Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-enwe Ọṅụ n’Ihi Olileanya Alaeze Ahụ!

Na-enwe Ọṅụ n’Ihi Olileanya Alaeze Ahụ!

Na-enwe Ọṅụ n’Ihi Olileanya Alaeze Ahụ!

Ọ BỤ n’ihi otu ihe omume na-enye ọṅụ ka mmadụ 5,784 ji gbakọta na March 10, 2001 n’ihe owuwu atọ dị na New York State bụ́ ndị nnukwu ezinụlọ Betel ji eme ihe. Ihe omume ahụ bụ ngụsị akwụkwọ nke klas nke 110 nke ụlọ akwụkwọ ndị ozi ala ọzọ nke Gilead.

Carey Barber, onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, nabatara mmadụ nile ma meghee usoro ihe omume ahụ, na-asị: “Ọ na-enye anyị ọṅụ ịmara na a zụwo klas 110 nke ụmụ akwụkwọ Gilead ugbu a dị ka ndị ozi ala ọzọ ma kenye ha ọrụ n’ókèala dị iche iche gburugburu ụwa.”

Ụzọ Isi Nọgide Na-enwe Ọṅụ

Mgbe Nwanna Barber kwusịrị okwu mmeghe ya, Don Adams gwara ndị na-ege ntị, gụnyere ụmụ akwụkwọ 48 ahụ na-agụsị akwụkwọ, okwu n’isiokwu bụ́ “Ngọzi Jehova Na-eme Anyị Ọgaranya.” N’ikwu okwu dabeere n’Ilu 10:22, o chetaara ndị na-ege ntị na Jehova na-akwagide ma na-agọzi ndị ohu ya mgbe ha butere Alaeze ahụ ụzọ ná ndụ ha. Ọ gbara ụmụ akwụkwọ ahụ ume iji otu mmụọ afọ ofufo ahụ Pọl onyeozi gosipụtara mgbe a kpọrọ ya òkù ‘ịgabita na Masedonia iji nye aka,’ nakwere ọrụ a ga-ekenye ha. (Ọrụ 16:9) Ọ bụ ezie na Pọl nwere ihe isi ike ndị ọ ga-eche ihu, njikere ọ dị ime nkwusa n’ebe ọ bụla e zigara ya wetaara ya ọtụtụ ngọzi ndị nyere ya ọṅụ.

Ndị klas ahụ na-agụsị akwụkwọ enwesịwo ihe ọmụmụ dabeere na Bible nakwa ọzụzụ nke were ọnwa ise bụ́ nke e ji kwadebe ha maka ọrụ ozi ala ọzọ. N’agbanyeghị nke ahụ, Daniel Sydlik, onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, gbara ha ume ịnọgide na-amụ ihe. N’ikwu okwu n’isiokwu bụ́ “Bụrụnụ Ezi Ndị Na-eso Ụzọ,” ọ sịrị: “Ịbụ onye na-eso ụzọ pụtara ịnọgide na-erube isi n’okwu Jisọs. Ọ na-agụnye njikere anyị dị mgbe nile ige ntị n’okwu ya, n’ozi ya, n’ozizi ya.” O kwuru na ndị na-eso ụzọ Kraịst adịghị eme mkpebi n’egeghị ntị n’olu Onye Nwe ha; e zobere amamihe Chineke ná ndụ Kraịst. (Ndị Kọlọsi 2:3) Ọ dịghị onye n’ime anyị pụrụ ịnụ okwu Jisọs otu ugbo ma kwubie na ya maara ihe nile banyere ya, n’ihi ya, Nwanna Sydlik gbara ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ ume ka ha nọgide na-amụ ihe, na-etinye ihe ha na-amụta n’ọrụ, ma na-akụzi eziokwu nke ndị Kraịst, bụ́ nke na-eweta nnwere onwe.—Jọn 8:31, 32.

