ezie, isi ihe mere anyị ji eme uche Jehova ma na-erube isi n’ụkpụrụ ezi omume ya bụ ịhụnanya miri emi anyị nwere n’ebe ọ nọ. Ya mere, ka anyị na-eji ezi uche eme ihe n’ihe ndị dị ka nhọrọ ntụrụndụ na omume anyị n’ebe ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe anyị nọ.

17. Olee ụdị mmasị Jehova ji ekiri anyị?

17 Jehova nwere nnọọ mmasị n’ebe anyị nọ, ma nke ahụ apụtaghị na ọ na-echere ka anyị mehie ihe ka o wee nwee ike ịta anyị ahụhụ. Kama nke ahụ, ọ na-eji nchegbu ịhụnanya yiri nke nna bụ́ onye chọrọ ịkwụghachi ụmụ ya na-erube isi ụgwọ, na-ekiri anyị. Lee ka o si bụrụ ihe na-akasi obi ịmara na okwukwe anyị na-atọ Nna anyị nke eluigwe ụtọ nakwa na ọ bụ “Onye na-enyeghachi ndị na-achọ Ya ụgwọ ọrụ”! (Ndị Hibru 11:6) Ka anyị na-egosipụta okwukwe zuru ezu n’ebe Jehova nọ ma ‘were obi zuru okè na-efe Ya ofufe.’—1 Ihe E Mere 28:9.

18. Ebe ọ bụ na Jehova na-ekiri anyị ma na-arịba ikwesị ntụkwasị obi anyị ama, ihe mmesi obi ike dị aṅaa ka Akwụkwọ Nsọ na-enye anyị?

18 Ilu 15:3 na-ekwu, sị: “N’ebe nile ọ bụla ka anya abụọ nke Jehova dị, na-eche ndị ọjọọ na ndị bụ́ ezi mmadụ nche.” Ee, Chineke na-eche ndị ọjọọ nche ma na-emeso ha dị ka omume ha si dị. Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị so ná “ndị bụ́ ezi mmadụ,” anyị pụrụ ijide n’aka na Jehova na-arịba omume ikwesị ntụkwasị obi anyị ama. Lee ihe na-ewusikwu okwukwe ike ọ bụ ịmara na ‘ndọgbu anyị na-adọgbu onwe anyị n’ọrụ abụghị ihe efu n’ime Onyenwe anyị’ nakwa na onye ahụ a na-apụghị ịhụ anya agaghị ‘echezọ ọrụ anyị na ịhụnanya ahụ anyị gosiworo n’ebe aha Ya dị’!—1 Ndị Kọrint 15:58; Ndị Hibru 6:10.

Ịkpọ Jehova Ka O Nyochaa Anyị

19. Gịnị bụ ụfọdụ n’ime uru ndị a na-erite site n’inwe okwukwe siri ike n’ebe Jehova nọ?

19 Dị ka ndị ohu Jehova na-ekwesị ntụkwasị obi, anyị dị oké ọnụ ahịa nye ya. (Matiu 10:29-31) Ọ bụ ezie na a pụghị ịhụ ya anya, ọ pụrụ ịbụ onye dị adị n’ezie nye anyị, anyị pụkwara iji mmekọrịta dị oké ọnụ ahịa anyị na ya nwere kpọrọ ihe. Inwe àgwà dị otú ahụ n’ebe Nna anyị nke eluigwe nọ na-ewetara anyị ọtụtụ abamuru. Okwukwe anyị siri ike na-enyere anyị aka inwe obi dị ọcha na ezi akọ na uche n’ihu Jehova. Okwukwe nke ihu abụọ na-adịghị ya na-egbochikwa anyị ibi ụdị ndụ abụọ. (1 Timoti 1:5, 18, 19) Okwukwe na-adịghị ada ada anyị nwere n’ebe Chineke nọ bụ ezi ihe nlereanya, ọ pụkwara inwe mmetụta dị mma n’ebe ndị gbara anyị gburugburu nọ. (1 Timoti 4:12) Ọzọkwa, okwukwe dị otú ahụ na-akwalite àgwà nsọpụrụ Chineke, na-eme ka obi Jehova ṅụrịa.—Ilu 27:11.

20, 21. (a) N’ihi gịnị ka Jehova iche anyị nche ji bụrụ ihe a na-achọsi ike? (b) Olee otú anyị pụrụ isi tinye Abụ Ọma 139:23, 24 n’ọrụ n’onwe anyị?