Iji nọgide na-enwe ọṅụ n’ozi Chineke, mmadụ aghaghị ịdị njikere ịnara ịdọ aka ná ntị na mgbazi. “Akụrụ Unu Hà Ga-agbazi Unu?” bụ ajụjụ onye nkụzi Gilead bụ́ Lawrence Bowen jụrụ. O gosiri na n’ime Bible, e jikọrọ akụrụ ihe atụ na echiche na mmetụta uche miri emi nke mmadụ. Ha pụrụ ịgbazi mmadụ ma ọ bụrụ na ndụmọdụ sitere n’ike mmụọ nsọ nke dị n’Okwu Chineke abamie n’ime onye ahụ. (Abụ Ọma 16:7; Jeremaịa 17:10) Ndụ ikwesị ntụkwasị obi nke mmadụ na-ebi pụrụ ọbụna imetụ Jehova n’ahụ n’ụzọ dị ukwuu. Mgbe ọkà okwu ahụ gụsịrị Ilu 23:15, 16, ọ jụrụ, sị: “Akụrụ unu hà ga-agbazi unu?” Ọ gbakwụnyere, sị: “Anyị na-ekpe ekpere ka ha na-eme otú ahụ, n’ụzọ dịkwa otú ahụ, unu ga-eme ka Jehova nwee ọṅụ kasị ukwuu. Unu ga-akpali ya inwe mmetụta kasị dị omimi. Ee, unu ga-eme ka akụrụ Chineke na-aṅụrị ọṅụ ka unu ji iguzosi ike n’ihe na-anọgidesi ike n’ọrụ ndị e kenyere unu.”

Ọ bụ Mark Noumair, bụ́ onye jere ozi ala ọzọ na Kenya tupu ọ ghọọ onye nkụzi Gilead, kwuru okwu ikpeazụ n’akụkụ a nke usoro ihe omume ahụ. Okwu ya nke isiokwu ya bụ “Ihe Anya Na-ahụ Ka Mma,” kọwara mkpa ọ dị ịzụlite inwe afọ ojuju. N’ikwekọ n’Eklisiastis 6:9, Nwanna Noumair tụrụ aro, sị: “Nakwerenụ ihe dị adị. Ọ bụ ya bụ ‘ihe anya na-ahụ.’ Kama ịdị na-arọ nrọ banyere ihe unu ga-achọ ime bụ́ nke unu na-adịghị eme, tụkwasịnụ uche n’iji ọnọdụ unu nọ na ya ugbu a na-eme ihe n’ụzọ kasị mma. Ịmụ anya arọ nrọ, inwe atụmanya ndị ezi uche na-adịghị na ha, ma ọ bụ ịnọgide na-eche banyere ihe ndị na-adịchaghị mma n’ọrụ e kenyere unu ga-eme nnọọ ka unu ghara inwe afọ ojuju.” Ee, n’agbanyeghị ebe anyị pụrụ ịnọ ma ọ bụ ọnọdụ ndị anyị pụrụ ịnọ na ha, ịzụlite afọ ojuju nke dabeere ná mmekọrịta anyị na Chineke, na-eme ka anyị na-enwe mmụọ nke ọṅụ n’ijere Onye Okike Ukwu anyị ozi.

Ahụmahụ Ndị Na-enye Ọṅụ E Nwere n’Ozi Alaeze Nakwa na Gilead

Mgbe e nyesịrị ndụmọdụ ndị ahụ bara uru site n’okwu ndị ahụ, ụmụ akwụkwọ ahụ kọrọ ụfọdụ ahụmahụ ndị ha nwere mgbe ha na-ekere òkè n’ozi ubi n’oge ihe ọmụmụ ha bụ́ nke were ọnwa ise na-aga n’ihu. Ná nduzi nke Wallace Liverance, bụ́ onye na-edeba aha n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead, ụmụ akwụkwọ ahụ na-agụsị akwụkwọ kwuru otú ha siworo mee ka a mara ha dị ka ndị ozi Chineke. (2 Ndị Kọrint 4:2) Ha enwewo ike kwuo ihe ndị metụrụ ụfọdụ ndị n’akọ na uche Chineke nyere ha. Ahụmahụ ụmụ akwụkwọ ahụ nwere gosiri otú ha si malitere ndị nwere obi eziokwu ha zutere n’okporo ámá, n’ozi ụlọ n’ụlọ, nakwa n’ebe ndị ọzọ, ọmụmụ Bible. N’oge ndị ọzọ, ndị nwere mmasị kwuru na eziokwu ahụ dị ná mbipụta ndị dabeere na Bible nke nzukọ Jehova na-ebipụta. Otu onye nwe ụlọ meghachiri omume n’ụzọ dị nnọọ mma n’otu amaokwu Bible. O so Ndịàmà Jehova na-amụ Bible ugbu a.

Mgbe nke ahụ gasịrị, Joel Adams gbara ndị gụsịrị akwụkwọ na Gilead n’afọ ndị gara aga ajụjụ ọnụ. Isiokwu ya bụ “Ya Adịla Mgbe Unu Ga-akwụsị Ịmụ Ihe, Ya Adịla Mgbe Unu Ga-akwụsị Ijere Jehova Ozi.” Ndị a gbara ajụjụ ọnụ nwere okwu ndụmọdụ ndị bịara n’ezi oge maka ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ ahụ. Ka Harry Johnson na-echeta oge ọ na-agụ akwụkwọ na klas nke 26 nke Gilead, o kwuru, sị: “A kụziiri anyị na Jehova anọwo na-edu ndị ya mgbe nile nakwa na ọ ga na-edu ndị ya. Obi ike ahụ abụrụwo ihe agbamume kemgbe ọtụtụ afọ.” William Nonkes, bụ́ onye so na klas nke 53 nke Gilead, nyere ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ ndụmọdụ, sị: “Nke kasị mkpa, na-eburunụ ụkpụrụ Bible n’uche, ma jirinụ ha na-eme mkpebi ọ bụla unu na-eme ná ndụ ugbu a nakwa ruo mgbe ebighị ebi. Site n’ime otú a, unu ga-enwe ike ịnọgide na-arụ ọrụ e kenyere unu, ngọzi Jehova ga-adịkwasịkwa unu.”

“Ndị E Wusiri Ike Imezu Uche Jehova” bụ isiokwu Richard Rian họọrọ ikwu n’usoro ihe omume ahụ. Otu n’ime ndị ọ gbara ajụjụ ọnụ bụ John Kurtz, nke gụsịrị akwụkwọ na klas nke 30, bụ́ onye jere ozi ala ọzọ na Spain ruo ihe karịrị afọ 41. Mgbe a jụrụ Nwanna Kurtz banyere usoro ihe ọmụmụ nke Gilead, o kwuru, sị: “Akwụkwọ ọgụgụ bụ́ isi bụ Bible. Mgbe ahụkwa, anyị nwere ihe ndị e ji amụ Bible inyere anyị aka ịghọta Bible. Mmadụ nile nwere ha. O nweghị ihe ọmụma nzuzo a na-akụzi na Gilead. Akwụsịbeghị m ikwusi nke a ike n’ihi na onye ọ bụla nwere ihe ọmụma a na-akụzi na Gilead n’ebe aka ya ga-eru ngwa ngwa.”