20 Ọ bụrụ na anyị maara ihe n’ezie, anyị ga-enwe obi ụtọ na Jehova na-eche anyị nche. Ọ bụghị nanị na anyị ga-achọ ka ọ na-ahụ anyị kama anyị ga-achọkwa ka o nyochaa echiche na omume anyị nke ọma. Mgbe anyị na-ekpe ekpere, anyị ga-eme nke ọma ịkpọ Jehova ka o nyochaa anyị ma chọpụta ma anyị nwere ọchịchọ ọ bụla na-ekwesịghị ekwesị. N’ezie, ọ pụrụ inyere anyị aka ịnagide nsogbu anyị na ime mgbanwe ọ bụla dị mkpa. N’ụzọ kwesịrị ekwesị, ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid bụrụ, sị: “Gwupụta ala obi m, Chineke, wee mara obi m: na-anwa m, wee mara iche uche m nile: hụkwa ma ọ̀ dị ụzọ ọ bụla na-eweta ihe mgbu dị n’ime m, durukwa m n’ụzọ ebighị ebi.”—Abụ Ọma 139:23, 24.

21 Devid rịọrọ ka Jehova gwupụta ala obi ya iji hụ ma ọ̀ dị “ụzọ ọ bụla na-eweta ihe mgbu” dị n’ime ya. Dị ka ọbụ abụ ahụ, ọ́ dịghị agụsi anyị agụụ ike ka Chineke gwupụta ala obi anyị ma hụ ma ànyị nwere ebumnobi ndị na-ezighị ezi? Ya mere, ka anyị jiri okwukwe rịọ Jehova ka o nyochaa anyị. Ma, gịnị ma ọ bụrụ na anyị na-enwe nchegbu banyere ihe ụfọdụ anyị mehiere ma ọ bụ na e nwere ihe ọjọọ dị n’ime anyị? Mgbe ahụ, ka anyị nọgide na-ekpekusi Chineke anyị na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova, ekpere ike ma na-agbaso nduzi nke mmụọ nsọ ya na ndụmọdụ nke Okwu ya. Anyị pụrụ inwe obi ike na ọ ga-agbatara anyị ọsọ enyemaka ma nyere anyị aka ịgbaso ụzọ nke ga-eduga ná ndụ ebighị ebi.—Abụ Ọma 40:11-13.

22. Gịnị kwesịrị ịbụ mkpebi anyị banyere Onye ahụ a na-apụghị ịhụ anya?

22 Ee, Jehova ga-eji ndụ ebighị ebi gọzie anyị ma ọ bụrụ na anyị na-eme ihe ọ na-achọ. N’ezie, anyị aghaghị ịnakwere ike na ịbụisi ya, ọbụna dị ka Pọl onyeozi mere mgbe o dere, sị: “Eze nke mgbe nile, Nke a na-apụghị imebi emebi, Nke a na-apụghị ịhụ anya, Onye nanị Ya bụ Chineke, nsọpụrụ na otuto dịrị Ya ruo mgbe nile ebighị ebi. Amen.” (1 Timoti 1:17) Ka anyị na-egosipụta nsọpụrụ dị otú ahụ sitere n’obi n’ebe Jehova nọ mgbe nile. Ihe ọ sọkwara ya mee, ka anyị ghara ịda mbà ma ọlị ná mkpebi anyị ịnọgidesi ike dị ka anyị na-ahụ Onye ahụ a na-apụghị ịhụ anya.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Olee otú o si kwe omume ụmụ mmadụ ịhụ Chineke?

• Ọ bụrụ na Jehova dị adị n’ezie nye anyị, olee otú anyị ga-esi emeghachi omume mgbe a na-akpagbu anyị?

• Gịnị ka ịhụ Jehova dị ka Onye Nkụzi Ukwu anyị pụtara?

• N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịchọ ka Jehova nyochaa anyị?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 18]

Mosis, n’abụghị onye Fero menyere egwu, mere omume ka a ga-asị na ọ pụrụ ịhụ Jehova, bụ́ Chineke a na-apụghị ịhụ anya

[Foto dị na peeji nke 21]

Ka anyị ghara ime omume ma ọlị ka a ga-asị na Jehova apụghị ịhụ ihe anyị na-eme

[Foto dị na peeji nke 23]

Anyị na-achọsi ihe ọmụma Chineke ike n’ihi na anyị na-ahụ ya dị ka Onye Nkụzi Ukwu anyị