Nwanna Gerrit Lösch, onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, mechiri usoro ihe omume ime mmụọ ahụ site n’ikwu okwu n’isiokwu bụ́ “N’ime na n’Okpuru Nku Jehova.” Ọ kọwara otú e si jiri nku ugo, bụ́ nke a kọwara na Bible, gosi otú Chineke si echebe ma na-akwado ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi. (Deuterọnọmi 32:11, 12; Abụ Ọma 91:4) Ugo nke kataworo ahụ na-agbasa nku ya mgbe ụfọdụ ruo ọtụtụ awa iji chebe ụmụ ya. Mgbe ụfọdụ, nne ugo pụrụ ọbụna iji nku ya kpuchie ụmụ ya iji chebe ha pụọ n’ikuku na-atụ oyi. N’ụzọ yiri nke ahụ nakwa n’ikwekọ ná nzube ya, Jehova pụrụ inyere ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi aka, karịsịa mgbe ha na-eche ule ime mmụọ dị iche iche ihu. Jehova anaghị ekwe ka a nwaa ndị ohu ya karịa ka ha pụrụ ịnagide, kama ọ na-emere ha ụzọ mgbapụ ka ha wee nwee ike ịnagide ya. (1 Ndị Kọrint 10:13) Nwanna Lösch mechiri okwu ya site n’ikwu, sị: “Iji nọgide na-abụ ndị e chebere n’ụzọ ime mmụọ, anyị aghaghị ịnọgide n’okpuru nku Jehova. Nke a pụtara na anyị agaghị azụlite mmụọ nke ime ihe masịrị anyị. Ka anyị na-anọ Jehova na nzukọ ya yiri nne nso, ghara ikewapụ onwe anyị ná nduzi na ndụmọdụ ịhụnanya ha.”

Onyeisi oche gụpụtara telegram na ozi ekele ndị sitere n’aka ndị na-echere ha echiche ọma gburugburu ụwa. Mgbe e mesịrị, e nyere ha diplọma. Mgbe e guzobere Ụlọ Akwụkwọ Gilead, e bu n’uche inwe nanị ọnụ ọgụgụ klas dị nta n’ihe karịrị afọ ise. Ma ruo afọ 58, Jehova Chineke emewo ka ụlọ akwụkwọ ahụ nọgide na-aga n’ihu. Dị ka Nwanna Barber kwuru n’okwu mmeghe ya, sị: “Lee nnọọ ihe magburu onwe ya nke ndị gụsịrị akwụkwọ na Gilead rụzuworo kemgbe a malitere Gilead na 1943! Mgbalị ha nile emewo ka a tụkwasị n’ụzọ nkịtị, ọtụtụ puku ndị dị umeala n’obi bi n’ụwa ná nzukọ dị ebube nke Jehova.” Ee, ụlọ akwụkwọ ozi ala ọzọ a enyewo aka n’ime ka ọtụtụ nde mmadụ na-enwe ọṅụ n’ihi olileanya Alaeze ahụ.

[Igbe dị na peeji nke 24]

IHE BANYERE KLAS AHỤ

Ọnụ ọgụgụ mba ha si bịa: 8

Ọnụ ọgụgụ mba e zigara ha: 18

Ọnụ ọgụgụ ụmụ akwụkwọ: 48

Nkezi afọ ndụ: 34

Nkezi afọ ha nọworo n’eziokwu: 18

Nkezi afọ ha nọworo n’ozi oge nile: 13

[Foto dị na peeji nke 25]

Klas nke 110 Na-agụsị Akwụkwọ nke Watchtower Bible School of Gilead

Ná ndepụta dị n’okpuru, e nyere ahịrị ndị ahụ nọmba site n’ihu gaa n’azụ, e depụtakwara aha ha site n’aka ekpe gaa n’aka nri n’ahịrị nke ọ bụla.

(1) Vacek, E.; Madelin, L.; Evans, G.; Watanabe, K. (2) Trafford, P.; Turfa, J.; Wilson, P.; Williams, R.; Weber, A. (3) Johnson, T.; Hanau, K.; Mourlhou, F.; Charpentier, F.; Peckham, R.; Androsoff, P. (4) Seegers, T.; Seegers, D.; Bailey, P.; Bailey, M.; Madelin, K.; Lippold, E.; Lippold, T. (5) Evans, N.; Gold, R.; Bollmann, I.; Vacek, R.; Oundjian, J.; Wilson, N. (6) Turfa, J.; Zuidema, L.; Zuidema, R.; Bengtsson, C.; Bengtsson, J.; Galano, M.; Galano, L. (7) Peckham, T.; Mourlhou, J.; Charpentier, C.; Gold, M.; Bollmann, R.; Oundjian, F. (8) Weber, R.; Johnson, B.; Hanau, D.; Watanabe, Y.; Williams, R.; Trafford, G.; Androsoff, T.